Diuterọnọmi 12:1-32

  • Ndị Izrel ga-efe Chineke n’ebe ọ họọrọ (1-14)

  • Ndị Izrel nwere ike iri anụ, ma ha agaghị eri ọbara (15-28)

  • Unu ekwela ka a rata unu ife chi ọzọ (29-32)

12  “Ihe ndị a bụ ntụziaka na iwu ndị unu ga-elezi anya na-edebe n’oge niile unu ga-adị ndụ n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà ga-enye unu ka unu biri na ya.  Unu ga-ebibicha ebe niile mba ndị unu ga-anapụ ala ha na-anọ efe chi ha dị iche iche,+ ma ọ̀ bụ n’ugwu ndị dị elu ma ọ̀ bụ n’obere ugwu ma ọ̀ bụ n’okpuru nnukwu osisi ọ bụla na-ama pokopoko.  Unu ga-akwatu ebe ịchụàjà ha, kụrisịa ogidi arụsị ha,+ kpọọ ogwe osisi arụsị* ha ọkụ, gbutusịakwa arụsị ha a pịrị apị,+ wee mee ka a ghara ịnụkwa aha ha n’ebe ahụ.+  “Unu efela Jehova bụ́ Chineke unu otú ahụ.+  Kama, gaanụ fee Jehova bụ́ Chineke unu n’ebe ọ bụla ọ họọrọ ka a nọrọ na-eto aha ya n’ebo unu niile nakwa n’ebe ọ họọrọ ka ọ bụrụ ebe ọ ga-ebi.+  Ọ bụ n’ebe ahụ ka unu ga-eweta àjà unu a na-esu ọkụ,+ àjà unu ndị ọzọ, otu ụzọ n’ụzọ iri unu,+ onyinye unu kwere ná nkwa, onyinye si unu n’obi,+ anụmanụ ọ bụla ehi unu na ewu na atụrụ unu bu ụzọ mụọ,+ na onyinye ọ bụla ọzọ unu chọrọ inye.+  Unu na ndị ezinụlọ unu ga-anọ n’ebe ahụ rie ihe n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu+ ma ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe niile unu mere+ maka na Jehova bụ́ Chineke unu agọziela unu.  “Unu emela otú anyị na-eme n’ebe a taa, ya bụ, otú a onye ọ bụla na-eme ihe dị mma n’anya ya*  maka na unu abanyebeghị n’ebe unu ga-ezu ike+ nakwa n’ala unu ga-eketa, nke Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu. 10  Mgbe unu ga-agafe Osimiri Jọdan+ ma biri n’ala Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka unu biri, ọ ga-eme ka unu zuoro ndị iro unu niile gbara unu gburugburu ike, obi ga-erukwa unu ala.+ 11  Ọ bụ n’ebe Jehova bụ́ Chineke unu ga-ahọrọ ka a nọrọ na-eto aha ya+ ka unu ga-eweta ihe niile m na-enye unu n’iwu ka unu weta, ya bụ, àjà unu a na-esu ọkụ, àjà unu ndị ọzọ, otu ụzọ n’ụzọ iri unu,+ onyinye ọ bụla unu kwere Jehova ná nkwa, na onyinye ọ bụla ọzọ unu chọrọ inye. 12  Unu ga-aṅụrị ọṅụ n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu,+ unu na ụmụ unu ndị nwoke, ụmụ unu ndị nwaanyị, ohu unu ndị nwoke, ohu unu ndị nwaanyị, na onye Livaị nke bi n’obodo unu, ebe ọ bụ na e nweghị ihe ọ bụla o so unu keta.+ 13  Lezienụ anya ka unu ghara ịchụ àjà unu a na-esu ọkụ n’ebe ọ bụla ọzọ dị unu mma.+ 14  Unu ga-achụ àjà unu a na-esu ọkụ naanị n’ebe Jehova ga-ahọrọ n’otu n’ime ebo unu. Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka unu ga-eme ihe niile m na-enye unu n’iwu.+ 15  “Ma mgbe ọ bụla anụ gụrụ unu,* unu nwere ike iji otú Jehova bụ́ Chineke unu gọziruru unu n’obodo unu niile mara anụ ole unu ga-egbu rie.+ Onye dị ọcha na onye na-adịghị ọcha nwere ike iri ya, otú unu si eri ele ma ọ bụ mgbada. 16  Ma unu erila ọbara ya.+ Unu ga-awụpụ ya n’ala ka mmiri.+ 17  A gaghị ekwe ka unu nọrọ n’obodo unu dị iche iche rie otu ụzọ n’ụzọ iri nke ọka* unu, nke mmanya ọhụrụ unu, nke mmanụ unu, ma ọ bụ anụmanụ ọ bụla ehi unu na ewu na atụrụ unu bu ụzọ mụọ+ ma ọ bụ onyinye ọ bụla unu kwere ná nkwa, onyinye si unu n’obi, ma ọ bụkwanụ onyinye ọ bụla ọzọ unu chọrọ inye. 18  Unu ga-eri ha n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu n’ebe Jehova bụ́ Chineke unu ga-ahọrọ,+ unu na ụmụ unu ndị nwoke, ụmụ unu ndị nwaanyị, ohu unu ndị nwoke na ohu unu ndị nwaanyị, nakwa onye Livaị nke bi n’obodo unu. Unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu n’ihe niile unu na-eme. 19  Lezienụ anya ka unu ghara ichefu ndị Livaị+ n’oge niile unu ga-ebi n’ala unu. 20  “Mgbe Jehova bụ́ Chineke unu ga-eme ka ala unu bukwuo ibu+ otú o kwere unu ná nkwa,+ unu asị, ‘Anyị chọrọ ịta anụ,’ maka na anụ na-agụ unu,* unu nwere ike ịta anụ mgbe ọ bụla ọ gụrụ unu.*+ 21  Ọ bụrụ na ebe Jehova bụ́ Chineke unu họọrọ ka a nọrọ na-eto aha ya+ dị unu anya, unu ga-egbu ụfọdụ n’ime ìgwè ehi unu ma ọ bụ ụfọdụ n’ime ìgwè ewu na atụrụ unu ndị Jehova nyere unu, otú m nyere unu n’iwu, unu ga-anọkwa n’obodo unu rie ha mgbe ọ bụla ọ gụrụ unu.* 22  Unu nwere ike iri ya otú unu si eri ele na mgbada.+ Ma onye dị ọcha ma onye na-adịghị ọcha nwere ike iri ya. 23  Kpebisienụ ike na unu agaghị eri ọbara ya,+ n’ihi na ọbara ya bụ ndụ* ya.+ Unu erikọtakwala ndụ* ya na anụ ya. 24  Unu erila ya. Unu ga-awụpụ ya n’ala ka mmiri.+ 25  Unu erila ya, ka ihe wee gaziere unu na ụmụ unu ndị ga-anọchi unu maka na unu na-eme ihe dị mma n’anya Jehova. 26  Mgbe unu na-abịa n’ebe Jehova ga-ahọrọ, unu ga-eji naanị ihe ndị dị nsọ, ndị bụ́ nke unu, nakwa onyinye ndị unu kwere ná nkwa. 27  Ọ bụ n’ebe ahụ ka unu ga-achụ àjà unu ndị a na-esu ọkụ, ma anụ ha ma ọbara ha,+ n’ebe ịchụàjà Jehova bụ́ Chineke unu. A ga-awụpụkwa ọbara anụ unu ji chụọ àjà unu ndị ọzọ n’akụkụ ebe ịchụàjà+ Jehova bụ́ Chineke unu, ma unu nwere ike iri anụ ha. 28  “Lezienụ anya ka unu na-erube isi n’ihe a niile m na-enye unu n’iwu, ka ihe wee na-agaziri unu na ụmụ unu ndị ga-anọchi unu maka na unu na-eme ihe dị mma na ihe ziri ezi n’anya Jehova bụ́ Chineke unu. 29  “Mgbe Jehova bụ́ Chineke unu ga-ebibi mba ndị unu ga-anapụ ala ha,+ unu ga-ebiri n’ala ha. 30  Ma mgbe o bibichara ha, kpacharanụ anya ka unu ghara ime ihe ndị ha mere. Unu ajụla ase gbasara chi ha, sị, ‘Olee otú mba ndị a si fee chi ha dị iche iche? Anyị ga-emekwa ka ha.’+ 31  Unu emesola Jehova bụ́ Chineke unu otú ahụ n’ihi na ihe ha na-emere chi ha dị iche iche bụ ihe rụrụ arụ Jehova kpọrọ asị. Ha na-akpọdị ụmụ ha ndị nwoke na ụmụ ha ndị nwaanyị ọkụ iji chụọrọ chi ha àjà.+ 32  Unu ga-elezi anya na-eme ihe niile m na-enye unu n’iwu.+ Unu etinyela ihe na ya, unu ewepụkwala ihe na ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ihe o chere dị mma.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”