Emọs 1:1-15

  • Jehova gwara Emọs ihe ọ ga-ebu n’amụma (1, 2)

  • Obodo ndị a ga-ata ahụhụ maka isi ha nupụụrụ Jehova ugboro ugboro (3-15)

1  Ihe a gwara Emọs* n’ọhụụ gbasara Izrel. Emọs so ná ndị Tekoa+ na-azụ atụrụ. A gwara ya ihe a n’oge Eze Ọzaya+ na-achị Juda nakwa n’oge Jeroboam+ nwa Joash+ bụ eze Izrel. Ọ hụrụ ọhụụ a afọ abụọ tupu e nwee ala ọma jijiji.+  Ọ sịrị: “Jehova ga-esi na Zayọn bigbọọ. Ọ ga-esikwa na Jeruselem mee ka a nụ olu ya. Ala anụmanụ na-ata ahịhịa, nke ndị ọzụzụ atụrụ na-edu atụrụ ha aga, ga-eru uju. Ahịhịa ndị dị n’elu elu ugwu Kamel ga-akpọnwụkwa.”+   “Jehova kwuru, sị: ‘“N’ihi isi ndị Damaskọs nupụrụ ugboro ugboro,* m gaghị ahapụ ime ha ihe m kpebiri ime ha,N’ihi na ha ji ígwè e ji eticha ọka tipịa Gilied.+   M ga-eme ka ọkụ gbaa ụlọ Hazel,+Ọ ga-erepịakwa ụlọ elu niile nke Ben-hedad.+   M ga-agbaji ihe e ji atụchi Damaskọs.+ M ga-ebibi ndị bi na Bikat-evin,Bibiekwa onye nọ na Bet-iden na-achị.* A ga-adọrọkwa ndị Siria n’agha laa Kia.”+ Ọ bụ Jehova na-ekwu ihe a.’   Jehova kwukwara, sị: ‘“N’ihi isi ndị Gaza nupụrụ+ ugboro ugboro,* m gaghị ahapụ ime ha ihe m kpebiri ime ha,N’ihi na ha kpọọrọ ndị niile a dọọrọ n’agha+ kpọnye Ịdọm.   M ga-eme ka ọkụ gbaa mgbidi Gaza,+Ọ ga-erepịakwa ụlọ elu ya niile.   M ga-ebibi ndị bi n’Ashdọd,+Bibiekwa onye nọ n’Ashkelọn+ na-achị.* M ga-ata Ekrọn+ ahụhụ. Ndị Filistia fọrọnụ ga-alakwa n’iyi.”+ Ọ bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.’   Jehova kwukwara, sị: ‘N’ihi isi ndị Taya nupụrụ+ ugboro ugboro,* m gaghị ahapụ ime ha ihe m kpebiri ime ha,N’ihi na ha kpọọrọ ndị niile a dọọrọ n’agha kpọnye Ịdọm,Nakwa n’ihi na ha echetaghị ọgbụgba ndụ nwanne na nwanne.+ 10  N’ihi ya, m ga-eme ka ọkụ gbaa mgbidi Taya. Ọ ga-erepịakwa ụlọ elu ya niile.’+ 11  Jehova kwuru, sị: ‘N’ihi isi ndị Ịdọm nupụrụ+ ugboro ugboro,* m gaghị ahapụ ime ha ihe m kpebiri ime ha,N’ihi na ha ji mma agha chụọ ụmụnne ha ọsọ,+Nakwa n’ihi na ha emereghị ha ebere. Ha ji iwe na-adọri ha n’akwụsịghị akwụsị,Ha bukwaara ha iwe n’obi mgbe niile.+ 12  N’ihi ya, m ga-eme ka ọkụ gbaa Timan.+ Ọ ga-erepịakwa ụlọ elu niile nke Bọzra.’+ 13  Jehova kwuru, sị: ‘“N’ihi isi ndị Amọn nupụrụ+ ugboro ugboro,* m gaghị ahapụ ime ha ihe m kpebiri ime ha,N’ihi na ha bọwara ụmụ nwaanyị Gilied dị ime afọ iji nwetakwuo ala.+ 14  N’ihi ya, m ga-amụnye mgbidi Raba+ ọkụ. Ọ ga-erepịakwa ụlọ elu ya niile. A ga-eti mkpu agha n’ụbọchị agha. Oké ifufe ga-efekwa n’ụbọchị oké ifufe mmiri. 15  A ga-adọrọ eze ha n’agha, dọrọkwa ndị o mere ndị isi.”*+ Ọ bụ ihe Jehova kwuru.’

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Emọs pụtara “Onye Bụ́ Ibu” ma ọ bụ “Iburu Ibu.”
Na Hibru, “isi Damaskọs nupụrụ ugboro atọ na ugboro anọ.”
Na Hibru, “onye ji mkpanaka eze na Bet-iden.”
Na Hibru, “isi Gaza nupụrụ ugboro atọ na ugboro anọ.”
Na Hibru, “onye ji mkpanaka eze n’Ashkelọn.”
Na Hibru, “isi Taya nupụrụ ugboro atọ na ugboro anọ.”
Na Hibru, “isi Ịdọm nupụrụ ugboro atọ na ugboro anọ.”
Na Hibru, “isi Amọn nupụrụ ugboro atọ na ugboro anọ.”
O nwere ike ịbụ, “ụmụ eze.”