Abụ Ọma 144:1-15

  • Ekpere ọbụ abụ kpere ka o merie

    • ‘Gịnị ka mmadụ efu bụ?’ (3)

    • ‘Mee ka ndị iro gbasasịa’ (6)

    • Ndị Jehova na-enwe obi ụtọ (15)

Abụ Devid. 144  Ka e too Jehova bụ́ Oké Nkume m,+Onye na-akụziri m otú e si alụ ọgụ,Na-akwadebekwa m maka ịlụ agha.+   Ọ hụrụ m n’anya, ọ bụkwa ebe m a rụsiri ike. Ọ bụ ebe m na-agbaba aka aghara ịkpa m nakwa onye na-anapụta m. Ọ bụ ọta m nakwa Onye m gbabara n’ime ya,+Onye na-emeriri m ndị mmadụ.+   Jehova, gịnị ka mmadụ bụ nke mere i ji na-eche banyere ya? Gịnịkwa ka nwa nke mmadụ efu bụ nke mere i ji na-elebara ya anya?+   Mmadụ yiri ume e kupụrụ ekupụ.+ Ndụ ya dị ka onyinyo na-apụ apụ.+   Jehova, biko, bịada eluigwe gị ka ị gbadata.+ Metụ ugwu aka ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ.+   Mee ka àmụ̀mà gbuo ka ndị iro gbasasịa.+ Gbapụ akụ́ gị ka i tinye ha n’ọgba aghara.+   Si n’eluigwe matịa aka gị. Zọpụta m ma dọpụta m ná mmiri na-ekwo ekwo,Napụtakwa m n’aka ndị mba ọzọ,+   Bụ́ ndị ụgha juru ọnụ,Ndị na-eweli aka nri ha ṅụọ iyi ụgha.   Chineke, m ga-abụku gị abụ ọhụrụ.+ M ga-eji ụbọ nwere akwara iri bụkuo gị abụ otuto, 10  Gị Onye na-eme ka ndị eze merie,*+Onye na-anapụta Devid ohu ya ka ndị mmadụ ghara iji mma agha gbuo ya.+ 11  Zọpụta m ma napụta m n’aka ndị mba ọzọ,Bụ́ ndị ụgha juru ọnụ,Ndị na-eweli aka nri ha ṅụọ iyi ụgha. 12  Mgbe ahụ, ụmụ anyị ndị nwoke ga-adị ka obere osisi ndị na-eto ngwa ngwa,Ụmụ anyị ndị nwaanyị adịkwa ka ogidi ndị e ji chọọ obí eze mma. 13  Ihe dị iche iche ala anyị na-emepụta ga-eju n’ebe anyị na-akwasa ihe. Ìgwè ewu na atụrụ anyị ga na-amụba okpukpu puku kwuru puku nakwa iri puku kwuru iri puku. 14  Ehi anyị ndị dị ime agaghị enwe nsogbu ọ bụla, ime agaghịkwa apụ ha. E nweghị onye ga na-ebe ákwá n’ámá anyị n’ihi ahụhụ. 15  Ndị ihe dịịrị otú a na-enwe obi ụtọ. Ndị Jehova bụ Chi ha na-enwe obi ụtọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Onye na-azọpụta ndị eze.”