Diuterọnọmi 6:1-25

  • Jiri obi gị niile hụ Jehova n’anya (1-9)

    • “Nụrụ, Izrel” (4)

    • Ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ịkụziri ụmụ ha ihe (6, 7)

  • Echefula Jehova (10-15)

  • Anwala Jehova ọnwụnwa (16-19)

  • Ihe ndị Izrel ga-akọrọ ụmụ ha (20-25)

6  “Ihe ndị a bụ iwu, ntụziaka, na ihe ndị Jehova bụ́ Chineke unu kpebiri, ndị ọ gwara m ka m kụziere unu, ka unu wee na-eme ha mgbe unu gafere n’ala ahụ unu ga-enweta,  ka unu wee na-atụ egwu Jehova bụ́ Chineke unu, na-eme ihe niile o kwuru, na-edebekwa iwu ya ndị m na-agwa unu, ma ununwa ma ụmụ unu ma ụmụ ụmụ unu,+ n’oge niile unu dị ndụ, ka unu wee dị ogologo ndụ.+  Unu ga-egekwa ntị, unu Izrel, ma lezie anya na-eme ha eme, ka ihe gaziere unu, unu adịkwa nnọọ ọtụtụ n’ala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,* otú Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà kwere unu ná nkwa.  “Nụrụ, Izrel: Jehova bụ́ Chineke anyị bụ otu Jehova.+  Jiri obi gị niile na mkpụrụ obi* gị niile+ na ike gị niile*+ hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.  Ihe ndị a m na-enye gị n’iwu taa ga-adị n’obi gị.  Kụziere ha ụmụ gị+ ka o ruo ha n’obi,* na-ekwukwa banyere ha mgbe ị nọ ọdụ n’ụlọ gị na mgbe ị na-aga ije n’okporo ụzọ na mgbe i dina ala nakwa mgbe i biliri ọtọ.+  Kee ha n’aka gị ka i wee na-echeta ha. Ha ga-adịkwa ka ihe ị na-ekegide n’egedege ihu gị.*+  Dee ha n’awara ụzọ ụlọ gị nakwa n’ọnụ ụzọ ámá gị. 10  “Mgbe Jehova bụ́ Chineke gị ga-akpọbata gị n’ala ọ ṅụụrụ nna nna gị hà, bụ́ Ebreham, Aịzik, na Jekọb iyi na ọ ga-enye gị,+ bụ́ nnukwu obodo mara mma ndị ọ na-abụghị gị rụrụ,+ 11  ụlọ ndị ụdị ihe ọma dị iche iche juru bụ́ ndị ị na-arụghị ọrụ nweta, olulu mmiri ndị ọ na-abụghị gị gwuru, nakwa ubi vaịn na osisi oliv ndị ọ na-abụghị gị kụrụ, gị erie ihe rijuo afọ,+ 12  lezie anya ka ị ghara ichefu Jehova,+ onye kpọpụtara gị n’ala Ijipt, n’ebe ị nọ na-agba ohu.* 13  Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị ga-atụ egwu.+ Ọ bụ ya ka ị ga-efe.+ Ọ bụkwa aha ya ka ị ga-eji aṅụ iyi.+ 14  Unu efela chi ọzọ, chi ọ bụla nke ndị gbara unu gburugburu na-efe,+ 15  n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu, onye nọ n’etiti unu, bụ Chineke nke chọrọ ka a na-efe naanị ya ofufe.+ Ọ bụrụ na unu efee chi ọzọ, Jehova bụ́ Chineke unu ga-ewesa unu nnukwu iwe,+ ọ ga-ekpochapụkwa unu n’ụwa.+ 16  “Unu anwala Jehova bụ́ Chineke unu ọnwụnwa,+ otú unu nwara ya na Masa.+ 17  Jirinụ obi unu niile na-eme ihe Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu n’iwu na ihe ndị ọ na-echetara unu ka unu na-eme nakwa ntụziaka ya. 18  Meenụ ihe ziri ezi na ihe dị mma n’anya Jehova, ka ihe wee gaziere unu, ka unu wee banye ma biri n’ezigbo ala ahụ Jehova ṅụụrụ nna nna unu hà iyi na ọ ga-enye ha.+ 19  Unu ga-achụpụkwa ndị iro unu niile, otú Jehova kwere ná nkwa.+ 20  “Mgbe nwa gị ga-ajụ gị n’ọdịnihu, sị, ‘Gịnị mere Jehova bụ́ Chineke anyị ji nye unu iwu ndị a, ntụziaka, na ihe ndị a o kpebiri ka unu na-eme?’ 21  ị ga-agwa nwa gị, sị, ‘Anyị nọ na-agbara Fero ohu n’Ijipt, ma Jehova ji aka ya dị ike kpọpụta anyị n’Ijipt. 22  Jehova wee na-eme ihe àmà ma na-arụ ọrụ ebube ndị dị ukwuu na ndị kpataara Ijipt+ na Fero na ezinụlọ ya niile ahụhụ n’ihu anyị.+ 23  Ọ kpọpụtara anyị n’ebe ahụ ka ọ kpọta anyị ebe a, ka o wee nye anyị ala ahụ ọ ṅụụrụ nna nna anyị hà iyi na ọ ga-enye ha.+ 24  Jehova wee nye anyị iwu ka anyị na-eme ihe a niile o kwuru ma na-atụ egwu Jehova bụ́ Chineke anyị ka ihe dịrị anyị mma mgbe niile,+ ka anyị wee dị ndụ+ otú anyị dị taa. 25  Ọ bụrụ na anyị erubere Jehova bụ́ Chineke anyị isi wee lezie anya na-edebe iwu a niile otú o nyere anyị ha n’iwu, anyị ga-abụ ndị ezi omume.’+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.
Ma ọ bụ “ume gị niile; ihe niile i nwere.”
Ma ọ bụ “na-agwa ha ụmụ gị ugboro ugboro.”
Na Hibru, “n’agbata anya gị abụọ.”
Na Hibru, “n’ụlọ ndị ohu.”