Abụ Ọma 18:1-50

  • Devid toro Chineke maka na ọ zọpụtara ya

    • “Jehova bụ nkume m dị elu” (2)

    • Jehova anaghị ahapụ onye jisiri ya aka ike (25)

    • Ihe Chineke na-eme zuru okè (30)(30)

    • “Otú i si dị umeala n’obi na-eme ka m bụrụ nnukwu mmadụ” (35)

Maka onye na-eduzi abụ. Abụ ohu Jehova bụ́ Devid bụkuru Jehova. Ọ bụrụ abụ a n’ụbọchị Jehova napụtara ya n’aka ndị iro ya niile nakwa n’aka Sọl. Ọ sịrị:+ 18  Jehova, m hụrụ gị n’anya. Ị bụ ike m.+   Jehova bụ nkume m dị elu na ebe m a rụsiri ike na Onye na-anapụta m.+ Chineke m bụ oké nkume m.+ M na-agbaba n’ime ya. Ọ bụ ọta m na mpi* nke na-azọpụta m.* Ọ bụ ebe m na-agbaba, aka aghara ịkpa m.+   M na-akpọku Jehova, onye e kwesịrị ịna-eto. Ọ ga-anapụta m n’aka ndị iro m.+   Ọnwụ kere m ụdọ gburugburu.+ Ndị na-abaghị uru, bụ́ ndị yiri nnukwu idei mmiri, menyere m ụjọ.+   Ili* kere m ụdọ gburugburu. Ọnwụ siri ọnyà n’ihu m.+   N’oge m na-ata ahụhụ, m kpọrọ Jehova ka o nyere m aka,M nọ na-ebesara Chineke m ákwá ka o nyere m aka. Ọ nọ n’ụlọ nsọ ya nụ olu m,+Ọ nụkwara ákwá m na-ebesara ya ka o nyere m aka.+   Ụwa wee malite ịṅagharị na ịma jijiji.+ Ntọala ugwu dị iche iche mara jijiji,Ṅagharịakwa n’ihi na a kpasuola Chineke iwe.+   Anwụrụ ọkụ si n’imi ya kwụgoo elu,Nnukwu ọkụ sikwa n’ọnụ ya na-apụta.+ Icheku ọkụ na-eke ọkụ n’ihu ya.   Ọ bịadara eluigwe mgbe ọ na-agbadata,+Oké ọchịchịrị dịkwa n’okpuru ụkwụ ya.+ 10  Ọ nọ n’elu cherob, fere efe bịa.+ Ọ nọ n’elu nku otu mmụọ ozi, fere ọsọ fedata.+ 11  O jizi ọchịchịrị kpuchie onwe ya,+Jirikwa mmiri rujuru n’ígwéKpuchie onwe ya otú ụlọikwuu si ekpuchi mmadụ.+ 12  Akụ́ mmiri ígwé na icheku ọkụSi n’ìhè nke na-enwu n’ihu ya na-adapụtasị n’ígwé ojii. 13  Jehova wee nọrọ n’eluigwe malite ibigbọ.+ Onye Kacha Elu mere ka a nụ olu ya,+Akụ́ mmiri ígwé na icheku ọkụ ana-adasịkwa. 14  Ọ gbapụrụ akụ́ ya wee chụsasịa ndị iro ya.+ O mekwara ka àmụ̀mà gbuo, ha agharazie ịma ihe ha ga-eme eme.+ 15  Jehova, mba ị bara na ume i kupụrụ+Mere ka a hụ ala ala oké osimiri,*+Meekwa ka a hụ ntọala ụwa. 16  O si n’elu matịa aka ya. O jidere m aka dọpụta m ná mmiri miri emi.+ 17  Ọ napụtara m n’aka onye iro m siri ike,+Napụtakwa m n’aka ndị kpọrọ m asị, ndị kakwa m ike.+ 18  Ha mesiri m ike mgbe ọdachi dakwasịrị m,+Ma Jehova nyeere m aka. 19  Ọ kpọpụtara m kpọba m ebe ihe ọ bụla na-agaghị eme m.* Ọ napụtara m n’ihi na ihe m masịrị ya.+ 20  Jehova na-akwụ m ụgwọ maka na m bụ onye ezi omume.+ Ọ na-akwụ m ụgwọ maka na aka m dị ọcha.+ 21  M na-eme ihe dị Jehova mma,Ahapụghịkwa m Chineke m, nke bụ́ ihe ọjọọ. 22  M na-echeta ihe niile o kpebiri,Agaghị m eleda ntụziaka ya anya. 23  M ga na-eme ihe dị mma n’anya ya mgbe niile,+Agaghịkwa m eme ihe ọjọọ ọ bụla.+ 24  Ka Jehova kwụọ m ụgwọ n’ihi na m bụ onye ezi omume+Nakwa n’ihi na aka m dị ọcha n’anya ya.+ 25  Ị naghị ahapụ onye jisiri gị aka ike.+ Ị na-egosi onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta na ị bụ onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta.+ 26  Ị na-egosi onye na-akwụwa aka ọtọ na ị na-akwụwa aka ọtọ,+Ma ị ga-egosi onye dị aghụghọ na ị ma ihe.+ 27  Ị na-azọpụta ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha.*+ Ma ị na-eweda ndị dị mpako ala.+ 28  Ọ bụ gị, Jehova, na-amụnye ọkụ* m,Chineke m onye na-eme ka ìhè nwuoro m n’ọchịchịrị.+ 29  M ga-alụsoli ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga ọgụ maka na ị na-enyere m aka.+ M ga-awụfeli mgbidi n’ihi ike Chineke na-enye m.+ 30  Ihe ezi Chineke na-eme zuru okè.+ Okwu Jehova enweghị ntụpọ.*+ Chineke bụụrụ ndị niile na-agbaba n’ime ya ọta.+ 31  N’ihi na ònye bụ Chineke ma e wepụ Jehova?+ Ònyekwa bụ oké nkume ma e wepụ Chineke anyị?+ 32  Ọ bụ ezi Chineke bụ onye na-eme ka m dị ike,+Ọ ga-emekwa ka ụzọ m kwụrụ ọtọ.+ 33  Ọ na-eme ka ụkwụ m na-awụ ọsọ ka ụkwụ mgbada. Ọ na-eme ka m guzoro n’ebe dị ezigbote elu.+ 34  Ọ na-akụziri m* otú e si alụ agha. Aka m na-ekweli ụta ọla kọpa. 35  Ị na-enye m ọta gị nke na-azọpụta m.+ Aka gị siri ike* na-akwado m. Otú i si dị umeala n’obi na-eme ka m bụrụ nnukwu mmadụ.+ 36  Ị na-eme ka ụzọ ụkwụ m na-aga saa mbara. Ka ụkwụ m* ghara ịmịchapụ.+ 37  M ga-achụ ndị iro m ọsọ chụkwuru ha. Agaghị m alaghachi azụ ruo mgbe m kpochapụrụ ha. 38  M ga-egweri ha ka ha ghara inwe ike ibili.+ Ha ga-ada, mụ azọkwasị ha ụkwụ. 39  Ị ga-enye m ike m ga-eji alụ agha. Ị ga-eme ka ndị iro m daa n’ihu m.+ 40  Ị ga-eme ka ndị iro m gbaghachi azụ n’ihi m. M ga-ebibikwa ndị kpọrọ m asị.+ 41  Ha na-ebe ákwá ka e nyere ha aka, ma e nweghị onye na-azọpụta ha. Ha na-ebesadịrị Jehova ákwá, ma ọ naghị atụpụrụ ha ọnụ. 42  M ga-asụri ha ka ha dị ka uzuzu nke ifufe na-ebu. M ga-awụpụ ha otú e si awụpụ apịtị n’okporo ámá. 43  Ị ga-anapụta m n’aka ndị na-akatọ m.+ Ị ga-eme m onyeisi mba dị iche iche.+ Ndị m na-amaghị ga-ejere m ozi.+ 44  Naanị akụkọ ha nụrụ ga-eme ka ha rubere m isi. Ndị mba ọzọ ga-abịa, jiri ụjọ na-akpọrọ m isiala.+ 45  Obi ga-amapụ* ndị mba ọzọ. Ha ga-amara jijiji si n’ebe ha a rụsiri ike na-apụta. 46  Jehova dị ndụ. Ka e too Oké Nkume m.+ Ka a jaa Chineke m mma, bụ́ onye na-azọpụta m.+ 47  Ezi Chineke na-abọrọ m ọbọ.+ Ọ na-eme ka ndị dị iche iche nọrọ n’okpuru m. 48  Ọ na-anapụta m n’aka ndị iro m iwe ji. Chineke, ị na-ebugo m ebe aka ndị na-achọ imesi m ike na-agaghị eru.+ Ị na-anapụta m n’aka onye chọrọ imerụ m ahụ́. 49  Jehova, ọ bụ ya mere m ga-eji nọrọ ná mba dị iche iche too gị.+ M ga-abụkwa abụ iji too aha gị.+ 50  Ị na-eme ihe ndị dị egwu iji zọpụta onye i mere eze.+ Ị na-egosi Devid, bụ́ onye i tere mmanụ,+Na ụmụ* ya na ị hụrụ ha n’anya* ruo mgbe ebighị ebi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “onye nzọpụta m nke dị ike.”
Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “ọwa mmiri.”
Ma ọ bụ “ebe sara mbara.”
Ma ọ bụ “ndị na-ata ahụhụ.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
Ma ọ bụ “bụ okwu e ji ọkụ nụchaa.”
Na Hibru, “aka m.”
Na Hibru, “Aka nri gị.”
Ma ọ bụ “nkwonkwo ụkwụ m.”
Ma ọ bụ “Ike ga-agwụ.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya pụrụ iche.”