Diuterọnọmi 8:1-20

  • E chetaara ndị Izrel ihe ọma Jehova meere ha (1-9)

    • “Ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ” (3)

  • Unu echefula Jehova (10-20)

8  “Lezienụ anya ka unu na-edebe iwu niile m na-enye unu taa, ka unu wee dịrị ndụ+ ma mụbaa. Ka unu wee banye ma biri n’ala ahụ Jehova ṅụụrụ nna nna unu hà iyi na ọ ga-enye ha.+  Chetanụ ogologo ụzọ Jehova bụ́ Chineke unu mere ka unu gaa n’ala ịkpa n’ime afọ iri anọ a+ iji mee ka unu dị umeala n’obi na iji nwalee unu+ ka o wee mata ihe dị unu n’obi,+ ma ùnu ga-edebe ihe o nyere n’iwu ka ọ̀ bụ na unu agaghị edebe ya.  O mere ka unu dị umeala n’obi ma kwe ka agụụ gụọ unu.+ O nyekwara unu mana,+ bụ́ ihe unu na nna unu hà na-amabughị, ka o wee mee ka unu mara na ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile si n’ọnụ Jehova pụta.+  Ákwà unu yi akaghị nká, ụkwụ unu azaghịkwa aza n’ime afọ iri anọ a.+  O doro unu anya na ọ bụ otú mmadụ si adọ nwa ya aka ná ntị ka Jehova bụ́ Chineke unu si na-adọ unu aka ná ntị.+  “Na-edebenụ iwu Jehova bụ́ Chineke unu. Otú unu ga-esi eme ya bụ irubere ya isi na ịtụ egwu ya.  N’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu na-akpọbata unu n’ezigbo ala,+ ala iyi dị iche iche juru na ya, ebe isi mmiri dị iche iche na mmiri miri emi na-asọpụta n’ala dị larịị, na-asọpụtakwa n’ebe bụ́ ugwu ugwu,  ala ọka wit, ọka bali, mkpụrụ vaịn, mkpụrụ fig, pomigranet,+ mmanụ oliv, na mmanụ aṅụ juru na ya,+  ala nri na-agaghị akọ ụkọ na ya, nke a na-enweghịkwa ihe ga-akọ unu na ya, ala nke ígwè juru na nkume ndị dị na ya. Unu ga-egwutekwa ọla kọpa n’ugwu ndị dị na ya. 10  “Mgbe unu riri ihe rijuo afọ, unu ga-eto Jehova bụ́ Chineke unu maka ezigbo ala o nyere unu.+ 11  Kpacharanụ anya ka unu ghara ichefu Jehova bụ́ Chineke unu wee ghara idebe iwu ya, jụ iso ntụziaka ya, gharakwa ime ihe ndị o kpebiri ka unu na-eme, bụ́ ndị m na-enye unu n’iwu taa. 12  Mgbe unu riri ihe rijuo afọ, rụọ ọmarịcha ụlọ dị iche iche biri na ha,+ 13  mgbe ìgwè ehi unu na ìgwè ewu na atụrụ unu mụbara, mgbe unu nwere ọtụtụ ọlaọcha na ọlaedo, nwejuokwa ihe niile enwejuo, 14  unu adịla mpako*+ wee chefuo Jehova bụ́ Chineke unu, onye kpọpụtara unu n’Ijipt, n’ebe unu nọ na-agba ohu,*+ 15  onye mere ka unu gafere nnukwu ala ịkpa na-atụ ụjọ,+ bụ́ ebe e nwere agwọ ọjọọ na akpị, bụ́ ala kpọrọ nkụ nke na-enweghị mmiri ọ bụla. O mere ka mmiri si n’oké nkume siri ike gbapụta,+ 16  nyekwa unu mana unu riri+ n’ala ịkpa, bụ́ nke nna unu hà na-amaghị, iji mee ka unu dị umeala n’obi+ nakwa iji nwalee unu ka o wee meere unu ihe ọma n’ọdịnihu.+ 17  Ọ bụrụ na unu asị n’obi unu, ‘Ọ bụ ike anyị na ọkpụkpụ aka anyị ka anyị ji kpatara onwe anyị akụ̀ ndị a,’+ 18  chetanụ na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ike unu ji akpata akụ̀,+ ka o wee mezuo ọgbụgba ndụ ya na nna nna unu hà gbara, otú ọ na-eme taa.+ 19  “Ọ bụrụ na unu anwaa anwaa chefuo Jehova bụ́ Chineke unu, wee soro chi ọzọ dị iche iche, fee ha ofufe, kpọọkwara ha isiala, ana m agwa unu taa na a ga-ebibirịrị unu.+ 20  Otú Jehova si na-ebibiri unu mba dị iche iche ka a ga-ebibi unu maka na unu egeghị ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “unu ekwela ka obi unu mee ka unu dị mpako.”
Na Hibru, “n’ụlọ ndị ohu.”