Abụ Ọma 96:1-13

  • “Bụkuonụ Jehova abụ ọhụrụ”

    • Onye ọ bụla kwesịrị ịna-eto Jehova (4)

    • Chi ndị mmadụ na-efe abaghị uru (5)

    • Yirinụ ọmarịcha uwe dị nsọ fee Jehova (9)

96  Bụkuonụ Jehova abụ ọhụrụ.+ Ndị niile bi n’ụwa, bụkuonụ Jehova abụ.+   Bụkuonụ Jehova abụ. Toonụ aha ya. Kwa ụbọchị, na-ekwusanụ ozi ọma banyere otú o si azọpụta ndị mmadụ.+   Kọọrọnụ mba dị iche iche na ọ dị ebube,Kọọkwaranụ mmadụ niile ọrụ ndị dị ebube ọ na-arụ.+   Jehova bụ onye ukwu, onye ọ bụla kwesịkwara ịna-eto ya. E kwesịrị ịna-atụ egwu ya karịa chi ọ bụla ọzọ.   Chi ọzọ niile ndị mmadụ na-efe abaghị uru.+ Ma, ọ bụ Jehova kere eluigwe.+   Ebube na ịma mma gbara ya gburugburu.+ Ike na ịma mma dị n’ebe nsọ ya.+   Ezinụlọ dị iche iche, toonụ Jehova. Toonụ Jehova n’ihi na ọ dị ebube, dịkwa ike.+   Toonụ aha Jehova dị ebube.+ Jirinụ onyinye bata n’ogige ụlọ ya.   Yirinụ ọmarịcha uwe dị nsọ kpọọrọ Jehova isiala.* Ndị niile bi n’ụwa, maanụ jijiji n’ihu ya. 10  Kọsaanụ ná mba dị iche iche, sị: “Jehova abụrụla Eze.+ E kesiri ụwa* ike. A gaghị ebupụli ya ebupụ.* Ọ ga-ekpe mba dị iche iche ikpe ziri ezi.”*+ 11  Ka eluigwe ṅụrịa ọṅụ, ka ụwa nweekwa aṅụrị. Ka oké osimiri na ihe niile dị n’ime ya mee mkpọtụ.+ 12  Ka ọhịa na ihe niile dị n’ime ya ṅụrịa ọṅụ.+ Ka osisi niile dị n’oké ọhịa tiekwa mkpu ọṅụ+ 13  N’ihi Jehova, n’ihi na ọ na-abịa.* Ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe. Ọ ga-ekpe ụwa* ikpe ziri ezi,+Ọ ga-ekpekwa mba dị iche iche ikpe otú gosiri na ọ bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “Feenụ Jehova n’ihi na ọ dị ebube, dịkwa nsọ.”
Ma ọ bụ “Ọ ga-ekpechite ọnụ mba dị iche iche.”
Ma ọ bụ “eme ka ọ maa jijiji.”
Ma ọ bụ “ala.”
Ma ọ bụ “ọ bịala.”
Ma ọ bụ “ala.”