Abụ Ọma 81:1-16
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ; nke ụda Gitit.* Abụ Esaf.+
81 Tienu mkpu ọṅụ n’ihu Chineke, bụ́ ike anyị.+
Tienu mkpu ọṅụ, tookwanụ Chineke Jekọb.
2 Malitenụ ịbụ abụ, werekwanụ obere ịgbàNa ụbọ akwara nakwa une e ji akpọ egwú dị ụtọ.
3 Fụọnụ opi n’ụbọchị ọnwa ọhụrụ pụtara,+N’ụbọchị ọnwa gbazuru agbazu, n’ụbọchị ememme anyị.+
4 N’ihi na ọ bụ iwu e nyere Izrel,Iwu Chineke Jekọb nyere.+
5 O nyere ya Josef mgbe ọ* gara lụso ndị Ijipt agha,+Ka ọ bụrụ ihe ha ga na-echeta mgbe niile.+
M nụrụ olu* m na-amataghị, nke sịrị:
6 “M bupụrụ ibu o bu n’ubu ya.+
M buuru nkata o bu n’aka.*
7 Ị kpọkuru m n’oge ị na-ata ahụhụ, m wee napụta gị.+
M si n’ígwé ojii, nke égbè eluigwe si agba,* za gị.+
M nwalere gị na mmiri Meriba.*+ (Sila)
8 Ndị m, Izrel, nụrụnụ. M ga-ekwu ihe unu mere.
A sị nnọọ na unu ga-ege m ntị.+
9 Unu agaghị enwe chi ọzọ,Unu agaghịkwa akpọrọ chi ala ọzọ isiala.+
10 Mụnwa, bụ́ Jehova, bụ Chineke unu,Onye kpọpụtara unu n’Ijipt.+
Mepeenụ ọnụ unu nke ọma ka m tinyejuo ya nri.+
11 Ma ndị m egeghị m ntị.
Izrel ekweghị erubere m isi.+
12 M wee hapụ ha ka ha mewe ihe obi ha kpọrọ nkụ chọrọ.
Ha mere ihe ha chere dị mma.+
13 A sị nnọọ na ndị m ga-ege m ntị,+A sị nnọọ na Izrel ga-erubere m isi,+
14 M ga-emeri ndị iro ha n’egbughị oge.
M ga-alụso ndị iro ha ọgụ.+
15 Ndị kpọrọ Jehova asị ga-ama jijiji n’ihu ya,A ga-ebibikwa ha ruo mgbe ebighị ebi.
16 Ma ọ ga na-enye gị* ọka wit kacha mma,+Ọ ga na-enyekwa gị mmanụ aṅụ si n’oké nkume ruo mgbe afọ juru gị.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Ma ọ bụ “asụsụ.”
^ Ya bụ, Chineke.
^ O nwere ike ịbụ na ihe a na-ekwu ebe a bụ nkata ndị ohu ji ebu ihe e ji arụ ụlọ.
^ Meriba pụtara “Esemokwu.”
^ Na Hibru, “n’ebe zoro ezo égbè eluigwe si agba.”
^ Na Hibru, “ya,” ya bụ, ndị Chineke.