Abụ Ọma 37:1-40
Abụ Devid.
א [Alef]
37 Ewerela ndị na-eme ihe ọjọọ iwe,Enwekwarala ndị ajọ omume anyaụfụ.+
2 Ha ga-akpọnwụ ọsọ ọsọ ka ahịhịa,+Ha ga-achanwụkwa ka ahịhịa ndụ.
ב [Bet]
3 Tụkwasị Jehova obi, na-emekwa ihe ọma.+
Biri n’ụwa,* na-emekwa ihe ga-eme ka a tụkwasị gị obi.+
4 Na-enwe ezigbo obi ụtọ* n’ihi Jehova,Ọ ga-emere gị ihe obi gị chọrọ.
ג [Gimel]
5 Kwe ka Jehova na-edu gị.*+
Tụkwasị ya obi. Ọ ga-enyere gị aka.+
6 Ọ ga-eme ka ezi omume ị na-eme na-enwu ka ìhè ụtụtụ,Meekwa ka ihe ndị dị mma ị na-eme na-acha ka anwụ etiti ehihie.
ד [Dalet]
7 Gba nkịtị n’ihu Jehova,+Na-atụsikwa anya ya ike.*
Ewerela onye na-akpa nkata ọjọọ iweMaka na nkata ọ na-akpa na-agaziri ya.+
ה [Hee]
8 Hapụ iwe, hapụkwa ọnụma.+
Ewela iwe wee gaa mee ihe ọjọọ.*
9 N’ihi na a ga-ebibi ndị na-eme ihe ọjọọ.+
Ma ndị nwere olileanya n’ebe Jehova nọ ga-enweta ụwa.+
ו [Wọọ]
10 N’oge na-adịghị anya, ndị ajọ omume agaghịzi anọ.+
Ị ga-ele anya n’ebe ha na-anọ,Ma ha agaghị anọ ya.+
11 Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa,+Obi ga-adịkwa ha ezigbo ụtọ maka na ha ga-anọ nnọọ n’udo.+
ז [Zayin]
12 Onye ajọ omume na-akpara onye ezi omume nkata ọjọọ.+
Ọ na-ata ikikere ezé maka na ọ na-ewesa onye ezi omume iwe.
13 Ma Jehova ga-achị ya ọchị,N’ihi na ọ ma na ụbọchị a ga-ebibi ya na-abịa.+
ח [Het]
14 Ndị ajọ omume na-amịpụta mma agha ha, na-ekwekwa ụta haKa ha gbatuo ndị a na-emegbu emegbu na ndị ogbenyeNakwa ka ha gbuo ndị na-eme ihe ziri ezi.*
15 Ma mma agha ha ga-amaba ha n’obi.+
A ga-agbaji ụta ha.
ט [Tet]
16 Obere ihe onye ezi omume nwere dị mmaKarịa nnukwu ihe ọtụtụ ndị ajọ omume nwere.+
17 N’ihi na a ga-anapụ ndị ajọ omume ike,*Ma Jehova ga na-akwado ndị ezi omume.
י [Yod]
18 Jehova ma nsogbu niile na-abịara ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta,Ihe ha ga-eketa ga-adịrukwa mgbe ebighị ebi.+
19 Ihere agaghị eme ha n’oge ọdachi dakwasịrị ha.
Ha ga-enwe ọtụtụ ihe ha ga-eri n’oge ụnwụ.
כ [Kaf]
20 Ma a ga-ebibi ndị ajọ omume.+
Ndị iro Jehova ga-ala n’iyi otú ahịhịa ndị dị n’ebe mara mma anụmanụ na-ata ahịhịa si akpọnwụ.
Ha ga-apụ n’anya ka anwụrụ ọkụ.
ל [Lamed]
21 Onye ajọ omume na-agbaziri ihe, ma ọ naghị akwụghachi.
Ma onye ezi omume na-emesapụ aka,* na-emetekwara ndị mmadụ ebere.*+
22 Ndị Chineke gọziri ga-enweta ụwa,Ma a ga-ebibi ndị ọ bụrụ ọnụ.+
מ [Mem]
23 Ọ bụrụ na ihe mmadụ na-eme dị Jehova mma,+Ọ ga na-eduzi onye ahụ n’ihe ọ bụla ọ na-eme.+
24 Ọ bụ eziokwu na onye ahụ nwere ike ịda, ma ọ gaghị adaru ala,+N’ihi na Jehova ji ya aka, na-akwado ya.+
נ [Nun]
25 E nwere mgbe m bụ nwata. Ma ugbu a, abụzi m agadi.
Ma ahụbeghị m ka a hapụrụ onye ezi omume ọ bụla,+Ahụbeghịkwa m ụmụ ya ka ha na-arịọ nri.*+
26 Ọ na-eji obi ya niile agbazinye ihe,+A ga-agọzikwa ụmụ ya.
ס [Samek]
27 Hapụ ihe ọjọọ ma mewe ezi ihe,+Ị ga-anọgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.
28 N’ihi na ikpe ziri ezi na-amasị Jehova,Ọ gaghịkwa ahapụ ndị na-erubere ya isi.+
ע [Ayin]
Ọ ga na-echebe ha mgbe niile.+
Ma a ga-ebibi ụmụ ndị ajọ omume.+
29 Ndị ezi omume ga-enweta ụwa,+Ha ga-ebikwa na ya ruo mgbe ebighị ebi.+
פ [Pee]
30 Onye ezi omume na-eji ọnụ ya ekwu ihe ga-eme ka mmadụ mara ihe,Ọ* na-ekwukwa ihe ziri ezi.+
31 Iwu Chineke ya dị n’obi ya.+
Ọ gaghị azọhie ụkwụ.+
צ [Sadee]
32 Onye ajọ omume na-ele onye ezi omume anya,Na-achọ ka o gbuo ya.
33 Ma Jehova agaghị ahapụ onye ezi omume n’aka ya,+Ọ gaghịkwa ekwu na ikpe mara onye ezi omume mgbe a na-ekpe ya ikpe.+
ק [Kof]
34 Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ, na-esokwa ụzọ ya,Ọ ga-emekwara gị amara, mee ka i nweta ụwa.
Mgbe a ga-ebibi ndị ajọ omume,+ ị ga-ahụ ya.+
ר [Resh]
35 Ahụla m onye ajọ omume nke obi fere azụKa ihe na-agaziri ya, ya adị ka nnukwu osisi na-ama pokopoko n’ala a kụrụ ya.+
36 Ma, ọ nwụrụ na mberede. Ọ nọghịzi.+
Anọ m na-achọ ya, ma ahụghị m ya.+
ש [Shin]
37 Hụwa onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta ama,Na-elekwa onye ezi omume anya,+N’ihi na udo ga-adịrị ya n’ọdịnihu.+
38 Ma a ga-ebibi ndị niile na-emebi iwu.
Ndị ajọ omume enweghị ọdịnihu.+
ת [Tọọ]
39 Ọ bụ Jehova na-azọpụta ndị ezi omume.+
Ọ bụ ebe a rụsiri ike nke ha na-agbaba n’oge ahụhụ.+
40 Jehova ga-enyere ha aka ma napụta ha.+
Ọ ga-anapụta ha n’aka ndị ajọ omume ma zọpụta ha,Maka na ha gbabara n’ime ya.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “n’ala.”
^ Ma ọ bụ “Na-enwe ọṅụ kachanụ.”
^ Na Hibru, “Nyefee Jehova ụzọ gị.”
^ Ma ọ bụ “Jiri ndidi na-eche ya.”
^ O nwere ike ịbụ, “Ewela iwe, n’ihi na naanị ihe o nwere ike ịkpata bụ nsogbu.”
^ Ma ọ bụ “ndị ụzọ ha kwụ ọtọ.”
^ Na Hibru, “ga-agbaji aka ndị ajọ omume.”
^ Ma ọ bụ “na-enwekwa ọmịiko.”
^ Ma ọ bụ “na-eme amara.”
^ Na Hibru, “achịcha.”
^ Na Hibru, “Ire ya.”