Abụ Solomọn 5:1-16

  • Onye na-azụ atụrụ (1a)

  • Ụmụ nwaanyị Jeruselem (1b)

    • ‘Ka ịhụnanya gbuo unu ka mmanya’

  • Nwa agbọghọ Shulem (2-8)

    • O kwuru ihe ọ rọrọ ná nrọ

  • Ụmụ nwaanyị Jeruselem (9)

    • “Olee ihe onye ị hụrụ n’anya ji kara nwoke ọ bụla ọzọ mma?”

  • Nwa agbọghọ Shulem (10-16)

    • “Ọ bụ ọpụrụiche n’ime puku ụmụ nwoke iri” (10)

5  “Nwanne m nwaanyị, nwaanyị m ga-alụ,Abatala m n’ubi m.+ Ewetala m mea na ahịhịa na-esi ísì ọma.+ Arachaala m mmanụ aṅụ m, mịchaakwa ụgbụgbọ ya. Aṅụọla m mmanya m na mmiri ara ehi m.”+ “Ndị enyi anyị, rienụ ihe. Ṅụọnụ mmanya, ka ịhụnanya gbuokwa unu ka mmanya.”+   “Ana m arahụ ụra, ma obi m na-awagharị.+ M wee nụ aka onye m hụrụ n’anya na-akụ n’ụzọ. ‘Nwanne m nwaanyị, onye m hụrụ n’anya, megheere m ụzọ,Nduru m, onye na-enweghị ntụpọ. N’ihi na igirigi edeela isi m. Igirigi nke dara n’abalị edeela ntutu isi m.’+   Eyipụla m uwe m. M̀ ga-eyiri ya ọzọ? Asaala m ụkwụ m. M̀ ga-emetọsị ya ọzọ?   Onye m hụrụ n’anya seere aka ya n’oghere ụzọ. O wee gụsiwe m ike ịhụ ya.   M biliri ọtọ ka m megheere onye m hụrụ n’anya ụzọ;Mmanụ mea esi n’aka m na-agụsị,Mmanụ mea esikwa ná mkpịsị aka m na-agụsị,Na-atasa n’ihe e ji kpọchie ụzọ.   M megheere onye m hụrụ n’anya ụzọ,Ma onye m hụrụ n’anya apụọla, ọ laala. Obi mapụrụ m mgbe ọ pụrụ.* M chọrọ ya, ma ahụghị m ya.+ M kpọrọ ya òkù, ma ọ zaghị m.   Ndị nche ndị na-agagharị n’obodo hụrụ m. Ha tiri m ihe. Ha merụrụ m ahụ́. Ndị na-eche nche ná mgbidi dọpụrụ m ákwà m wụkwasịrị n’ahụ́.   “Ụmụ nwaanyị Jeruselem, ṅụọrọnụ m iyiNa ọ bụrụ na unu ahụ onye m hụrụ n’anyaNa unu ga-agwa ya na anaghị m enweta onwe m maka na ọ nọghị m nso.”   “Gị nwaanyị kacha ụmụ nwaanyị niile mma,Olee ihe onye ị hụrụ n’anya ji kara nwoke ọ bụla ọzọ mma? Olee ihe onye ị hụrụ n’anya ji kara nwoke ọ bụla ọzọ mmaNke mere i ji agwa anyị ka anyị ṅụọ ụdị iyi a?” 10  “Onye m hụrụ n’anya bụ sọ mma, ahụ́ ya na-egbukekwa egbuke;*Ọ bụ ọpụrụiche n’ime puku ụmụ nwoke iri. 11  Isi ya mara mma ka ọlaedo, ka ọlaedo kacha mma. Ntutu isi ya dị ka igu nkwụ ifufe na-ebugharị,Ntutu isi ya dịkwa oji ka ugoloọma. 12  Anya ya yiri nduru ndị nọ n’akụkụ iyi,Ndị na-asa ahụ́ n’ime mmiri ara ehi,Ndị nọ n’akụkụ ọdọ mmiri nke mmiri juru. 13  Ntì ya dị ka ebe a kụrụ ahịhịa ndị na-esi ísì ọma,+Ka ubi a kụrụ ahịhịa ndị na-esi ísì ọma. Egbugbere ọnụ ya dị ka okooko lili, nke mmanụ mea si na ya na-atasị.+ 14  Mkpịsị aka ya dị ka ọlaedo, nke e ji nkume krisolaịt chọọ mma. Afọ ya dị ka ọdụ́ e ji safaya kpuchie. 15  Ụkwụ ya dị ka ogidi ndị e ji mabụl rụọ, ndị e jikwa ọlaedo kacha mma rụọ ebe ala ha. Ọ mara mma ka Lebanọn. O nweghị atụ ka osisi sida.+ 16  Ọnụ* ya dị ezigbo ụtọ. Ihe niile banyere ya magburu onwe ya.+ Ụmụ nwaanyị Jeruselem, ọ bụ onye a bụ onye m hụrụ n’anya. Ọ bụ ya bụ ọdị m n’obi.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “mgbe o kwuru okwu.”
Na Hibru, “na-acha uhie uhie.”
Na Hibru, “Okpo ọnụ.”