Diuterọnọmi 17:1-20

  • E kwesịghị iji ihe nwere nkwarụ achụ àjà (1)

  • Ihe a ga-eme onye fere chi ọzọ (2-7)

  • Ihe a ga-eme ma okwu sie ike ikpebi (8-13)

  • Ihe eze ndị Izrel kwesịrị ime (14-20)

    • Eze ga-edepụtara onwe ya Iwu Chineke (18)

17  “Unu ejila ehi ma ọ bụ atụrụ nwere nkwarụ ma ọ bụ nke nwere nsogbu ọ bụla ọzọ chụọrọ Jehova bụ́ Chineke unu àjà, n’ihi na ọ ga-abụ arụ n’anya Jehova bụ́ Chineke unu.+  “Ọ bụrụ na a hụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị n’otu n’ime obodo unu ndị Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu nke na-eme ihe dị njọ n’anya Jehova bụ́ Chineke unu ma na-emebi ọgbụgba ndụ unu na Chineke,+  o wee mehie gaa fee chi ọzọ dị iche iche ma kpọọrọ ha isiala ma ọ bụ kpọọrọ anyanwụ ma ọ bụ ọnwa ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ dị n’eluigwe isiala,+ bụ́ ihe m na-enyeghị n’iwu,+  unu ga-eleba okwu ahụ anya nke ọma mgbe a kọọrọ ya unu ma ọ bụ mgbe unu nụrụ ya. Ọ bụrụ na a chọpụta n’eziokwu+ na e mere arụ a n’Izrel,  unu ga-akpọpụta nwoke ahụ ma ọ bụ nwaanyị ahụ nke mere ihe ọjọọ a n’ọnụ ụzọ ámá obodo unu. A ga-ejikwa nkume tụgbuo nwoke ahụ ma ọ bụ nwaanyị ahụ.+  A ga-egbu onye ahụ e kwesịrị igbu egbu ma mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ gbaa akaebe+ na o mere ihe ahụ. A gaghị egbu ya ma ọ bụrụ otu onye gbara akaebe.+  Ọ bụ ndị akaebe ahụ ga-ebu ụzọ tụọ ya nkume, ndị Izrel niile esorozie tụgbuo ya. Unu ga-ewepụ ihe ọjọọ n’obodo unu.+  “Ọ bụrụ na e nwee okwu siiri unu ezigbo ike ikpebi n’otu n’ime obodo unu, ma ọ̀ bụ okwu gbasara onye gburu mmadụ*+ ma ọ bụ onye gbara mmadụ akwụkwọ ma ọ bụ merụọ mmadụ ahụ́ ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na e nwere ihe ọzọ na-ese okwu, unu ga-ewere okwu ahụ gaa n’ebe Jehova bụ́ Chineke unu ga-ahọrọ.+  Gakwurunụ ndị nchụàjà, bụ́ ndị Livaị, nakwa onye bụ́ onyeikpe+ n’oge ahụ. Kọọrọnụ ha ihe merenụ. Ha ga-ekpebiri unu okwu ahụ.+ 10  Unu ga-eme ihe ha kpebiri bụ́ nke ha ga-agwa unu n’ebe ahụ Jehova họọrọ. Lezienụ anya ka unu mee ihe niile ha ga-agwa unu. 11  Meenụ ihe e kwuru n’iwu ha ga-egosi unu, meekwanụ ihe ha kpebiri nke ha ga-agwa unu.+ Unu ahapụla ihe ha kpebiri, bụ́ nke ha ga-agwa unu, mewe ihe ọzọ.+ 12  Onye ọ bụla mpako mere ka ọ ghara ige onye nchụàjà ntị, bụ́ onye na-ejere Jehova bụ́ Chineke unu ozi, ma ọ bụ ghara ige onyeikpe ntị, ga-anwụ.+ Unu ga-ewepụ ihe ọjọọ n’Izrel.+ 13  Mmadụ niile ga-anụ ya wee tụọ egwu, ha agaghịkwa adị mpako ọzọ.+ 14  “Mgbe unu ga-abanye n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu, unu eweghara ya ma biri na ya, unu asịzie, ‘Ka anyị họpụtara onwe anyị eze otú mba niile gbara anyị gburugburu mere,’+ 15  onye unu ga-eme eze ga-abụrịrị onye Jehova bụ́ Chineke unu họọrọ.+ Ọ bụ otu n’ime ụmụnne unu ka unu ga-eme eze. A gaghị ekwe ka unu mee onye mba ọzọ na-abụghị nwanne unu eze ga-achị unu. 16  Ma, eze ahụ agaghị enweta ọtụtụ ịnyịnya+ ma ọ bụ mee ka ndị Izrel laghachi n’Ijipt ka ha gaa nwetakwuo ịnyịnya+ n’ihi na Jehova gwara unu, sị, ‘Unu anwakwala anwa laghachi n’Ijipt.’ 17  Ọ gaghịkwa alụ ọtụtụ ụmụ nwaanyị, ka obi ya ghara ịpụ n’ebe m nọ.+ Ọ gaghịkwa akpakọju ọtụtụ ọlaọcha na ọlaedo.+ 18  Mgbe ọ ga-anọrọ n’ocheeze n’alaeze ya, ọ ga-elere anya n’akwụkwọ Iwu a, nke ndị nchụàjà bụ́ ndị Livaị ji, depụtara onwe ya Iwu a n’akwụkwọ.*+ 19  “Ọ ga-ejide akwụkwọ ahụ, ọ ga na-agụkwa ya n’oge niile ọ dị ndụ,+ ka o wee mụta ịtụ egwu Jehova bụ́ Chineke ya, na-emekwa ihe niile e kwuru n’Iwu a ma soro ntụziaka ndị a.+ 20  Ọ bụrụ na o mee ihe a, ọ gaghị eche na ya ka ụmụnne ya mma, ọ gaghịkwa ahapụ ihe ndị a e nyere n’iwu mewe ihe ọzọ, ka o wee chịtee aka n’alaeze ya n’Izrel, ma ya ma ụmụ ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “wụfuru ọbara.”
Ma ọ bụ “n’akwụkwọ mpịakọta.”