Abụ Solomọn 1:1-17

  • Abụ kacha abụ niile (1)

  • Nwa agbọghọ Shulem (2-7)

  • Ụmụ nwaanyị Jeruselem (8)

  • Eze (9-11)

    • “Anyị ga-eji ọlaedo rụọrọ gị ọla e ji achọ mma” (11)

  • Nwa agbọghọ Shulem (12-14)

    • ‘Onye m hụrụ n’anya dị ka akpa mea na-esi ísì ọma’ (13)

  • Onye na-azụ atụrụ (15)

    • “Onye m hụrụ n’anya, ị mara mma”

  • Nwa agbọghọ Shulem (16, 17)

    • “Onye m hụrụ n’anya, ị mara mma” (16)

1  Abụ kacha abụ niile. Ọ bụ Solomọn dere abụ a:+   “Susuo m ọnụ,N’ihi na otú i si egosi na ị hụrụ m n’anya na-atọ m ụtọ karịa mmanya.+   Mmanụ gị na-esi ísì ọma.+ Aha gị dị ka mmanụ na-esi ísì ọma a na-awụpụta awụpụta.+ Ọ bụ ya mere ụmụ agbọghọ ji hụ gị n’anya.   Kpọrọ m;* ka anyị gbapụ. Eze akpọbatala m n’ime ime ụlọ ya. Ka anyị ṅụrịa ọṅụ ma mee onwe anyị obi ụtọ. Ka anyị kwuo banyere otú i si egosi m na ị hụrụ m n’anya karịa ikwu banyere mmanya. Ka a sịkwa ihe mere ha* ji hụ gị n’anya.   Ụmụ nwaanyị Jeruselem, adị m oji, ma m mara mma. M dị ka ụlọikwuu ndị Kida,+ m dịkwa ka ákwà ụlọikwuu+ Solomọn.   Unu elela m anya maka na m dị oji,N’ihi na anyanwụ agbajiela m. Ụmụnne m ndị nwoke wesara m iwe. Ha nyere m ọrụ ilekọta ubi vaịn,Ma elekọtaghị m ubi vaịn nke m.   Onye m hụrụ n’anya nke ukwuu,Gwa m ebe ị nọ na-azụ ìgwè atụrụ gị,+Ebe ị na-edu ha aga ka ha makpuru ala n’etiti ehihie. Gwa m, ka m ghara ị na-agagharị n’ebe ìgwè atụrụ ndị enyi gị nọKa nwaanyị ji ákwà kpuchie ihu ya.”   “Gị nwaanyị kacha ụmụ nwaanyị niile mma, ọ bụrụ na ị maghị ebe ọ nọ,Soro ụzọ ebe ìgwè atụrụ si agaDuru ìgwè ewu gị gaa n’ebe ndị na-azụ atụrụ mara ụlọikwuu, ka ha taa ahịhịa.”   “Onye m hụrụ n’anya, ị mara mma ka nne ịnyịnya* nke so n’ịnyịnya ndị na-adọkpụ ụgbọ ịnyịnya Fero.+ 10  Ọla ndị e ji achọ mma i yi* mere ka ntì gị maa mma,Ákà* ndị ị nya n’olu mekwara ka olu gị maa mma. 11  Anyị ga-eji ọlaedo rụọrọ gị ọla e ji achọ mma,Jirikwa ọlaọcha chọọ ha mma.” 12  “Mgbe eze nọ na tebụl ya dị gburugburu,Mmanụ m nke na-esi ísì ọma+ na-esipụta ísì. 13  Onye m hụrụ n’anya dị m ka akpa mea na-esi ísì ọma,+Nke na-adị n’agbata ara m abụọ chi abọọ. 14  Onye m hụrụ n’anya dị m ka ụyọkọ okooko osisi hena+Nke dị n’ubi vaịn ndị dị n’En-gedi.”+ 15  “Onye m hụrụ n’anya, ị mara mma. Ị mara ezigbo mma. Anya gị dị ka anya nduru.”+ 16  “Onye m hụrụ n’anya, ị mara mma.* Ị mara ezigbo mma.+ Anyị na-edina ala n’akwụkwọ ndụ. 17  E ji osisi sida rụọ ụlọ* anyị,E jikwa osisi junipa kụọ elu ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Sekpụrụ m.”
Ya bụ, ụmụ agbọghọ.
Ma ọ bụ “nne ịnyịnya m.”
O nwere ike ịbụ, “Isi ị kpara.”
Ma ọ bụ “Ihe olu.”
Ma ọ bụ “ị mara mma nwoke.”
Ma ọ bụ “ọmarịcha ụlọ.”