Abụ Ọma 98:1-9

  • Jehova bụ Onye nzọpụta na-ekpe ikpe ziri ezi

    • Jehova egosila na ọ bụ onye nzọpụta (2, 3)

Abụ. 98  Bụkuonụ Jehova abụ ọhụrụ,+N’ihi na o meela ihe ndị dị ebube.+ O jirila aka ya siri ike,* ya bụ, ogwe aka ya dị nsọ, zọpụta ndị ya.*+   Jehova emeela ka a mara na ọ bụ onye nzọpụta.+ O meela ka mba dị iche iche mara na ọ bụ onye ezi omume.+   O chetala nkwa o kwere na ọ ga-egosi na ọ hụrụ ụlọ Izrel n’anya, gosikwa ha na ọ bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.+ Ndị niile bi n’ụwa ahụla otú Chineke anyị si zọpụta ndị ya.*+   Ndị niile bi n’ụwa, tienụ mkpu ọṅụ, tookwanu Jehova. Nweenụ obi ụtọ, tienụ mkpu ọṅụ, bụọkwanụ abụ otuto.+   Jirinụ ụbọ akwara bụkuo Jehova abụ otuto. Kpọọrọnụ ya ụbọ akwara, bụọkwaranụ ya abụ na-atọ ụtọ.   Fụọnụ opi dị iche iche,+Tiekwanụ mkpu ọṅụ n’ihu Eze, bụ́ Jehova.   Ka oké osimiri na ihe niile dị n’ime ya mee mkpọtụ,Ma ụwa* ma ndị bi na ya.   Ka osimiri kụọ aka. Ka ugwu niile tie mkpu ọṅụ+   N’ihi Jehova, n’ihi na ọ na-abịa* ikpe ụwa ikpe. Ọ ga-ekpe ụwa* ikpe ziri ezi,+Kpeekwa ndị dị iche iche ikpe ziri ezi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “aka nri ya.”
Ma ọ bụ “merie.”
Ma ọ bụ “otú Chineke anyị si merie.”
Ma ọ bụ “ala.”
Ma ọ bụ “ọ bịala.”
Ma ọ bụ “ala.”