Abụ Ọma 72:1-20

  • Udo ga-adị ma onye Chineke chiri eze chịwa

    • “Ihe ga na-agaziri onye ezi omume” (7)

    • Ọ ga-achị malite n’osimiri ruo n’osimiri (8)

    • Ọ ga-anapụta ndị a na-emegbu emegbu (14)

    • Nri ga-eju n’ụwa (16)

    • Ka e too aha Chineke ruo mgbe ebighị ebi (19)

Gbasara Solomọn. 72  Chineke, biko, mee ka eze mara ihe ndị i kpebiri,Meekwa ka nwa eze mara ezi omume ị na-eme.+   Ka o kpee ikpe ziri ezi mgbe ọ na-ekpechite ọnụ ndị gị,Ka o kpeekwa ikpe ziri ezi mgbe ọ na-ekpechite ọnụ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha.+   Ka ugwu ukwu mee ka udo dịrị ndị mmadụ,Ka ugwu nta meekwa ka ha na-eme ezi omume.   Ka o kpechite ọnụ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha* n’ime ndị gị. Ka ọ zọpụta ụmụ ndị ogbenye,Ka o bibiekwa onye na-erigbu ndị ọzọ.+   Ha ga na-atụ egwu gị ogologo oge niile anyanwụ dịNakwa ogologo oge niile ọnwa dị,Si n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+   Ọ ga-adị ka mmiri nke na-ezosa n’ahịhịa a sụrụ asụ,Dị ka mmiri ozuzo nke na-ede ala.+   N’oge ọchịchị ya, ihe ga na-agaziri onye ezi omume,+Udo ga-adịkwa ebe niile+ ruo mgbe ọnwa na-agaghịzi adị.   Ọ ga-enwe ndị ọ na-achị* malite n’oké osimiri ruo n’oké osimiri,Malitekwa n’Osimiri Yufretis ruo n’ebe niile ụwa sọtụrụ.+   Ndị bi n’ala ịkpa ga-akpọrọ ya isiala,Ndị iro ya ga-arachakwa ájá.+ 10  Ndị eze Tashish na ndị eze agwaetiti dị iche iche ga-atụrụ ya ụtụ.+ Ndị eze Shiba na ndị eze Siba ga-eweta onyinye.+ 11  Ndị eze niile ga-akpọrọ ya isiala,Mba niile ga-ejekwara ya ozi. 12  N’ihi na ọ ga-anapụta ogbenye nke na-ebe ákwá ka e nyere ya aka,Napụtakwa onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na onye ọ bụla na-enweghị onye na-enyere ya aka. 13  Ọ ga-emere ogbenye na onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ebere,Ọ ga-azọpụtakwa ndị ogbenye. 14  Ọ ga-anapụta ha* n’aka ndị na-emegbu ha nakwa n’aka ndị na-emesi ha ike,Ọ ga-ejikwa ndụ* ha kpọrọ ihe. 15  Ka ọ dịrị ndụ, ka e nyekwa ya ọlaedo Shiba.+ Ka a na-ekpere ya ekpere mgbe niile,Ka a na-agọzikwa ya mgbe niile. 16  Nri ga-eju n’ụwa.+ Ọ ga-eju eju n’elu ugwu dị iche iche. Mkpụrụ a kụrụ n’ubi ya ga na-eme nke ọma ka osisi ndị dị na Lebanọn,+Ndị nọ n’obodo ya dị iche iche ga na-amakwa pokopoko ka ihe a kụrụ n’ala.+ 17  Ka aha ya dịruo mgbe ebighị ebi.+ Ka aha ya na-ede ude ogologo oge niile anyanwụ dị. Ka e si n’aka ya gọzie ndị mmadụ.+ Ka mba niile kpọọ ya onye obi ụtọ. 18  Ka e too Jehova Chineke, bụ́ Chineke Izrel,+Onye naanị ya na-eme ihe ndị dị ebube.+ 19  Ka e too aha ya dị ebube ruo mgbe ebighị ebi,+Ka ebube ya jukwa ụwa niile.+ Amen na Amen. 20  Ekpere Devid nwa Jesi gwụrụ n’ebe a.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Ka o kpee ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha ikpe.”
Ma ọ bụ “Ọ ga-achị.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ha.”
Na Hibru, “ọbara.”