Abụ Ọma 139:1-24

  • Chineke ma ndị ohu ya nke ọma

    • E nweghị ebe mmadụ ga-aga mmụọ Chineke na-agaghị eru (7)

    • “Otú i si kee m dị ebube” (14)

    • ‘Ị hụrụ m mgbe m na-akabeghị aka’ (16)

    • “Na-edu m n’ụzọ ndụ ebighị ebi” (24)

Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid. 139  Jehova, i nyochaala m, ị makwa m.+   Ị ma mgbe m nọ ọdụ na mgbe m biliri ọtọ.+ Ị na-anọ n’ebe dị anya mara ihe m na-eche.+   Ị na-eleru m anya mgbe m na-aga njem na mgbe m dina ala. Ị makwa ihe niile m na-eme.+   Jehova, tupu mụ ekwuo ihe ọ bụla,Ị ma ihe niile m chọrọ ikwu.+   Ị nọ m n’ihu nakwa n’azụ na-echebe m. I jidekwara m aka.   Enweghị m ike ịghọta ihe niile ị ma gbasara m. Ha karịrị m.+   Olee ebe m ga-agbaga mmụọ nsọ gị na-agaghị eru,Oleekwa ebe m ga-agbaga ka ị ghara ịhụ m?+   Ọ bụrụ na mụ agbagoo n’eluigwe, ị ga-anọ n’ebe ahụ,Ọ bụrụkwa na mụ eburu àkwà* m banye n’ili,* ị ga-anọ n’ebe ahụ.+   A sị na m ga-epu nku ma fefee na mbara igwe ngwa ngwa otú ìhè si apụta ma chi bọwa,Ka m gaa biri n’akụkụ oké osimiri nke kacha dị anya, 10  Ị ka ga-eji aka gị na-edu m n’ebe ahụ,Ị ga-ejikwa aka nri gị jide m aka.+ 11  Ọ bụrụ na mụ asị: “N’eziokwu, ọchịchịrị ga-ekpuchi m ka a ghara ịhụ m.” Ìhè ga-agbazi m gburugburu n’abalị. 12  Ọchịchịrị agaghịdị agbara gị ọchịchịrị,Kama abalị ga na-enwu gbaa ka ehihie.+ Ọchịchịrị na ìhè bụụrụ gị otu ihe.+ 13  Ọ bụ gị kere akụrụ m. I ji ihe kpuchie m n’afọ nne m.+ 14  M na-eto gị n’ihi na otú i si kee m dị ebube,+ ọ na-emekwa ka m na-atụ egwu gị. Ọrụ gị niile dị ịtụnanya.+ O doro m nnọọ anya. 15  Ị hụrụ ọkpụkpụ m niileMgbe i kere m na nzuzo,Mgbe m nọ na-eto n’afọ nne m.*+ 16  Ị hụdịrị m mgbe m na-akabeghị aka n’afọ nne m. E dere ihe niile dị m n’ahụ́ n’akwụkwọ gị. E dedịrị mgbe e kere haTupu nke ọ bụla n’ime ha adịrị. 17  Ihe ndị ị na-eche n’echiche pụrụ nnọọ iche n’anya m.+ Chineke, ha dị nnọọ ọtụtụ.+ 18  M gbalịa ka m gụọ ha ọnụ, m na-ahụ na ha dị ọtụtụ karịa ájá.+ M teta, m ka ga na-agụ ha ọnụ.*+ 19  Chineke, a sị nnọọ na ị ga-egbu ndị ajọ omume,+Ndị na-egbu mmadụ* ga-esi n’ebe m nọ pụọ, 20  Ya bụ, ndị ji obi ọjọọ na-ekwutọ gị. Ha bụ ndị iro gị, ndị ji aha gị eme ihe efu.+ 21  Jehova, ọ̀ bụ na mụ akpọghị ndị kpọrọ gị asị asị,+Na-asọkwa ndị na-enupụrụ gị isi oyi?+ 22  M kpọrọ ha nnọọ asị.+ Ha bụzi ezigbo ndị iro m. 23  Chineke, biko, nyochaa m, ka ị mara ihe dị m n’obi.+ Nyochaa m, ka ị mara ihe na-echegbu m.+ 24  Lee ma è nwere ihe dị njọ dị m n’obi,+Ka i wee na-edu m+ n’ụzọ ndụ ebighị ebi.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ihe ndina.”
Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “Mgbe ị kpara m n’ala ala ụwa.”
Na Hibru, “mụ na gị ka nọkwa.”
Ma ọ bụ “Ndị ikpe ọbara mara.”