Diuterọnọmi 14:1-29

  • Ihe ndị a na-ekwesịghị ime mgbe a na-eru uju (1, 2)

  • Anụ ndị dị ọcha e nwere ike iri na ndị na-adịghị ọcha (3-21)

  • A ga-enye Jehova otu ụzọ n’ụzọ iri (22-29)

14  “Unu bụ ụmụ Jehova bụ́ Chineke unu. Unu ebekasịla ahụ́ unu,+ unu akpụchapụkwala ntutu dị n’ihu isi unu* n’ihi onye nwụrụ anwụ.+  N’ihi na unu bụụrụ Jehova bụ́ Chineke unu ndị dị nsọ.+ Jehova ahọrọkwala unu ka unu bụrụ ndị ya, ndị pụrụ iche n’ime ndị niile nọ n’ụwa.+  “Unu erila ihe ọ bụla rụrụ arụ.+  Ọ bụ anụmanụ ndị a ka unu nwere ike iri:+ ehi, atụrụ, ewu,  mgbada, anịgọ, mmoro, ewu ọhịa, ele, atụrụ ọhịa, na atụrụ na-ebi n’ugwu.  Unu nwere ike iri anụmanụ ọ bụla ọbụ ụkwụ ya kebiri abụọ nke na-atagharịkwa ọnụ.  Ma, unu erila anụmanụ ndị a na-atagharị ọnụ ma ọ bụ ndị ụkwụ ha kebiri abụọ: kamel, ùrúrù,* na ewi nkume, n’ihi na ha na-atagharị ọnụ, ma ọbụ ụkwụ ha ekebighị abụọ. Ha bụụrụ unu anụ na-adịghị ọcha.+  Unu erikwala ézì n’ihi na ọbụ ụkwụ ya kebiri abụọ, ma ọ naghị atagharị ọnụ. Ọ bụụrụ unu anụ na-adịghị ọcha. Unu erila anụ ha, unu emetụkwala ozu ha aka.  “N’ime anụ niile bi na mmiri, unu nwere ike iri ndị a: Unu nwere ike iri ihe ọ bụla nwere nku* na akpịrịkpa.+ 10  Ma, unu erila ihe ọ bụla na-enweghị nku* na akpịrịkpa. Ọ bụụrụ unu ihe na-adịghị ọcha. 11  “Unu nwere ike iri nnụnụ ọ bụla so ná nnụnụ dị ọcha. 12  Ma unu erila ndị a: ugo, ugo na-eri azụ̀, udele ojii,+ 13  égbé uhie, égbé ojii, ụdị ndagbù ọ bụla, 14  ụdị ugoloọma ọ bụla, 15  enyí nnụnụ, ikwiikwii, nnụnụ mmiri, ụdị agụ nkwọ ọ bụla, 16  ikwiikwii nta, ikwiikwii ntị ogologo, ọbọgwụ mmiri, 17  okwolo, udele, nnụnụ mmiri a na-akpọ kọmọrant, 18  ụgbala ọcha,* ụdị ụgbala mmiri ọ bụla, nnụnụ a na-akpọ huupu, na ụsụ. 19  Obere ụmụ anụmanụ* ọ bụla nwere nku bụụrụ unu anụ na-adịghị ọcha. A gaghị eri ha eri. 20  Unu nwere ike iri anụ ọ bụla na-efe efe bụ́ anụ dị ọcha. 21  “Unu erila anụ ọ bụla nwụrụ anwụ.+ Unu nwere ike inye ya onye mbịarambịa bi n’otu n’ime obodo unu, o nwekwara ike iri ya. Ma ọ bụ, e nwere ike iresị ya onye mba ọzọ. N’ihi na unu bụụrụ Jehova bụ́ Chineke unu ndị dị nsọ. “Esila nwa ewu n’ime mmiri ara nne ya.+ 22  “Unu ga-enyerịrị otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe niile mkpụrụ unu ghara n’ubi mịpụtara kwa afọ.+ 23  Unu ga-eri otu ụzọ n’ụzọ iri nke ọka* unu, nke mmanya ọhụrụ unu, nke mmanụ unu, na anụmanụ ndị ehi unu na ewu na atụrụ unu bu ụzọ mụọ. Unu ga-eri ha n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu, n’ebe ọ ga-ahọrọ ka a nọrọ na-eto aha ya,+ ka unu wee mụta ịtụ egwu Jehova bụ́ Chineke unu mgbe niile.+ 24  “Ma ọ bụrụ na unu ga-aga ogologo ije tupu unu eruo n’ebe Jehova bụ́ Chineke unu ga-ahọrọ ka a nọrọ na-eto aha ya,+ ya abụrụkwa na unu agaghị enwe ike ibu ihe ndị ahụ gaa n’ebe ahụ n’ihi na ebe ahụ dị unu anya (n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu ga-agọzi unu), 25  unu nwere ike ire ha, jiri ego unu retara gaa n’ebe ahụ Jehova bụ́ Chineke unu ga-ahọrọ. 26  Unu ga-ejizi ego ahụ zụta ihe ọ bụla dị unu* mma, ya bụ, ehi, atụrụ, ewu, mmanya na ihe ọ bụla ọzọ na-aba n’anya, nakwa ihe ọ bụla dị unu mma. Unu ga-erikwa ihe n’ebe ahụ n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu ma ṅụrịa ọṅụ, unu na ndị ezinụlọ unu.+ 27  Unu echefula onye Livaị bi n’obodo unu+ ebe ọ bụ na e nweghị ihe ọ bụla o so unu keta.+ 28  “Ná ngwụcha afọ atọ ọ bụla, unu ga-ewepụta otu ụzọ n’ụzọ iri niile nke ihe mkpụrụ unu ghara n’afọ ahụ mepụtara ma dosa ha n’obodo unu.+ 29  Onye Livaị, bụ́ onye na-esoghị unu keta ihe ọ bụla, na onye mbịarambịa, nwa na-enweghị nna,* nakwa nwaanyị di ya nwụrụ, bụ́ ndị bi n’obodo unu, ga-abịa rijuo afọ,+ ka Jehova bụ́ Chineke unu wee gọzie unu n’ihe niile unu na-eme.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “n’agbata anya unu abụọ.”
Anụmanụ a yiri òké bekee, ma ntị ya na ụkwụ ya na-adị ogologo karịa nke òké bekee.
Ma ọ bụ “ntù.”
Ma ọ bụ “ntù.”
Ma ọ bụ “shekeleke.”
Ma ọ bụ “Ahụhụ.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Ma ọ bụ “nwa na-enweghị nne na nna.”