Diuterọnọmi 11:1-32

  • Unu ahụla otú Jehova si dị ukwuu (1-7)

  • Otú Ala Nkwa ahụ dị (8-12)

  • Uru irube isi ga-abara ndị Izrel (13-17)

  • Ndị Izrel kwesịrị ime ka okwu Chineke bamie n’obi ha (18-25)

  • ‘Ngọzi na ọbụbụ ọnụ’ (26-32)

11  “Hụnụ Jehova bụ́ Chineke unu n’anya,+ na-emenụ ihe ndị unu kwesịrị imere ya, na-edebenụ iwu ya, na-emekwanụ ihe ndị o kpebiri ka unu na-eme mgbe niile.  O doro unu anya taa na ọ bụ ununwa ka m na-agwa, ọ bụghị ụmụ unu ndị na-amaghị otú Jehova bụ́ Chineke unu si adọ mmadụ aka ná ntị,+ ndị na-ahụbeghịkwa aka ya siri ike,+ ike ya,+ na otú o si dị ebube.  Ha ahụghị ihe àmà ya na ihe ndị o mere Fero eze Ijipt nakwa ala Ijipt ya niile+  ma ọ bụ ihe o mere ndị agha Ijipt nakwa ịnyịnya Fero na ụgbọ ịnyịnya agha ya ndị mmiri Oké Osimiri Uhie riri mgbe ha na-achụ unu ọsọ, Jehova wee bibie ha kpamkpam.*+  Ha ahụghị ihe o meere* unu n’ala ịkpa ruo mgbe unu bịarutere ebe a  ma ọ bụ ihe o mere Detan na Abaịram bụ́ ụmụ Elayab nwa Ruben, mgbe ala meghere loo ha na ezinụlọ ha na ụlọikwuu ha nakwa ihe niile dị ndụ ha na ha nọ, n’ihu ndị Izrel niile.+  Unu ejirila anya unu hụ oké ihe niile Jehova mere.  “Debenụ iwu niile m na-enye unu taa, ka unu wee dị ike ma banye n’ala ahụ weghara ya,  nakwa ka unu wee bitee aka+ n’ala ahụ Jehova ṅụrụ iyi na ọ ga-enye nna nna unu hà na ụmụ* ha,+ ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.*+ 10  “Ala ahụ unu na-aga iweghara adịghị ka ala Ijipt unu si pụta, bụ́ ebe ọ na-abụ unu ghaa mkpụrụ, unu ana-arụgbu onwe unu n’ọrụ na-agba ya mmiri,* otú e si agba ubi akwụkwọ nri mmiri. 11  Kama ala unu na-abanye iweghara bụ ala ugwu na ndagwurugwu juru na ya.+ Mmiri na-esikwa n’eluigwe ede ya.+ 12  Ọ bụ ala Jehova bụ́ Chineke unu na-elekọta. Anya Jehova bụ́ Chineke unu dị na ya mgbe niile, si ná mmalite afọ ruo ná ngwụcha afọ. 13  Ọ bụrụ na unu agbasie mbọ ike na-erube isi n’iwu ndị m na-enye unu taa wee hụ Jehova bụ́ Chineke unu n’anya ma jiri obi unu niile na mkpụrụ obi* unu niile na-efe ya,*+ 14  m ga-emekwa ka mmiri zoo n’ala unu n’oge ya, ma n’ụbịa mmiri ma n’ụla mmiri. Unu ga-ekpokọta ọka* unu, bubatakwa mmanya ọhụrụ unu na mmanụ unu.+ 15  M ga-eme ka ahịhịa na-epu n’ala unu maka anụ ụlọ unu. Unu ga-erikwa ihe rijuo afọ.+ 16  Kpacharanụ anya ka unu ghara ikwe ka a rata unu* ka unu mehie, unu ewee fee chi ọzọ dị iche iche ma kpọọrọ ha isiala.+ 17  Ọ bụrụ na unu efee ha, Jehova ga-ewesa unu ezigbo iwe. Ọ ga-emechi eluigwe ka mmiri ghara izo,+ ala agaghịkwa emepụta ihe. Unu ga-anwụkwa ọsọ ọsọ n’ezigbo ala ahụ Jehova na-enye unu.+ 18  “Meenụ ka okwu ndị a m na-agwa unu bamie n’obi unu nakwa ná mkpụrụ obi* unu. Keekwanụ ha n’aka unu ka unu wee na-echeta ha. Ha ga-adị ka ihe unu na-ekegide n’egedege ihu unu.*+ 19  Kụzierenụ ha ụmụ unu. Na-ekwunụ banyere ha mgbe unu nọ ọdụ n’ụlọ unu na mgbe unu na-aga ije n’okporo ụzọ na mgbe unu dina ala nakwa mgbe unu biliri ọtọ.+ 20  Deenụ ha n’awara ụzọ ụlọ unu nakwa n’ọnụ ụzọ ámá unu, 21  ka unu na ụmụ unu wee bitee aka+ n’ala ahụ Jehova ṅụrụ iyi na ọ ga-enye nna nna unu hà,+ n’oge niile ụwa dị n’okpuru eluigwe. 22  “Ọ bụrụ na unu elezie anya na-edebe iwu a m na-enye unu ma na-eme ya, ka unu wee hụ Jehova bụ́ Chineke unu n’anya,+ na-eme ihe niile o kwuru, gharakwa ịhapụ ya,*+ 23  Jehova ga-achụpụrụ unu mba ndị a niile,+ unu ga-anapụkwa mba ndị dị ukwuu ma dị ọtụtụ karịa unu ala ha.+ 24  Ebe ọ bụla unu zọrọ ụkwụ ga-abụ nke unu.+ Ókè unu ga-amalite n’ala ịkpa ruo Lebanọn, malite n’Osimiri, ya bụ, Osimiri Yufretis, ruo n’oké osimiri dị n’ebe ọdịda anyanwụ.*+ 25  E nweghị onye ga-anọchiri unu ụzọ.+ Jehova bụ́ Chineke unu ga-eme ka ụjọ unu na egwu unu jide ndị bi n’ala niile unu ga-aga na ha,+ otú o kwere unu ná nkwa. 26  “Taa, e nwere ihe abụọ m chọrọ ka unu họrọ otu n’ime ha. Otu bụ ka a gọzie unu, nke ọzọ abụrụ ka a bụọ unu ọnụ:+ 27  a ga-agọzi unu ma unu rube isi n’iwu Jehova bụ́ Chineke unu nke m na-enye unu taa.+ 28  A ga-abụ unu ọnụ ma ọ bụrụ na unu erubeghị isi n’iwu Jehova bụ́ Chineke unu,+ ghara ime ihe m na-agwa unu taa ka unu na-eme ma fewe chi ọzọ ndị unu na-amaghị. 29  “Mgbe Jehova bụ́ Chineke unu ga-akpọba unu n’ala ahụ unu na-aga ibi na ya, ọ bụ n’Ugwu Gerizim ka unu ga-anọ gọzie ndị Izrel, nọrọ n’Ugwu Ịbal bụọ ndị Izrel ọnụ.+ 30  Ọ̀ bụ na ugwu ndị ahụ adịghị n’akụkụ nke ọzọ nke Osimiri Jọdan, n’ebe ọdịda anyanwụ, n’ala ndị Kenan ndị bi n’Araba, n’ebe chere Gilgal ihu, n’akụkụ nnukwu osisi ndị dị na More?+ 31  N’ihi na unu na-agafe Osimiri Jọdan ka unu banye weghara ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu.+ Mgbe unu ga-eweghara ya ma biri na ya, 32  lezienụ anya ka unu soro ntụziaka na iwu niile m na-enye unu taa.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “bibie ha ruo taa.”
Ma ọ bụ “ihe o mere.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.
Ma ọ bụ “unu ejiri ụkwụ unu na-agba ya mmiri.” O nwere ike ịbụ na e nwere ihe a rụrụ arụ ọ na-abụ ha na-azọ ya ụkwụ, mmiri ana-agbapụta, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha na-egwu ọwa mmiri ndị mmiri na-esi asọba n’ubi.
Na Hibru, “na-ejere ya ozi.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Na Hibru, “obi unu.”
Na Hibru, “n’agbata anya unu abụọ.”
Na Hibru, “raparakwa ya n’ahụ́.”
Ya bụ, Oké Osimiri Mediterenian.