Abụ Ọma 63:1-11

  • Agụụ ife Chineke ofufe

    • “Ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ” (3)

    • “Ihe kacha mma i nyere m juru m afọ” (5)

    • Ịtụgharị uche banyere Chineke n’abalị (6)

    • ‘M rapaara Chineke n’ahụ́’ (8)

Abụ Devid bụrụ mgbe ọ nọ n’ala ịkpa Juda.+ 63  Chineke, ị bụ Chineke m. M na-achọsi gị ike.+ Agụụ ife gị na-agụsi m ike.*+ Ike agwụla m ebe m na-atụ anya gịN’ala kpọrọ ezigbo nkụ nke mmiri na-adịghị.+   N’ihi ya, ahụla m gị n’ebe nsọ gị. Ahụla m ike gị na ebube gị.+   M ga-eji ọnụ m jaa* gị mma+Maka na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ.+   N’ihi ya, m ga-eto gị ná ndụ m niile. M ga-agbasa aka m kpọkuo aha gị.   M ga-eji ọnụ m bụkuo gị abụ otuto, jirikwa ọṅụ too gị,N’ihi na ihe kacha mma i nyere m juru m* afọ.+   M na-echeta gị n’elu àkwà* m. Ọ bụ ihe banyere gị ka m na-atụgharị n’uche n’oge nche abalị.+   N’ihi na ọ bụ gị na-enyere m aka,+M nọkwa n’okpuru nku gị na-eti mkpu ọṅụ.+   M* rapaara gị n’ahụ́. Aka nri gị jidesiri m ike.+   Ma ndị chọrọ igbu m*Ga-aba n’ime ime ala. 10  A ga-eji mma agha bibie ha. Ha ga-aghọrọ nkịta ọhịa nri. 11  Ma, eze ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi ihe Chineke meere ya. Onye ọ bụla nke na-eji aha Chineke aṅụ iyi ga-enwe obi ụtọ,*N’ihi na a ga-emechi ọnụ ndị na-ekwu okwu ụgha.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Agụụ gị na-agụsi mkpụrụ obi m ike.”
Na Hibru, “Egbugbere ọnụ m ga-aja.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “ihe ndina.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “ibibi mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “ga-anya isi.”