Abụ Ọma 147:1-20

  • E toro Chineke maka ọrụ ọma ndị ọ na-arụ

    • Ọ na-akasi ndị obi gbawara obi (3)

    • Ọ na-akpọ kpakpando niile aha (4)

    • Ọ na-eme ka snoo kpuchie ụwa ka ákwà (16)

147  Toonụ Jaa!* Ọ dị mma ịbụku Chineke anyị abụ otuto. Ọ dị nnọọ mma ito ya, ọ bụkwa ihe kwesịrị ekwesị.+   Jehova na-arụ Jeruselem.+ Ọ na-akpọlata ndị Izrel a dọọrọ n’agha.+   Ọ na-akasi ndị obi gbawara obi. Ọ na-ekechi ọnyá ha.   Ọ na-agụ kpakpando ọnụ. Ọ na-akpọ ha niile aha.+   Onyenwe anyị bụ onye ukwu, ike ya dịkwa ukwuu.+ E nweghị ike ịtụ otú ọ na-aghọtaru ihe atụ̀.+   Jehova na-ekulite ndị dị umeala n’obi,+Ma ọ na-akwatu ndị ajọ omume n’ala.   Bụkuonụ Jehova abụ iji kelee ya. Jirinụ ụbọ akwara bụkuo Chineke anyị abụ otuto,   Onye ji ígwé ojii kpuchie eluigwe,Onye na-eme ka mmiri zooro ụwa,+Onye na-eme ka ahịhịa ndụ puo+ n’ugwu dị iche iche.   Ọ na-enye anụmanụ ihe ha ga-eri,+Na-enye ụmụ ugoloọma na-ebe ubé ihe ha ga-eri.+ 10  Ihe na-amasị ya abụghị otú ịnyịnya si akpa ike+Ma ọ bụ otú ụkwụ mmadụ si sie ike.+ 11  Kama, Jehova na-enwe mmasị n’ebe ndị na-atụ egwu ya nọ,+N’ebe ndị na-atụ anya ịhụnanya ya nọ.+ 12  Jeruselem, jaa Jehova mma. Zayọn, too Chineke gị. 13  Ọ na-eme ka ihe e ji atụchi ọnụ ụzọ ámá obodo gị sie ike. Ọ na-agọzi ụmụ gị. 14  Ọ na-eme ka udo dị n’ala gị.+ Ọ na-eji ọka wit kacha mma enyeju gị afọ.+ 15  Ọ na-enye ụwa iwu. Okwu ya na-eru ebe o dunyere ya ngwa ngwa. 16  Ọ na-eme ka snoo kpuchie ụwa ka à ga-asị na ọ bụ ákwà e ji ajị anụ kpaa.+ Ọ na-aghasasị mkpụrụ mmiri ka à ga-asị na ọ bụ ntụ.+ 17  Ọ na-atụdasị akụ́ mmiri ígwé ka à ga-asị na ọ bụ iberibe achịcha.+ Ònye ga-edili oyi ya?+ 18  Ọ na-enye iwu, ha agbazee. Ọ na-eme ka ifufe fee,+ mmiri asọwa. 19  Ọ na-eme ka Jekọb mara okwu ya,Ọ na-agwa Izrel ntụziaka ya na ihe ndị o kpebiri.+ 20  E nweghị mba ọ bụla ọzọ o meere otú a.+ E nweghị ihe ha ma gbasara ihe ndị o kpebiri. Toonụ Jaa!*+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.