Diuterọnọmi 25:1-19

  • Ọnụ ụtarị ole e nwere ike ịpịa mmadụ (1-3)

  • Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha ọka (4)

  • Mmadụ ikuchi nwunye nwanne ya nwoke (5-10)

  • A gaghị anwụchi nwoke na-alụ ọgụ n’ihe o ji bụrụ nwoke (11, 12)

  • Ezigbo ihe e ji atụ̀ ihe (13-16)

  • Ndị Izrel kwesịrị ibibi ndị Amalek (17-19)

25  “Ọ bụrụ na mmadụ abụọ esee okwu, ha nwere ike ịgakwuru ndị ikpe.+ Ndị ikpe ga-ekpere ha ikpe ma kpebie onye nke aka ya dị ọcha na onye nke mere ihe na-adịghị mma.+  Ọ bụrụ na e kwesịrị ịpịa onye nke mere ihe na-adịghị mma ihe,+ onyeikpe ga-eme ka o dinara ala, a ga-anọkwa n’ihu onyeikpe ahụ pịa ya ihe. Ihe a ga-eji mara ọnụ ụtarị ole a ga-apịa ya bụ otú ihe o mere dịruru njọ.  E nwere ike ịpịaru ya ọnụ ụtarị iri anọ,+ ma ọ gaghị akarị iri anọ. Ọ bụrụ na a pịa ya karịa ole a, a ga-emenye nwanne gị ihere n’ihu unu.  “Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha ọka.*+  “Ọ bụrụ na ụmụnne bikọtara ọnụ, otu n’ime ha anwụọ n’amụtaghị nwa nwoke, nwunye onye ahụ nwụrụ anwụ agaghị alụ nwoke si n’ezinụlọ ọzọ. Nwanne di ya ga-agakwuru ya, kpọrọ ya ka ọ bụrụ nwunye ya ma kuchie ya.+  Nwa nwoke mbụ nwaanyị ahụ ga-amụ ga-aza aha nwanne ya nwoke nwụrụ anwụ,+ ka aha ya ghara ifu n’Izrel.+  “Ma ọ bụrụ na nwoke ahụ achọghị ịlụ nwunye nwanne ya nwụrụ anwụ, nwunye nwanne ya ahụ ga-agakwuru ndị okenye n’ọnụ ụzọ ámá obodo ma sị, ‘Nwanne di m jụrụ ime ka aha nwanne ya nwoke ghara ifu n’Izrel. O kweghị ekuchi m.’  Ndị okenye obodo ha ga-akpọ nwoke ahụ gwa ya okwu. Ọ bụrụ na o sie ọnwụ, sị, ‘Achọghị m ịlụ ya,’  nwunye nwanne ya nwụrụ anwụ ga-abịakwute ya n’ihu ndị okenye ahụ, yipụ ya otu akpụkpọ ụkwụ ya,+ gbụọ ya asọ mmiri n’ihu ma sị, ‘Ọ bụ ihe a ka a ga-eme nwoke na-ekweghị eme ka ámá nwanne ya nwoke ghara ichi.’ 10  Ihe a ga-ejizi mara ezinụlọ ya n’Izrel bụ ‘Ezinụlọ onye e yipụrụ akpụkpọ ụkwụ ya.’ 11  “Ọ bụrụ na ụmụ nwoke abụọ na-alụ ọgụ, nwunye otu n’ime ha abịa ịnapụta di ya n’aka onye na-eti ya ihe, nwaanyị ahụ wee matịa aka jide nwoke ahụ n’ihe o ji bụrụ nwoke, 12  unu ga-egbupụ nwaanyị ahụ aka. Unu* emerela ya ebere. 13  “Enwela ụdị nkume abụọ e ji atụ̀ ihe n’akpa gị,+ nke ukwu na nke nta. 14  Enwela ụdị efere abụọ e ji atụ̀ ihe*+ n’ụlọ gị, nke ukwu na nke nta. 15  Ị ga-enwe ezigbo ihe e ji atụ̀ ihe nke zuru ezu, nweekwa ezigbo efere e ji atụ̀ ihe nke zuru ezu, ka i wee dịtee ndụ aka n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị.+ 16  N’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị kpọrọ onye ọ bụla na-aghọ aghụghọ, nke na-eme ihe ndị a, asị.+ 17  “Chetanụ ihe ndị Amalek mere unu n’ụzọ mgbe unu si n’Ijipt na-apụta,+ 18  otú ha si zute unu n’ụzọ ma lụso ndị niile nọ n’azụ azụ na-anaghị agasi ike agha, mgbe ike gwụrụ unu. Ha atụghị egwu Chineke. 19  Mgbe Jehova bụ́ Chineke unu mere ka unu zuoro ndị iro unu niile gbara unu gburugburu ike n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka ọ bụrụ nke unu,+ unu ga-ekpochapụ ndị Amalek ka a ghara ịnụkwa aha ha n’ụwa.*+ Unu echefula.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Na Hibru, “Anya unu.”
Na Hibru, “ụdị efa abụọ.” Gụọ B14.
Na Hibru, “n’okpuru eluigwe.”