Abụ Ọma 92:1-15

  • Jehova kacha elu ruo mgbe ebighị ebi

    • Ọrụ ya dị ebube; ọ ma ihe nke ukwuu (5)

    • ‘Onye ezi omume ga-ama pokopoko ka osisi’ (12)

    • Ndị agadi ka ga na-eme nke ọma (14)

Abụ a na-abụ n’Ụbọchị Izu Ike. Abụ ọma. 92  Jehova, Onye Kacha Elu, ọ dị mma ka e kelee gị+Nakwa ka a bụọ abụ iji too aha gị.   Ọ dị mma ka a kọsaa ịhụnanya gị*+ n’ụtụtụNakwa ka a kọsaa n’abalị na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.   Jirinụ une na ụbọ nwere akwara iriNakwa ụbọ akwara e ji akpọ egwú na-atọ ụtọ na-eto ya.+   N’ihi na, Jehova, i meela ka m ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe ndị ị na-eme. M na-eti mkpu ọṅụ n’ihi ihe ndị ị na-arụ.   Jehova, ọrụ gị dị nnọọ ebube.+ Ị ma ihe nke ukwuu.+   Mmadụ ọ bụla nke na-anaghị eche echiche enweghị ike ịmata ha. E nweghịkwa onye nzuzu nwere ike ịghọta ihe a:+   Mgbe ndị ajọ omume na-eju ebe niile otú ahịhịa si epu ebe niile,Ihe ana-agazikwara ndị niile na-eme ihe ọjọọ,Ọ bụ ka e wee laa ha n’iyi ruo mgbe ebighị ebi.+   Ma ọ bụ gị, Jehova, kacha elu ruo mgbe ebighị ebi.   Jehova, lee ndị iro gị anya chịa ha ọchị mgbe a na-emeri ha. Legodị otú a ga-esi laa ndị iro gị n’iyi. A ga-achụsasị ndị niile na-eme ihe ọjọọ.+ 10  Ma ị ga-eme ka m sie ike* ka atụ́. M ga-ete mmanụ ọhụrụ n’ahụ́.+ 11  M ga na-ele ndị iro m anya na-achị ha ọchị mgbe a na-emeri ha.+ M ga-eji ntị m nụ na e meriela ndị ọjọọ na-alụso m ọgụ. 12  Ma onye ezi omume ga na-ama pokopoko ka nkwụ. Ọ ga na-agba agba ka osisi sida dị na Lebanọn.+ 13  Ha dị ka osisi a kụrụ n’ụlọ Jehova. Ha ga na-eme nke ọma n’ogige ụlọ Chineke anyị.+ 14  Ha megodị agadi,* ha ka ga na-eme nke ọma.+ Ahụ́ ka ga-esi ha ike, ha ga na-amakwa pokopoko.+ 15  Ha ga na-akọsa na Jehova bụ onye ezi omume. Ọ bụ ya bụ Oké Nkume m,+ ọ naghịkwa eme ihe ọjọọ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Na Hibru, “Ị ga-ebuli mpi m elu.”
Ma ọ bụ “Ha gbagodị isi awọ́.”