Abụ Ọma 142:1-7

  • Ekpere ọbụ abụ kpere ka a napụta ya

    • “E nweghị ebe m ga-agbaga” (4)

    • “Naanị gị ka m nwere” (5)

Maskil.* Ekpere Devid kpere mgbe ọ nọ n’ọgba.+ 142  M kpọkuru Jehova ka o nyere m aka.+ M rịọrọ Jehova ka o meere m amara.   M gwara ya ihe niile na-echegbu m. M kọọrọ ya nsogbu m niile+   Mgbe obi dara m mbà. N’oge ahụ, ị na-eleru ụzọ m si aga anya.+ Ha siiri m ọnyàN’ụzọ m si agafe.   Lee anya n’aka nri m ka ị hụNa e nweghị onye na-eche banyere m.+ E nweghị ebe m ga-agbaga.+ E nweghị onye chọrọ ịma banyere m.   Jehova, m na-akpọku gị ka i nyere m aka. M sịrị: “Ị bụ ebe mgbaba m.+ Naanị gị ka m nwere.”*   Ṅaa ntị n’ákwá m na-ebe ka i nyere m aka,N’ihi na m nọ ná nnukwu nsogbu. Napụta m n’aka ndị na-akpagbu m,+N’ihi na ha ka m ike.   Kpọpụta m* n’ụlọ mkpọrọ,Ka m wee too aha gị. Ka ndị ezi omume zukọta gbaa m gburugburuN’ihi na ị na-emeso m ihe otú dị mma.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Naanị gị bụ òkè m n’ala ndị dị ndụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”