Abụ Ọma 145:1-21

  • E toro Chineke bụ́ Eze ukwu

    • ‘M ga-akọsa na Chineke bụ onye ukwu’ (6)

    • ‘Jehova na-emere ihe niile o kere ihe ọma’ (9)

    • ‘Ndị na-erubere gị isi ga-eto gị’ (10)

    • Ọchịchị Chineke na-adịru ebighị ebi (13)

    • Chineke na-enyeju ihe ọ bụla afọ (16)

Abụ otuto Devid bụrụ. א [Alef] 145  Chineke m bụ́ Eze, m ga-eto gị.+ M ga-eto aha gị ruo mgbe niile ebighị ebi.+ ב [Bet]   M ga-eto gị malite n’ụtụtụ ruo n’abalị.+ M ga-eto aha gị ruo mgbe niile ebighị ebi.+ ג [Gimel]   Jehova bụ onye ukwu, onye ọ bụla kwesịkwara ịna-eto ya.+ E nweghị ike ịghọta* otú ọ dịruru ukwuu.+ ד [Dalet]   Ọgbọ niile ga-aja ọrụ gị niile mma. Ha ga-akọ banyere nnukwu ọrụ ndị ị na-arụ.+ ה [Hee]   Ha ga-ekwu banyere otú i si dị ukwuu ma dị ebube,+M ga-echebakwara ọrụ ndị dị ebube ị na-arụ echiche. ו [Wọọ]   Ha ga-ekwu banyere ihe ndị dị egwu ị na-eme,*M ga-akọsakwa na ị bụ onye ukwu. ז [Zayin]   Ha ga-eto gị mgbe ha na-echeta ọtụtụ ihe ọma ndị ị na-eme,+Ha ga-etikwa mkpu ọṅụ maka na ị bụ onye ezi omume.+ ח [Het]   Jehova nwere ọmịiko* ma na-eme ebere.+ Ọ naghị ewe iwe ọsọ ọsọ, ịhụnanya ya dịkwa ukwuu.+ ט [Tet]   Jehova na-emere ihe niile o kere eke ihe ọma,+Ọrụ ya niile na-egosikwa na ọ na-eme ebere. י [Yod] 10  Jehova, ọrụ gị niile ga-eto gị,+Ndị na-erubere gị isi ga-etokwa gị.+ כ [Kaf] 11  Ha ga-akọsa otú ọchịchị gị si dị ebube,+Ha ga-akọsakwa otú i si dị ike,+ ל [Lamed] 12  Ka ha wee mee ka ndị mmadụ mara nnukwu ọrụ ndị ị na-arụ+Nakwa otú ọchịchị gị si dị ukwuu ma dị ebube.+ מ [Mem]  13  Ọchịchị gị bụ ọchịchị na-adịru mgbe ebighị ebi,Alaeze gị na-adịrukwa ọgbọ niile.+ ס [Samek] 14  Jehova na-enyere ndị niile na-ada ada aka,+Ọ na-ekulitekwa ndị niile ike gwụrụ.+ ע [Ayin] 15  Ihe niile i kere eke na-ele gị anya ka i nyere ha aka,Ị na-enyekwa ha nri ha n’oge kwesịrị ekwesị.+ פ [Pee] 16  Ị na-asaghe aka gị,Were ihe na-agụ ihe ọ bụla dị ndụ nyejuo ya afọ.+ צ [Sadee] 17  Ihe niile Jehova na-eme na-egosi na ọ bụ onye ezi omume,+Ihe niile ọ na-eme na-egosikwa na ọ bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.+ ק [Kof] 18  Jehova nọ ndị niile na-akpọku ya nso,+Bụ́ ndị niile ji obi ha niile na-akpọku ya.*+ ר [Resh] 19  Ọ na-emere ndị na-atụ egwu ya ihe na-agụ ha.+ Ọ na-anụ ákwá ha na-ebe ka o nyere ha aka, ọ na-anapụtakwa ha.+ ש [Shin] 20  Jehova na-eche ndị niile hụrụ ya n’anya nche,+Ma ọ ga-ala ndị ajọ omume niile n’iyi.+ ת [Tọọ] 21  M ga-eji ọnụ m na-eto Jehova.+ Ka ihe niile dị ndụ* too aha nsọ ya ruo mgbe niile ebighị ebi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ịchọpụta.”
Ma ọ bụ “ike gị dị egwu.”
Ma ọ bụ “na-eme amara.”
Ma ọ bụ “na-akpọku ya n’eziokwu.”
Na Hibru, “anụ ahụ́ niile.”