Abụ Ọma 94:1-23
94 Jehova, Chineke nke na-abọ ọbọ,+Chineke nke na-abọ ọbọ, gosi na ị dị ebube.
2 Onyeikpe ụwa, biko, bilie.+
Kwụọ ndị mpako ụgwọ ihe ha mere.+
3 Jehova, olee mgbe ndị ajọ omume ga-akwụsị ịṅụrị ọṅụ?
Olee mgbe ha ga-akwụsị ịṅụrị ọṅụ?+
4 Ha na-ekwu ekwurekwu, na-etukwa ọnụ.
Ndị niile na-eme ihe ọjọọ na-eto onwe ha.
5 Jehova, ha na-echi ndị gị ọnụ n’ala,+Ha na-emegbukwa ndị i ketara.
6 Ha na-egbu nwaanyị di ya nwụrụ na onye mbịarambịa,Ha na-egbukwa ụmụ na-enweghị nna.
7 Ha na-asị: “Jaa anaghị ahụ ihe na-eme.+
Chineke Jekọb amaghị ihe na-eme.”+
8 Unu ndị na-anaghị eche echiche, ghọtanụ ihe a.
Unu ndị nzuzu, olee mgbe unu ga-ama ihe?+
9 Ọ̀ bụ na Onye kere ntị enweghị ike ịnụ ihe?
Ọ̀ bụ na Onye kere anya enweghị ike ịhụ ụzọ?+
10 Ọ̀ bụ na Onye na-adọ mba dị iche iche aka ná ntị enweghị ike ịbara unu mba?+
Ọ bụ ya na-akụziri ndị mmadụ ihe ka ha mara ihe.+
11 Jehova ma ihe ndị mmadụ na-eche.
Ọ ma na ihe ha na-eche bụ naanị ume e kupụrụ ekupụ.+
12 Jaa, onye ị na-adọ aka ná ntị na-enwe obi ụtọ,+Ya bụ, onye i ji iwu gị akụziri ihe,+
13 Ka i wee mee ka obi ruo ya ala n’oge ọdachi dakwasịrị ya,Ruo mgbe a ga-egwuru onye ajọ omume olulu.+
14 N’ihi na Jehova agaghị ahapụ ndị ya,+Ọ gaghịkwa ahapụ ndị o ketara.+
15 N’ihi na a ga-amalitekwa ikpe ikpe ziri ezi,Ndị niile obi ha dị ọcha ga na-emekwa ihe e kpebiri.
16 Ònye ga-anapụta m n’aka ndị ajọ omume?
Ònye ga-enyere m aka ka m merie ndị na-eme ihe ọjọọ?
17 A sị na Jehova anaghị enyere m aka,M* gaarala anwụ kemgbe.+
18 Mgbe m sịrị: “Ụkwụ m na-amịchapụ amịchapụ,”Jehova, ị nọ na-akwado m n’ihi ịhụnanya gị.*+
19 Mgbe m nọ na-echegbu onwe m,Ị kasiri m obi ma mee ka ahụ́ ruo m* ala.+
20 Gị na ndị ọchịchị,* bụ́ ndị na-arụrụ aka, ùnu ga na-emekọ iheMgbe ha na-akpa nkata ka ha jiri iwu kpata nsogbu?+
21 Ha na-alụso onye* ezi omume ezigbo ọgụ,+Na-amakwa onye aka ya dị ọcha ikpe ọnwụ.+
22 Ma Jehova ga-abụrụ m ebe m ga-agbaba, aka aghara ịkpa m.
Chineke m bụ oké nkume m na-agbaba.+
23 Ọ ga-eme ka ha jiri isi ha buru ihe ọjọọ ha metara.+
Ọ ga-eme ka ihe ọjọọ ha na-eme bibie ha.
Jehova bụ́ Chineke anyị ga-ebibi ha.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi m.”
^ Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
^ Ma ọ bụ “ndị ikpe.” Na Hibru, “ocheeze.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”