Diuterọnọmi 33:1-29

  • Mosis gọziri ebo dị iche iche (1-29)

    • Ogwe aka Jehova “nke na-adịru mgbe ebighị ebi” (27)

33  Ihe a bụ ihe Mosis, bụ́ onye nke ezi Chineke, kwuru mgbe ọ na-agọzi ndị Izrel tupu ya anwụọ.+  Ọ sịrị: “Jehova si na Saịnaị bịa.+ O sikwa na Sia nwukwasị ha ka ìhè. O si na Peran bụ́ ugwu ugwu mee ka ebube ya nwuo ka ìhè.+ Ọtụtụ iri puku ndị mmụọ ozi* sokwa ya.+ Ndị agha ya nọkwa ya n’aka nri.+   Ọ hụrụ ndị ya n’anya.+ Ndị nsọ ha niile nọ n’aka gị.+ Ha nọ ọdụ n’ụkwụ gị.+ Ha malitere ige ntị n’okwu gị.+   (Mosis nyere anyị iwu,+Nke bụ́ ihe ọgbakọ Jekọb ketara.)+   Chineke wee bụrụ eze na Jeshurọn,*+Mgbe ndị isi ndị Izrel gbakọtara,+ Ha na ebo niile e nwere n’Izrel.+   Ka Ruben dị ndụ ma ghara ịnwụ,+Ka ụmụ nwoke si n’ebo ya ghara ịfọ ole na ole.”+   Ọ gọzikwara Juda, sị:+ “Jehova, biko, nụrụ olu Juda.+ Kpọrọ ya kpọghachitere ndị ya. O jirila ike ya lụọ ọgụ maka ihe bụ́ nke ya,Biko, nyere ya aka lụso ndị iro ya ọgụ.”+   O kwuru banyere Livaị, sị:+ “Tọmịm gị* na Yurim+ gị bụ nke onye na-erubere gị isi,+Onye ị nwalere na Masa.+ Gị na ya malitere ịgba mgba na mmiri Meriba,+   Onye sịrị nne ya na nna ya, ‘E nweghị ihe m ji unu kpọrọ.’ Ọ kwadoghịdị ụmụnne ya.+ O leghaara ụmụ ya anya. N’ihi na ha rubeere okwu gị isi,Ha mekwara ihe ndị e kwuru n’ọgbụgba ndụ gị na ha.+ 10  Ka ha kụziere Jekọb ihe i kpebiri,+Kụziekwara Izrel Iwu gị.+ Ka ha mụnyere gị insens ọkụ ka ị nụrụ ísì ya+Ma chụọkwa onyinye a na-esucha ọkụ n’àjà n’ebe ịchụàjà gị.+ 11  Jehova, biko, gọzie ya nye ya ike. Ka ihe ọ na-eme meekwa gị obi ụtọ. Kụjie ụkwụ* ndị na-alụso ya ọgụ,Ka ndị kpọrọ ya asị ghara ibili ọzọ.” 12  O kwuru banyere Benjamin, sị:+ “Ka onye Jehova hụrụ n’anya biri n’akụkụ ya, obi eruo ya ala. Ọ ga-ebi n’agbata ubu ya abụọ,Ka ọ na-echebe ya ụbọchị niile.” 13  O kwuru banyere Josef, sị:+ “Ka Jehova gọzie ala ya.+ Ka o jiri ihe ndị dị mma dị n’eluigweNa igirigi na mmiri si n’ala agbapụta gọzie ala ya,+ 14  Na ihe ọma dị iche iche anyanwụ na-eme ka ha puo,Na ihe ọma ndị na-amị n’ọnwa n’ọnwa,+ 15  Na ihe kacha mma ndị si n’ugwu ndị dịwara kemgbe oge ochie,*+Na ihe ọma ndị si n’obere ugwu ndị na-adịte aka, 16  Na ihe ọma ndị dị n’ụwa na ihe ndị juru na ya.+ Ka Onye ahụ nke pụtara n’osisi ogwu+ kwadokwa ya. Ka ha dịrị n’isi Josef,N’opu isi onye e si n’ụmụnne ya họrọ.+ 17  Ebube ya dị ka nke oké ehi e bu ụzọ mụọ,Mpi ya bụkwa mpi atụ́. Ọ ga-eji ha nuru* ndị dị iche iche,Nuru ha niile ruo na nsọtụ ụwa. Ha bụ nke iri puku kwuru iri puku ndị agha Ifrem,+Ha bụkwa nke puku kwuru puku ndị agha Manase.” 18  O kwuru banyere Zebulọn, sị:+ “Zebulọn, ṅụrịa ọṅụ n’ahịa ị na-azụ,*Ịsaka, ṅụrịakwa ọṅụ n’ụlọikwuu gị.+ 19  Ha ga-akpọ ndị dị iche iche ka ha bịa n’ugwu. N’ebe ahụ, ha ga-eji ezigbo obi chụọ àjà. N’ihi na ha ga-enweta akụ̀ dị ukwuu n’oké osimiri dị iche iche,Nwetakwa akụ̀ zoro ezo ndị juru n’ájá.” 20  O kwuru banyere Gad, sị:+ “A ga-agọzi onye na-eme ka Gad nwetakwuo ala.+ Ọ makpu n’ebe ahụ ka ọdụm. Ọ dị njikere ịdọpụ ogwe aka ndị iro ya, dọpụkwa opu isi ha. 21  Ọ ga-ahọrọ òkè nke mbụ,+N’ihi na ọ bụ òkè onye na-enye iwu doweere ya.+ Ndị isi nke ndị ya ga-ezukọta. Ọ ga-emere Jehova ihe dị mma,Meekwa ihe o kpebiri gbasara Izrel.” 22  O kwuru banyere Dan, sị:+ “Dan bụ nwa ọdụm.+ Ọ ga-esi na Beshan mapụta.”+ 23  O kwuru banyere Naftalaị, sị:+ “Naftalaị ga-enwe obi ụtọ na Jehova meere ya amara,Gọziekwa ya n’ụba. Weghara ala dị n’ebe ọdịda anyanwụ nakwa n’ebe ndịda.” 24  O kwuru banyere Asha, sị:+ “A ga-eji ụmụ gọzie Asha. Ka ihe ya masị ụmụnne ya,Ka ọ zọnyekwa ụkwụ* ya na mmanụ. 25  Ígwè na ọla kọpa bụ ihe i ji akpọchi ọnụ ụzọ ámá gị.+ Obi ga-erukwa gị ala n’oge niile ị dị ndụ. 26  E nweghị onye dị ka ezi Chineke+ nke Jeshurọn,+Onye si n’eluigwe enyere gị aka,Onye nọkwa n’elu ígwé ojii n’ebube.+ 27  Chineke bụ ebe mgbaba kemgbe oge ochie.+ O ji ogwe aka ya na-adịru mgbe ebighị ebi na-akwado gị.+ Ọ ga-achụpụrụ gị onye iro gị.+ Ọ ga-asịkwa, ‘Bibie ha!’+ 28  Obi ga-eru Izrel ala n’ebe o bi. Isi iyi Jekọb ga na-asọ n’enweghị ihe na-enye ya nsogbuN’ala nke na-emepụta ọka* na mmanya ọhụrụ,+Nke igirigi ga-esi na mbara igwe ya na-ada.+ 29  Ndị Izrel, obi dị unu ụtọ.+ Ònye dị ka unu,+Unu ndị Jehova na-azọpụta,+Onye bụ́ ọta na-echebe unu+Na mma agha unu nke dị ebube? Ndị iro unu ga-atụ egwu n’ihu unu,+Unu ga-azọkwa ha ụkwụ n’azụ.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Ọtụtụ iri puku ndị nsọ.”
Jeshurọn pụtara “Onye Ezi Omume.” Ọ bụ aha a na-etu Izrel.
“Gị” na “ị” dị n’amaokwu a nọchiri anya Chineke.
Ma ọ bụ “úkwù.”
O nwere ike ịbụ, “n’ugwu ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ.”
Ma ọ bụ “sọọ.”
Na Hibru, “n’ọpụpụ gị.”
Ma ọ bụ “saa ụkwụ.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.