Abụ Solomọn 6:1-13

  • Ụmụ nwaanyị Jeruselem (1)

  • Nwa agbọghọ Shulem (2, 3)

    • “Abụ m nke onye m hụrụ n’anya, onye m hụrụ n’anya bụkwa nke m” (3)

  • Eze (4-10)

    • “Ị mara mma ka Teza” (4)

    • Ihe ụmụ nwaanyị kwuru (10)

  • Nwa agbọghọ Shulem (11, 12)

  • Eze (na ndị ọzọ) (13a)

  • Nwa agbọghọ Shulem (13b)

  • Eze (na ndị ọzọ) (13c)

6  “Nwaanyị kacha ụmụ nwaanyị niile mma,Olee ebe onye ị hụrụ n’anya gara? Olee ebe onye ị hụrụ n’anya gawara? Ka anyị soro gị chọwa ya.”   “Onye m hụrụ n’anya gawara n’ubi ya,N’ebe a kụrụ ahịhịa ndị na-esi ísì ọma. Ọ gara ka ọ zụọ atụrụ n’ubiNakwa ka ọ kụta okooko lili.+   Abụ m nke onye m hụrụ n’anya,Onye m hụrụ n’anya bụkwa nke m.+ Ọ na-azụ atụrụ n’ebe okooko lili dị.”+   “Onye m hụrụ n’anya,+ ị mara mma ka Teza.*+ Ị mara ezigbo mma ka Jeruselem.+ Ị mara nnọọ mma ka ndị agha gbakọtara ka ha gaa agha.+   Kwụsị ile m anya,+N’ihi na ọ na-eme ka ahụ́ ghara iru m ala. Ntutu isi gị dị ka ìgwè ewuNdị si na Gilied na-agbadata.+   Ezé gị dị ọcha ka ìgwè atụrụNdị si n’ebe a sara ha ahụ́ na-apụta. Ha niile na-amụ ejima ejima. E nwebeghị nke ọ bụla n’ime ha nwa ya nwụrụ.   Ntì gị abụọ i kpuchiri ákwàDị ka pomigranet a pịwara abụọ.   M nwere ndị nwunye iri isiiNa ndị iko nwaanyị iri asatọNa ụmụ agbọghọ ndị ọzọ a na-enweghị ike ịgụta ọnụ.+   Ma naanị otu onye bụ nduru m,+ onye na-enweghị ntụpọ. Ọ bụ ọpụrụiche n’anya nne ya. Ọ bụ ya ka onye mụrụ ya kacha hụ n’anya. Ụmụ agbọghọ hụrụ ya kpọọ ya onye obi ụtọ. Ndị nwunye eze na ndị iko eze jakwara ya mma. 10  ‘Ònye bụ nwaanyị a nke na-enwu* ka ìhè na-apụta mgbe chi na-abọ,Nke mara mma ka ọnwa gbazuru agbazu,Nke na-egbuke egbuke ka anyanwụ,Nke makwara nnọọ mma ka ndị agha gbakọtara ka ha gaa agha?’”+ 11  “Agbadara m n’ubi osisi ụkpa+Ka m hụ ihe ndị puru ọhụrụ na ndagwurugwu,Ka m hụ ma osisi vaịn ò puola,Ma osisi pomigranet ọ̀ maala ifuru. 12  Tupu m mara ihe na-eme,Agụụ ịhụ ihe ndị a mere ka m nọrọzieN’ebe ụgbọ ịnyịnya ndị a ma ama n’obodo anyị dị.” 13  “Lọghachi, lọghachi, nwa agbọghọ Shulem! Lọghachi, lọghachi,Ka anyị kirie gị!” “Gịnị mere unu ji na-ekiri nwa agbọghọ Shulem?”+ “O yiri ìgwè abụọ na-agba egwú.”*

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Ọmarịcha Obodo.”
Na Hibru, “nke na-eledata anya.”
Ma ọ bụ “yiri ndị na-agba egwú Mahaneyim.”