Abụ Ọma 21:1-13

  • A ga-agọzi eze nke tụkwasịrị Jehova obi

    • Eze ga-adị ogologo ndụ (4)

    • A ga-emeri ndị iro Chineke (8-12)

Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid. 21  Jehova, eze na-aṅụrị ọṅụ n’ihi na ị na-egosi na ị dị ike.+ Ọ na-aṅụrị nnukwu ọṅụ maka na ị na-azọpụta ya.+   I meerela ya ihe obi ya chọrọ.+ Ị jụghị inye ya ihe ọ* rịọrọ. (Sila)   N’ihi na i ji ọtụtụ ihe ọma gọzie ya. I kpuwere ya okpueze e ji ezigbo ọlaedo* rụọ.+   Ọ rịọrọ gị ka i mee ka ọ dị ogologo ndụ, i wee meere ya ihe ọ rịọrọ.+ I mere ka ọ dị ogologo ndụ, ka ọ dịrị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi.   Nzọpụta ị na-azọpụta ya na-eme ka ọ dị ebube.+ Ị na-achọ ya mma ma mee ka ọ bụrụ onye a na-akwanyere ùgwù.   Ị na-eme ka ọ bụrụ onye a gọziri agọzi ruo mgbe ebighị ebi.+ Ị na-eme ka ọ na-aṅụrị ọṅụ maka na ị nọnyeere ya.+   N’ihi na eze tụkwasịrị Jehova obi.+ E nweghị ihe ga-eme ka ọ daa* n’ihi ịhụnanya nke Onye Kacha Elu.+   Aka gị ga-akpara ndị iro gị niile. Aka gị siri ike* ga-ejide ndị kpọrọ gị asị.   Mgbe ị ga-elebara ha anya, ị ga-ala ha n’iyi otú nnukwu ọkụ si ala ihe a tụbara na ya n’iyi. Jehova ga-eji iwe bibie ha,* ọkụ ga-erepịakwa ha.+ 10  Ị ga-ebibi ụmụ* ha. Ị ga-ewepụ ha n’ụwa. Ị ga-ala ụmụ ha n’iyi. 11  Ha bu n’obi ime gị ihe ọjọọ.+ Ha echepụtala ihe ha ga-eme gị, ma ọ ga-akụ afọ n’ala.+ 12  Ị ga-eche ụta gị ihu n’ebe ha nọ*+Mee ka ha gbaghachi azụ. 13  Jehova, biko, bilie kpaa ike. Anyị ga-abụku gị abụ otuto maka na ị dị ike.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “egbugbere ọnụ ya.”
Ma ọ bụ “ọlaedo a nụchara anụcha.”
Ma ọ bụ “ka ọ zọhie ụkwụ.”
Na Hibru, “Aka nri gị.”
Na Hibru, “loo ha.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ.”
Na Hibru, “n’ihu ha.”