Diuterọnọmi 22:1-30

  • Ihe mmadụ ga-emere anụmanụ onye agbata obi ya (1-4)

  • Nwaanyị ekwesịghị iyi ákwà nwoke (5)

  • Imere ụmụ anụmanụ ebere (6, 7)

  • Ịrụbichi ihe n’elu ụlọ (8)

  • Ihe ndị na-ekwesịghị ịgakọ (9-11)

  • Ndị Izrel ga-adụnye ihe dị yọrị yọrị n’isi ákwà ha (12)

  • Iwu e nyere gbasara inwe mmekọahụ na-ekwesịghị ekwesị (13-30)

22  “Ọ bụrụ na ị hụ ehi nwanne gị ma ọ bụ atụrụ ya ka ọ na-akpafu, amala ụma hapụ ya.+ Hụ na ị kpụghachiiri ya nwanne gị.  Ma, ọ bụrụ na nwanne gị ebighị gị nso ma ọ bụ na ị maghị onye ọ bụ, ị ga-akpụrụ anụ ahụ lọta n’ụlọ gị. Ọ ga-anọkwa n’ụlọ gị ruo mgbe nwanne gị chọọrọ ya bịa. Ị ga-akpụrụzi ya kpụnye ya.+  Ọ bụ ihe ị ga-eme ma ị hụ jakị ya, ákwà ya ma ọ bụ ihe ọ bụla furu efu bụ́ nke nwanne gị. Ahapụla ya.  “Ọ bụrụ na ị hụ jakị nwanne gị ma ọ bụ ehi ya ka ọ dara n’ụzọ, amala ụma hapụ ya. Hụ na i nyeere nwanne gị aka mee ka anụmanụ ahụ bilie.+  “Nwaanyị ekwesịghị iyi ákwà nwoke, nwoke ekwesịghịkwa iyi ákwà nwaanyị. N’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu kpọrọ onye ọ bụla nke na-eme otú ahụ asị.  “Ọ bụrụ na ị na-aga n’ụzọ hụ akwụ́ nnụnụ nke ụmụ nnụnụ ma ọ bụ àkwá nnụnụ dị n’ime ya, ma ị̀ hụrụ ya n’elu osisi ma ọ̀ bụ n’ala, ya abụrụkwa na nne nnụnụ ahụ kpu n’elu ụmụ ya ma ọ bụ n’elu àkwá ndị ahụ, anwụrụkọtala nne nnụnụ ahụ na ụmụ ya.+  Hụ na ị chụpụrụ nne nnụnụ ahụ, ma i nwere ike ịnwụrụ ụmụ ya. Mee ihe a ka ihe wee gaziere gị, ka ị dịteekwa ndụ aka.  “Ọ bụrụ na ị rụọ ụlọ ọhụrụ, rụbichie ihe n’elu ụlọ ahụ+ ka mmadụ ghara isi na ya dapụ, ikpe ọbara ama ezinụlọ gị.  “Aghala ụdị mkpụrụ abụọ n’ubi vaịn gị.+ I mee otú ahụ, ihe niile mkpụrụ ị ghara mịrị na ihe ubi vaịn gị mepụtara ga-abụzi maka ebe nsọ. 10  “Ejikọtala ehi na jakị ọnụ jiri ha kọọ ihe.+ 11  “Eyila uwe e ji ajị anụ na eri linin e jikọtara ọnụ kpaa.+ 12  “Ị ga-adụnye ihe dị yọrị yọrị n’isi anọ nke ákwà ị na-eyi.+ 13  “Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwunye, ya na ya enwee mmekọahụ, ma ya emechaa kpọọ nwaanyị ahụ asị,* 14  wee bo ya ebubo na o mere ihe ọjọọ, mebiekwa aha ya, sị, ‘M lụrụ nwaanyị a, ma mgbe mụ na ya nwere mmekọahụ, ahụghị m ihe gosiri na ọ mabeghị nwoke,’ 15  nne na nna nwa agbọghọ ahụ ga-ewetara ndị okenye nọ n’ọnụ ụzọ ámá obodo ihe gosiri na nwa ha nwaanyị ahụ amabeghị nwoke. 16  Nna nwa agbọghọ ahụ ga-agwa ndị okenye ahụ, sị, ‘Akpọnyere m nwoke a nwa m nwaanyị ka ọ lụwa, ma ọ kpọọla ya asị,* 17  na-ebokwa ya ebubo na o mere ihe ọjọọ, sị: “Achọpụtala m na e nweghị ihe gosiri na nwa gị nwaanyị amabeghị nwoke.” Lekwanụ ihe gosiri na nwa m nwaanyị amabeghị nwoke.’ Nne na nna nwa agbọghọ ahụ ga-agbasazi ákwà ahụ n’ihu ndị okenye obodo ahụ. 18  Ndị okenye obodo ahụ+ ga-akpọrọ nwoke ahụ taa ya ahụhụ.+ 19  Ha ga-eri ya iwu otu narị (100) shekel* ọlaọcha ma were ya nye nna nwa agbọghọ ahụ, n’ihi na nwoke ahụ mebiri aha nwa agbọghọ Izrel na-amaghị nwoke.+ Ọ ka ga-abụkwa nwunye ya. A gaghị ekwe ka ọ gbaa nwaanyị ahụ alụkwaghịm n’oge niile ọ dị ndụ. 20  “Ma ọ bụrụ na ebubo ahụ bụ eziokwu, ya abụrụkwa na e nweghị ihe gosiri na nwa agbọghọ ahụ amabeghị nwoke, 21  ha ga-akpọpụta nwa agbọghọ ahụ n’ọnụ ụzọ ụlọ nna ya. Ụmụ nwoke obodo ha ga-eji nkume tụgbuo ya maka na ọ kwara iko* n’ụlọ nna ya+ wee mechuo ndị Izrel ihu.+ Unu ga-esi otú a wepụ ihe ọjọọ n’obodo unu.+ 22  “Ọ bụrụ na a hụ ka nwoke na nwunye nwoke ọzọ na-enwe mmekọahụ, a ga-egbukọta ha abụọ, ma nwoke ahụ ma nwaanyị ahụ ya na ya nwere mmekọahụ.+ Unu ga-esi otú a wepụ ihe ọjọọ n’Izrel. 23  “Ọ bụrụ na nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nwere nwoke kwere ya nkwa na ọ ga-alụ ya, ma nwoke ọzọ ahụ ya n’obodo, ya na ya enwee mmekọahụ, 24  unu ga-akpọpụta ha abụọ n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ ma jiri nkume tụgbuo ha. Nwa agbọghọ ahụ ga-anwụ maka na o tighị mkpu n’obodo, nwoke ahụ ga-anwụkwa maka na o merụrụ nwunye nwoke ibe ya.+ Unu ga-esi otú a wepụ ihe ọjọọ n’obodo unu. 25  “Ma, ọ bụrụ na ọ bụ n’ọhịa ka nwoke ahụ hụrụ nwa agbọghọ onye ọzọ kwere nkwa na ọ ga-alụ, nwoke ahụ abagide ya ma dinaa ya, ọ bụ naanị nwoke ahụ dinara ya ga-anwụ. 26  Unu emela nwa agbọghọ ahụ ihe ọ bụla. Nwa agbọghọ ahụ emeghị mmehie kwesịrị ọnwụ. Ihe a merenụ yiri ebe mmadụ lụsoro mmadụ ibe ya ọgụ ma gbuo ya.+ 27  Ọ bụ n’ọhịa ka nwoke ahụ hụrụ ya. Nwa agbọghọ ahụ onye ọzọ kwere nkwa ịlụ tiri mkpu, ma e nweghị onye nọnụ ga-anapụta ya. 28  “Ọ bụrụ na nwoke hụrụ nwa agbọghọ na-enwebeghị onye kwere ya nkwa na ọ ga-alụ ya, ya abagide nwa agbọghọ ahụ dinaa ya, e wee chọpụta ihe merenụ,+ 29  nwoke ahụ dinara ya ga-enye nna nwa agbọghọ ahụ shekel ọlaọcha iri ise. Nwa agbọghọ ahụ ga-abụzi nwunye ya.+ Ebe ọ bụ na o merụrụ nwa agbọghọ ahụ, a gaghị ekwe ka ọ gbaa ya alụkwaghịm n’oge niile ọ dị ndụ. 30  “E nweghị nwoke kwesịrị ịlụrụ nwunye nna ya, ka ọ ghara ịkparị nna ya.*+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ya emechaa jụ nwaanyị ahụ.”
Ma ọ bụ “ọ jụla ya.”
Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “gbara akwụna.”
Na Hibru, “ghara ịchịli uwe mwụda nna ya elu.”