Abụ Ọma 46:1-11
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. Abụ ụmụ Kora.+ A ga-eji ụda Alamọt* kpọọ ya.
46 Chineke bụ ebe mgbaba anyị na ike anyị.+
Ọ dị njikere inyere anyị aka n’oge nsogbu.+
2 Ọ bụ ya mere na anyị agaghị atụ egwu, ọ bụrụgodị na ụwa agbanwee,Ọ bụrụgodị na ugwu dị iche iche amaa jijiji daba n’ala oké osimiri,+
3 Ọ bụrụgodị na mmiri ya na-eme mkpọtụ, na-agbọkwa ụfụfụ,+Ọ bụrụgodị na ugwu dị iche iche amaa jijiji maka na oké osimiri na-enugharị enugharị. (Sila)
4 E nwere osimiri nke iyi ndị si na ya asọpụta na-eme ka ndị bi n’obodo Chineke ṅụrịa ọṅụ.+
Ha na-eme ka ebe nsọ, ya bụ, nnukwu ụlọikwuu nke Onye Kacha Elu, ṅụrịa ọṅụ.
5 Chineke nọ n’obodo ahụ.+ A gaghị akwatuli ya.
Chineke ga-enyere ya aka mgbe chi bọrọ.+
6 Mba dị iche iche nọ na-agba ghara ghara. E meriri alaeze dị iche iche.
Ọ bara mba, ụwa wee maa jijiji.+
7 Jehova nke ụsụụ ndị agha nọnyeere anyị.+
Chineke Jekọb bụ ebe anyị na-agbaba, aka aghara ịkpa anyị. (Sila)
8 Bịanụ, hụ ọrụ dị iche iche Jehova na-arụ,Otú o si mee ihe dị iche iche dị ịtụnanya n’ụwa.
9 Ọ na-eme ka agha kwụsị n’ebe niile n’ụwa.+
Ọ na-agbaji ụta, na-agbajisịkwa ube.
Ọ na-agba ụgbọ e ji alụ agha* ọkụ.
10 “Chịlierenụ m aka elu. Maranụ na m bụ Chineke.
A ga-eto m ná mba niile.+
A ga-eto m n’ụwa.”+
11 Jehova nke ụsụụ ndị agha nọnyeere anyị.+
Chineke Jekọb bụ ebe anyị na-agbaba, aka aghara ịkpa anyị.+ (Sila)