Diuterọnọmi 23:1-25

  • Ndị na-ekwesịghị iso n’ọgbakọ Chineke (1-8)

  • Ihe ndị Izrel ga-eme ka ebe ha mara ụlọikwuu dị ọcha (9-14)

  • Ihe a ga-eme ohu gbapụrụ n’aka nna ya ukwu (15, 16)

  • E nweghị onye Izrel ga-abụ akwụna (17, 18)

  • Ịna ọmụrụ nwa na imezu nkwa (19-23)

  • Ihe onye na-agafe n’ubi mmadụ nwere ike iri (24, 25)

23  “E nweghị nwoke a pịrị amụ, ya bụ, nke a kụpịara mkpụrụ amụ ya, ma ọ bụ nke e bepụrụ ihe o ji bụrụ nwoke ga-eso n’ọgbakọ Jehova.+  “E nweghị nwa a kwatara n’iko ga-eso n’ọgbakọ Jehova.+ Nwa ya ọ bụla agaghị eso n’ọgbakọ Jehova, ruokwa n’ọgbọ nke iri n’ụmụ ya.  “E nweghị onye Amọn ma ọ bụ onye Moab ga-eso n’ọgbakọ Jehova.+ E nweghị mgbe nwa ha ọ bụla ga-eso n’ọgbakọ Jehova, ruokwa n’ọgbọ nke iri n’ụmụ ha,  n’ihi na ha ewetaraghị unu nri na mmiri mgbe unu si n’Ijipt na-apụta+ nakwa n’ihi na ha goro Belam nwa Biọ, onye Pitọ nke dị na Mesopotemia, ka ọ bụọ unu ọnụ.*+  Ma, Jehova bụ́ Chineke unu egeghị Belam ntị.+ Kama Jehova bụ́ Chineke unu mere ka ọnụ ọ gaara abụ unu bụrụzie ngọzi,+ n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu hụrụ unu n’anya.+  Ya enwela mgbe unu ga-eme ihe ga-eme ka udo dịrị ha ma ọ bụ ihe ga-eme ka ihe dịrị ha ná mma n’oge niile unu dị ndụ.+  “Akpọla onye Ịdọm asị, n’ihi na ọ bụ nwanne gị.+ “Akpọla onye Ijipt asị, n’ihi na ị bụbu onye mbịarambịa n’obodo ya.+  Ọgbọ nke atọ n’ụmụ ha, ya bụ, ụmụ ụmụ ụmụ ha, nwere ike iso n’ọgbakọ Jehova.  “Mgbe unu mara ụlọikwuu ka unu lụso ndị iro unu agha, unu emela ihe ọ bụla dị njọ.*+ 10  Ọ bụrụ na nwoke adịghị ọcha maka na ọbara ọcha gbapụtara ya n’ahụ́ n’abalị,+ ọ ga-esi n’ebe unu mara ụlọikwuu pụọ, ọ gaghịkwa abataghachi na ya. 11  Ná mgbede, ọ ga-eji mmiri saa ahụ́. O nweziri ike ịbataghachi n’ebe unu mara ụlọikwuu mgbe anyanwụ dara.+ 12  A ga-ewepụta ebe unu ga na-aga mposi n’ebe dị anya n’ebe unu mara ụlọikwuu. Ọ bụ ebe ahụ ka unu ga na-aga. 13  Mbazụ* so n’ihe unu ga-enwe. Mgbe unu ga-etukwuru ná mpụga ebe ahụ ka unu nyụọ nsị, unu ga-eji ya gwuo ala, unu ga-ekpochikwa nsị unu. 14  N’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu na-agagharị n’ebe unu mara ụlọikwuu+ ka ọ napụta unu ma nyefee ndị iro unu n’aka unu. Ebe unu mara ụlọikwuu kwesịrị ịdị nsọ,+ ka ọ ghara ịhụ ihe ọ bụla na-adịghị mma n’ebe unu nọ, ya akwụsị iso unu. 15  “Ọ bụrụ na ohu agbapụ n’aka nna ya ukwu gbakwute gị, enyefela ya n’aka nna ya ukwu. 16  O nwere ike iso unu biri n’ebe ọ bụla masịrị ya n’otu n’ime obodo unu nke ọ họọrọ. Emegbula ya.+ 17  “E nweghị nwaanyị ọ bụla bụ́ onye Izrel ga-abụ akwụna,*+ e nweghịkwa nwoke ọ bụla bụ́ onye Izrel ga-abụ akwụna.+ 18  Ewebatala ego a kwụrụ nwaanyị na-agba akwụna ma ọ bụ ego a kwụrụ nwoke na-agba akwụna* n’ụlọ Jehova bụ́ Chineke unu ka i jiri ya mezuo nkwa i kwere, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu kpọrọ ndị ahụ asị. 19  “Agwala nwanne gị ka ọ kwụọ ọmụrụ nwa,+ ma ọ̀ bụ ịkwụ ọmụrụ nwa n’ego ma ọ̀ bụ n’ihe oriri ma ọ̀ bụ n’ihe ọ bụla e nwere ike ịgwa mmadụ ka ọ kwụọ ọmụrụ nwa na ya. 20  I nwere ike ịgwa onye mba ọzọ ka ọ kwụọ gị ọmụrụ nwa,+ ma agwala nwanne gị ka ọ kwụọ gị ọmụrụ nwa,+ ka Jehova bụ́ Chineke gị wee gọzie gị n’ihe ọ bụla ị ga-eme n’ala unu na-aga iweghara.+ 21  “Ọ bụrụ na i kwe Jehova bụ́ Chineke gị nkwa,+ egbula oge imezu ihe i kwere ná nkwa.+ N’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị ga-achọrịrị ka i mezuo ya. Ọ bụrụ na i mezughị ya, i mehiela.+ 22  Ma, ọ bụrụ na i kweghị nkwa, e nweghị mmehie i mere.+ 23  I kwesịrị imezu ihe ọ bụla i kwuru.+ Ị ga-enyekwa Jehova bụ́ Chineke gị onyinye ọ bụla si gị n’obi nke i kwere nkwa na ị ga-enye ya.+ 24  “Ọ bụrụ na ị banye n’ubi vaịn onye agbata obi gị, i nwere ike ịracha mkpụrụ vaịn ole ga-eju gị* afọ, ma i kwesịghị itinye nke ọ bụla n’akpa gị.+ 25  “Ọ bụrụ na ị banye n’ubi ọka onye agbata obi gị, i nwere ike iji aka ghọrọ ọka chara acha, ma i kwesịghị iji mma e ji ewe ihe ubi gburu ọka onye agbata obi gị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ka ọ kpọọ unu iyi.”
Ma ọ bụ “ihe ọ bụla ga-emerụ unu.”
Ma ọ bụ “Obere ọ́gụ̀.”
Ma ọ bụ “onye na-agba akwụna n’ụlọ arụsị.” O nwere ike ịbụ na ịgba akwụna a bụ ụdị nke e ji efe chi dị iche iche.
Na Hibru, “ego e retara ná nkịta.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị”