Diuterọnọmi 29:1-29

  • Ndụ Chineke na ndị Izrel gbara na Moab (1-13)

  • A dọrọ ndị Izrel aka ná ntị ka ha ghara inupụ isi (14-29)

    • Ihe ndị e zoro ezo na ndị nke e mere ka a mata (29)

29  Ihe ndị a bụ okwu Jehova nyere Mosis n’iwu ka ọ gwa ndị Izrel mgbe ya na ha gbara ndụ na Moab, ma e wepụ ọgbụgba ndụ ya na ha gbara na Horeb.+  Mosis wee kpọkọta ndị Izrel niile, sị ha: “Unu ahụla ihe niile Jehova mere Fero n’Ijipt, ya na ndị niile na-ejere ya ozi nakwa ala ya niile n’ihu unu,+  nnukwu ahụhụ a tara ha unu ji anya unu hụ, nnukwu ihe àmà na ọrụ ebube ndị ahụ.+  Ma ruo taa, Jehova enyebeghị unu obi unu ga-eji na-aghọta ihe na anya unu ga-eji na-ahụ ụzọ na ntị unu ga-eji na-anụ ihe.+  ‘N’ime afọ iri anọ m nọ na-edu unu n’ala ịkpa,+ uwe unu yi n’ahụ́ akaghị nká, akpụkpọ ụkwụ unu yi n’ụkwụ akaghịkwa nká.+  Unu erighị achịcha, unu aṅụghịkwa mmanya ma ọ bụ ihe ọ bụla na-aba n’anya, ka unu wee mara na abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.’  Unu mechara rute ebe a. Saịhọn eze Heshbọn+ na Ọg eze Beshan+ pụtakwara ka ha lụso anyị agha, ma anyị meriri ha.+  Mgbe e mechara, anyị weghaara ala ha ma nye ya ụmụ Ruben, ụmụ Gad, na ọkara ebo ụmụ Manase ka ọ bụrụ ala ha ketara.+  N’ihi ya, na-emenụ ihe ndị e kwuru n’ọgbụgba ndụ a, na-erubekwanụ isi na ha, ka ihe niile unu na-eme wee gaa nke ọma.+ 10  “Taa, unu niile guzo n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu, ya bụ, ndị isi ebo unu dị iche iche, ndị okenye unu, ndị isi unu, nwoke ọ bụla n’Izrel, 11  ụmụ unu, ndị nwunye unu,+ ndị mbịarambịa+ bụ́ ndị bi n’ebe unu mara ụlọikwuu, malite n’onye na-akpatara unu nkụ ruo n’onye na-esetara unu mmiri. 12  Unu nọ ebe a ka unu ṅụọ iyi na unu na Jehova bụ́ Chineke unu na-agba ndụ, bụ́ ndụ unu na Jehova bụ́ Chineke unu na-agba taa,+ 13  ka o wee mee ka unu bụrụ ndị ya taa+ nakwa ka ọ bụrụ Chineke unu,+ otú o kwere unu ná nkwa nakwa otú ọ ṅụụrụ nna nna unu hà, bụ́ Ebreham,+ Aịzik,+ na Jekọb,+ n’iyi. 14  “Ọ bụghị naanị mụ na unu na-agba ndụ a ma na-aṅụ iyi a, 15  kama ọ bụ anyị na ndị anyị na ha guzo n’ebe a taa n’ihu Jehova bụ́ Chineke anyị nakwa ndị na-esoghị anyị nọrọ n’ebe a taa. 16  (N’ihi na unu ma nke ọma otú anyị si bie n’Ijipt nakwa otú anyị si si ná mba dị iche iche gafere mgbe anyị na-apụta.+ 17  Unu nọkwa na-ahụ chi ha dị iche iche rụrụ arụ na arụsị ha ndị na-asọ oyi,*+ ndị ha ji osisi na nkume nakwa ọlaọcha na ọlaedo mee.) 18  Kpacharanụ anya taa ka a ghara inwe nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ezinụlọ ma ọ bụ ebo ọ bụla n’obodo unu nke ga-ekwe ka obi ya si n’ebe Jehova bụ́ Chineke anyị nọ pụọ, ya agaa fee chi dị iche iche mba ndị ahụ na-efe.+ Onye ahụ ga-adị ka mgbọrọgwụ nke na-amịpụta mkpụrụ osisi na-egbu mmadụ nakwa ahịhịa na-elu ilu.+ 19  “Ma ọ bụrụ na mmadụ anụ ihe e kwuru n’iyi a a ṅụrụ, ya etuo ọnụ ma kwuo n’obi ya, sị, ‘E nweghị ihe ga-eme m n’agbanyeghị na ọ bụ ihe dị m n’obi ka m ga na-eme,’ nke ga-eme ka e bibie onye ọ bụla* nọ ya nso, 20  Jehova agaghị agbaghara ya.+ Kama, Jehova ga-ewesa onye ahụ iwe dị ọkụ. A ga-abụkwa ya ọnụ niile e dere n’akwụkwọ a.+ Jehova ga-ehichapụ aha ya n’ụwa.* 21  Jehova ga-esi n’ebo niile e nwere n’Izrel kpọpụta onye ahụ iche ka nsogbu bịara ya, bụ́ nsogbu niile e kwuru okwu ha n’ọgbụgba ndụ ahụ e dere n’akwụkwọ Iwu a. 22  “Mgbe ọgbọ ndị ga-esote unu, ya bụ, ụmụ unu nakwa onye mba ọzọ nke ga-esi n’ala dị anya bịa, ga-ahụ ahụhụ ala ahụ na-ata, nsogbu niile Jehova ga-eweta n’ala ahụ, 23  ya bụ, sọlfọ na nnu na ọkụ, nke ga-eme ka a ghara ịkọ ihe n’ala ahụ niile, ka ihe ghara ipu na ya, ahịhịa ndụ agharakwa ipu na ya, otú ọ dị mgbe e bibiri Sọdọm na Gọmọra,+ Adma na Zeboyim,+ bụ́ obodo ndị Jehova ji iwe na ọnụma ya bibie, 24  ha na mba niile ga-asị, ‘Gịnị mere Jehova ji mee ala a ihe a?+ Gịnị kpatara nnukwu iwe a?’ 25  A ga-aza ha, sị, ‘Ọ bụ n’ihi na ha hapụrụ ndụ ha na Jehova, bụ́ Chineke ndị nna nna ha, gbara,+ nke ya na ha gbara mgbe ọ kpọpụtara ha n’Ijipt.+ 26  Ha wee gaa fee chi ọzọ dị iche iche ma kpọọrọ ha isiala, chi dị iche iche ha na-amaghị, ndị ọ na-achọghịkwa ka ha fee.+ 27  Jehova wee wesa ala a iwe dị ọkụ, mee ka ihe ọjọọ niile e dere n’akwụkwọ a mezuo na ya.+ 28  N’ihi ya, Jehova ji oké iwe na ọnụma chụpụ ha+ n’ala ha ma chụga ha n’ala ọzọ, bụ́ ebe ha nọ taa.’+ 29  “Jehova bụ́ Chineke anyị ma ihe niile e zoro ezo.+ Ma ọ na-eme ka anyị na ụmụ niile anyị ga-amụta mara ihe ndị ọ chọrọ ka anyị mara, ka anyị wee na-eme ihe niile e kwuru n’Iwu a.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọ ga-abụ na ihe a kpọrọ arụsị ndị ahụ n’asụsụ Hibru bụ nwanne okwu Hibru ọzọ nke pụtara “nsị.” E ji ya egosi na ihe na-asọ oyi.
Na Hibru, “ka e bibie ma onye na-aṅụju mmiri afọ ma onye akpịrị na-akpọ nkụ.”
Na Hibru, “n’okpuru eluigwe.”