Diuterọnọmi 19:1-21

  • Ikpe ọbara ịma mmadụ nakwa obodo mgbaba (1-13)

  • E kwesịghị iwela ihe e ji kpaa ókè azụ (14)

  • Ịgba akaebe mgbe a na-ekpe ikpe (15-21)

    • A ga-eji akaebe mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ bie okwu (15)

19  “Mgbe Jehova bụ́ Chineke unu ga-ebibi mba ndị Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ala ha, unu ewee chụpụ ha ma biri n’obodo ha nakwa n’ụlọ ha,+  unu ga-ewepụta obodo atọ n’ala unu nke Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka unu biri.+  Unu ga-eke ala Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu ka unu biri ụzọ atọ, doziekwa ụzọ e si aga na ha ka onye gburu mmadụ nwee ike ịgbaga n’otu n’ime obodo ndị ahụ.  Ihe a bụ ihe onye gburu mmadụ, bụ́ onye nwere ike ịgbaga ebe ahụ, ga-eme ka o wee dịrị ndụ: Ọ bụrụ na o gburu mmadụ ibe ya n’amaghị ụma, ya abụrụkwa na ọ kpọbughị onye ahụ asị,+  dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ya na mmadụ ibe ya abanye n’ọhịa ịkpata nkụ, ya ewelie aka ya ka o jiri anyụike gbutuo osisi, ma isi anyụike ahụ efepụ n’osisi ya kụgbuo mmadụ ibe ya, onye ahụ gburu ya kwesịrị ịgbaga n’otu n’ime obodo ndị a ka o wee dịrị ndụ.+  Ma ọ́ bụghị ya, onye na-abọrọ onye nwụrụ anwụ ọbọ+ nwere ike iji iwe chụwa onye ahụ gburu mmadụ, chụkwute ya ma gbuo ya maka na obodo ọ na-agbaga dị ezigbo anya. Ma, ebe ọ bụ na ọ kpọbughị onye ahụ asị,+ o kwesịghị ịnwụ.  Ọ bụ ya mere m ji na-enye unu iwu, sị: ‘Wepụtanụ obodo atọ.’  “Ọ bụrụ na Jehova bụ́ Chineke unu emee ka ala unu sakwuo mbara otú ọ ṅụụrụ nna nna unu hà n’iyi,+ nyekwa unu ala niile o kwere nkwa inye nna nna unu hà,+  (ma ọ bụrụhaala na unu ejiri obi unu niile na-eme ihe a niile m na-enye unu n’iwu taa, ya bụ, ịhụ Jehova bụ́ Chineke unu n’anya na ime ihe o kwuru mgbe niile)+ unu ga-ewepụtazi obodo atọ ọzọ n’elu obodo atọ ndị a.+ 10  Ihe a ga-eme ka a ghara igbu* onye aka ya dị ọcha+ n’ala unu nke Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka ọ bụrụ nke unu. Ikpe ọbara agaghịkwa ama unu.+ 11  “Ma, ọ bụrụ na mmadụ kpọrọ mmadụ ibe ya asị+ wee chechie ya, lụso ya* ọgụ ma kụgbuo ya, o wee gbaga n’otu n’ime obodo ndị a, 12  ndị okenye obodo ya ga-ezi ozi ka e si ebe ahụ kpọpụta ya. Ha ga-enyefe ya n’aka onye na-abọrọ onye nwụrụ anwụ ọbọ, ọ ga-egbukwa ya.+ 13  Unu* agaghị emere ya ebere. Unu ga-emekwa ka ikpe ọbara onye aka ya dị ọcha ghara ịma ndị Izrel,+ ka ihe wee gaziere unu. 14  “Mgbe unu ga-enweta ebe unu ketara n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu ga-enye unu ka unu biri, unu ewelala ihe e ji kpaa ókè n’ala onye agbata obi unu azụ+ wee mee ka ọ gharazie ịdị n’ebe nna nna unu hà kpara ókè. 15  “A gaghị ama mmadụ ikpe ma ọ bụrụ naanị otu onye gbara akaebe na o mere mmehie ma ọ bụ na ọ dara iwu.+ A ga-esi n’àmà* ndị akaebe abụọ ma ọ bụ n’àmà ndị akaebe atọ gbara mara na okwu ahụ bụ eziokwu.+ 16  Ọ bụrụ na onye chọrọ ịrụsa mmadụ arụrụala agbaa akaebe wee bo onye ahụ ebubo na e nwere iwu ọ dara,+ 17  mmadụ abụọ ahụ na-ese okwu ga-eguzo n’ihu Jehova, n’ihu ndị nchụàjà nakwa n’ihu ndị ikpe bụ́ ndị ga na-eje ozi n’oge ahụ.+ 18  Ndị ikpe ahụ ga-eleba okwu ahụ anya nke ọma.+ Ọ bụrụ na onye ahụ gbara akaebe ghara ụgha, ọ bụrụkwa na ọ bụ ebubo ụgha ka o boro nwanne ya, 19  unu ga-eme ya ihe ahụ ọ kpara nkata ime nwanne ya,+ unu ga-ewepụkwa ihe ọjọọ n’obodo unu.+ 20  Ndị fọrọ ga-anụ ya wee tụọ egwu, ha agaghịkwa eme ụdị ihe ọjọọ a ọzọ n’obodo unu.+ 21  Unu* agaghị emere ya ebere:+ Onye gburu mmadụ,* a ga-egbu ya. Onye kụkpọrọ mmadụ anya, a ga-akụkpọ ya anya. Onye kụpụrụ mmadụ ezé, a ga-akụpụ ya ezé. Onye gbajiri mmadụ aka, a ga-agbaji ya aka. Onye gbajiri mmadụ ụkwụ, a ga-agbaji ya ụkwụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ịwụfu ọbara.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
Na Hibru, “Anya unu.”
Na Hibru, “n’ọnụ.”
Na Hibru, “Anya unu.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”