Abụ Solomọn 4:1-16

  • Onye na-azụ atụrụ (1-5)

    • “Onye m hụrụ n’anya, ị mara mma” (1)

  • Nwa agbọghọ Shulem (6)

  • Onye na-azụ atụrụ (7-16a)

    • “Nwaanyị m ga-alụ, i nwetala obi m” (9)

  • Nwa agbọghọ Shulem (16b)

4  “Onye m hụrụ n’anya, ị mara mma. Ị mara ezigbo mma. Anya gị, nke i kpuchiri ákwà, dị ka anya nduru. Ntutu isi gị dị ka ìgwè ewuNdị si n’ugwu ndị dị na Gilied na-agbadata.+   Ezé gị dị ọcha ka ìgwè nne atụrụ a ka kpachara ajị ọhụrụ,Ndị si n’ebe a sara ha ahụ́ na-apụta. Ha niile na-amụ ejima ejima. E nwebeghị nke ọ bụla n’ime ha nwa ya nwụrụ.   Egbugbere ọnụ gị dị ka eri na-acha uhie uhie,Ihe ị na-ekwu dịkwa ụtọ. Ntì gị abụọ, nke i kpuchiri ákwà,Dị ka pomigranet a pịwara abụọ.   Olu gị+ dị ka ụlọ elu Devid,+Nke e ji nkume ndị kwụ n’ahịrị rụọ,Bụ́ ebe e kokwasịrị otu puku ọta,Ya bụ, ọta niile dị okirikiri nke ndị dike.+   Ara gị abụọ yiri ụmụ ele abụọ,Bụ́ ụmụ ejima nne ele mụrụ,+Ndị na-ata ahịhịa n’ebe okooko lili juru.”   “Tupu oge ikuku ji eku eruo,* tupu onyinyo alakpuo,M ga-aga n’ugwu mea dịNakwa n’ugwu frankinsens dị.”+   “Onye m hụrụ n’anya, ị bụ sọ mma.+ I nweghị ntụpọ.   Nwaanyị m ga-alụ, ka anyị si na Lebanọn pụọ,Ka anyị si na Lebanọn pụọ.+ Si n’elu ugwu Amana gbadata. Si n’ọnụ ọnụ ugwu Sina, n’ọnụ ọnụ ugwu Hemọn,+N’ọgba ọdụm nakwa n’ugwu agụ owuru, gbadata.   Nwanne m nwaanyị, nwaanyị m ga-alụ, i nwetala obi m.+ Naanị otu anya i lere m na otu ihe i konyere n’ihe olu gịEmeela ka obi m dịrị n’ebe ị nọ. 10  Nwanne m nwaanyị, nwaanyị m ga-alụ, otú i si egosi m na ị hụrụ m n’anya enweghị atụ.+ Otú i si egosi m na ị hụrụ m n’anya na-atọ m ụtọ karịa mmanya.+ Mmanụ gị na-esi ísì ọma karịa ihe ọ bụla na-esi ísì ọma.+  11  Nwaanyị m ga-alụ, ezigbo mmanụ aṅụ si n’egbugbere ọnụ gị na-atasị.+ Mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi dịkwa n’okpuru ire gị.+ Ísì ọma nke na-esipụta n’uwe gị dịkwa ka ísì ọhịa Lebanọn. 12  Nwanne m nwaanyị, nwaanyị m ga-alụ, ị dị ka ubi a gbara ogige,Ubi a kpọchiri akpọchi, isi iyi a gbachiri ogige. 13  Ihe na-amị n’ubi gị mere ka ubi gị* dị ka paradaịs* nke osisi pomigranet juru,Ya na mkpụrụ osisi ndị kacha mma, na okooko osisi hena, na ahịhịa spaịknad na-esi ísì ọma, 14  Ahịhịa spaịknad+ na okooko safrọn, okpete na-esi ísì ọma+ na sinamọn,+Ya na ụdị osisi frankinsens niile, mea, na alo,+Nakwa ihe niile kacha esi ísì ọma.+ 15  Ị dị ka isi iyi dị n’ubi, olulu mmiri ezigbo mmiri dị na ya,Ị dịkwa ka iyi ndị na-asọ asọ si Lebanọn.+ 16  Ifufe nke si n’ebe ugwu, teta. Ifufe nke si n’ebe ndịda, fere bata. Jiri nwayọọ fee n’ubi m. Ka ísì ọma ya kusaa.” “Ka onye m hụrụ n’anya bata n’ubi yaMa taa ọmarịcha mkpụrụ osisi ya.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Tupu ụbọchị ekuwe ume.”
O nwere ike ịbụ, “Akpụkpọ ahụ́ gị.”
Ma ọ bụ “ubi.”