Abụ Ọma 86:1-17

  • E nweghị chi dị ka Jehova

    • Jehova dị njikere ịgbaghara mmehie (5)

    • Mba niile ga-efe Jehova (9)

    • “Kụziere m ụzọ gị” (11)

    • ‘Mee ka m jiri obi m niile na-atụ egwu gị’ (11)

Ekpere Devid. 86  Jehova, biko, gee ntị* ma za m,N’ihi na m na-ata ahụhụ, m dakwara ogbenye.+   Chebe ndụ* m, n’ihi na m na-erubere gị isi.+ Zọpụta ohu gị, onye tụkwasịrị gị obi,N’ihi na ị bụ Chineke m.+   Jehova, biko, meere m amara,+N’ihi na m na-akpọku gị malite n’ụtụtụ ruo n’abalị.+   Jehova, biko, mee ka ohu* gị ṅụrịa ọṅụ,N’ihi na ọ bụ gị ka m lekwasịrị anya.   N’ihi na gịnwa bụ́ Jehova dị mma,+ dịkwa njikere ịgbaghara mmehie.+ Ịhụnanya ị na-egosi ndị niile na-akpọku gị dị ukwuu.+   Jehova, biko, gee ntị n’ekpere m. Ṅaakwa ntị n’arịrịọ m na-arịọ ka i nyere m aka.+   M na-akpọku gị n’oge m na-ata ahụhụ,+N’ihi na ị ga-aza m.+   Jehova, e nweghị chi dị ka gị n’ime chi niile.+ E nweghị onye rụtụrụla ọrụ ndị ị rụrụ.+   Jehova, mba niile i kereGa-abịa kpọọrọ gị isiala,+Ha ga-etokwa aha gị.+ 10  N’ihi na ị bụ onye ukwu, ị na-emekwa ihe ndị dị ebube.+ Ọ bụ naanị gị bụ Chineke.+ 11  Jehova, biko, kụziere m ụzọ gị.+ M ga-eje ije n’ezigbo ụzọ gị.+ Mee ka m jiri obi m niile* na-atụ egwu aha gị.+ 12  Jehova Chineke m, m ji obi m niile na-eto gị,+M ga-etokwa aha gị ruo mgbe ebighị ebi, 13  N’ihi na ịhụnanya i nwere n’ebe m nọ dị ukwuu,I sikwa n’ime ime ili* zọpụta m.*+ 14  Chineke, ndị dị mpako na-alụso m ọgụ.+ Ìgwè ndị obi fere azụ na-achọ igbu m,*E nweghịkwa ihe ha ji gị kpọrọ.+ 15  Ma Jehova, ị bụ Chineke nwere ọmịiko* ma na-eme ebere. Ị naghị ewe iwe ọsọ ọsọ, ịhụnanya gị dị ukwuu, ị bụkwa onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.*+ 16  Chee ihu n’ebe m nọ ma meere m amara.+ Nye ohu gị ike gị,+Zọpụtakwa nwa ohu gị nwaanyị. 17  Mee ka ndị kpọrọ m asị hụ ihe ọma ndị ị na-emere m,Ka ihere wee mee ha. N’ihi na Jehova, ọ bụ gị na-enyere m aka, na-akasikwa m obi.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “hulata gee ntị.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ohu.”
Ma ọ bụ “obi a na-ekewaghị ekewa.”
Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m; ndụ m.”
Ma ọ bụ “na-achọ mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “ị na-emekwa amara.”
Ma ọ bụ “ị na-ekwukwa eziokwu.”