Abụ Ọma 13:1-6
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid.
13 Jehova, ruo ole mgbe ka ị ga-echefu m? Ọ̀ bụ ruo mgbe ebighị ebi?
Olee mgbe ị ga-akwụsị izoro m ihu gị?+
2 Olee mgbe m* ga-akwụsị ichegbu onwe m,Kwụsịkwa iru uju kwa ụbọchị?
Olee mgbe onye iro m ga-akwụsị imeri m?+
3 Jehova Chineke m, biko, lee m anya za m.
Mee ka anya m hụ ụzọ, ka m wee ghara ịnwụ,*
4 Ka onye iro m ghara ịsị: “Emeriela m ya.”
Ekwela ka ndị iro m ṅụrịa ọṅụ maka na m dara.+
5 M tụkwasịrị ịhụnanya gị* obi.+
Obi ga-atọ m ụtọ maka na ị na-azọpụta m.+
6 M ga-abụku Jehova abụ n’ihi na o jirila ọtụtụ ihe ọma kwụọ m ụgwọ.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
^ Na Hibru, “ihi ụra ọnwụ.”
^ Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”