Abụ Ọma 130:1-8
Abụ Mgbago.
130 Jehova, m nọ ná nnukwu nsogbu* na-akpọ gị.+
2 Jehova, biko, nụrụ olu m.
Nụrụ arịrịọ m na-arịọ gị ka i nyere m aka.
3 Jaa,* a sị na ọ bụ mmehie ka ị na-ele,*Jehova, ònye ka ikpe na-agaghị ama?+
4 N’ihi na ị na-agbaghara ndị mmadụ mmehie ha n’eziokwu,+Ka e wee na-akwanyere gị ùgwù.*+
5 M nwere olileanya n’ebe Jehova nọ. M* nwere olileanya n’ebe ọ nọ.
M tụkwasịrị okwu ya obi.
6 M* na-echeresi Jehova ike+Karịa otú ndị nche si eche ka chi bọọ,+Karịa otú ndị nche si atụsi anya ike ka chi bọọ.
7 Ka ndị Izrel na-echere JehovaN’ihi na Jehova anaghị ahapụ ndị ọ hụrụ n’anya,+O nwekwara nnukwu ike ọ ga-eji gbapụta ha.
8 Ọ ga-agbaghara ndị Izrel mmehie ha niile.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “n’ala ala mmiri.”
^ “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
^ Ma ọ bụ “na-agụkọ.”
^ Na Hibru, “na-atụ egwu gị.”
^ Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi m.”
^ Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi m.”