Abụ Ọma 24:1-10

  • Eze nke dị ebube banyere n’ọnụ ụzọ ámá

    • “Ọ bụ Jehova nwe ụwa” (1)

Abụ Devid. 24  Ọ bụ Jehova nwe ụwa na ihe niile dị n’ime ya.+ Ọ bụ ya nwe ala na ndị bi na ya.   Ọ tọrọ ntọala ya ka o sie ike n’elu oké osimiri,+O mekwara ka o sie ezigbo ike n’elu osimiri.   Ònye nwere ike ịrịgo n’ugwu Jehova?+ Ònyekwa nwere ike iguzo n’ebe nsọ ya?   Ọ bụ onye ọ bụla aka ya dị ọcha, onye obi ya dịkwa ọcha,+Onye na-anaghị eji m* aṅụ iyi ụgha,Onye na-anaghịkwa aṅụ iyi ka ọ ghọgbuo ndị ọzọ.+   Jehova ga-agọzi ya.+ Chineke, onye na-azọpụta ya, ga-ewere ya ka onye ezi omume.*+   Ọ bụ ndị a bụ ìgwè* ndị na-achọ ya,Ndị na-achọ ka gịnwa, bụ́ Chineke Jekọb, meere ha amara. (Sila)   Unu ọnụ ụzọ ámá, welienụ isi unu.+ Unu ọnụ ụzọ oge ochie, megheenụ*Ka Eze dị ebube wee bata!+   Ònye bụ Eze a dị ebube? Ọ bụ Jehova, onye dị ike ma nwee ume,+Jehova, onye bụ́ dike n’agha.+  Unu ọnụ ụzọ ámá, welienụ isi unu.+ Unu ọnụ ụzọ oge ochie, megheenụKa Eze dị ebube wee bata! 10  Ònye ka Eze a dị ebube bụ? Ọ bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha. Ọ bụ ya bụ Eze ahụ dị ebube.+ (Sila)

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ndụ m,” ya bụ, ndụ Jehova.
Ma ọ bụ “ga-ekpe ya ikpe ziri ezi.”
Ma ọ bụ “ọgbọ.”
Ma ọ bụ “bilienụ.”