Emọs 2:1-16

  • Obodo ndị a ga-ata ahụhụ maka isi ha nupụụrụ Jehova ugboro ugboro (1-16)

2  “Jehova kwuru, sị: ‘“N’ihi isi ndị Moab nupụrụ+ ugboro ugboro,* m gaghị ahapụ ime ha ihe m kpebiri ime ha,N’ihi na ha gbara ọkpụkpụ eze Ịdọm ọkụ, ya aghọọ ntụ.   N’ihi ya, m ga-eme ka ọkụ gbaa Moab. Ọ ga-erepịakwa ụlọ elu niile nke Kiriọt.+ Moab ga-anwụkwa n’oge ọgba aghara,Mgbe a na-eti mkpu agha, na-afụkwa opi.+   M ga-ewepụ onye na-achị* ya. M ga-egbu ya na ndị niile o mere ndị isi.”*+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.’   Jehova kwukwara, sị: ‘N’ihi isi ndị Juda nupụrụ+ ugboro ugboro,* m gaghị ahapụ ime ha ihe m kpebiri ime ha,N’ihi na ha jụrụ iwu JehovaNakwa n’ihi na ha esoghị ntụziaka ya.+ Ma ihe mere ka ha kpafuo bụ ụgha e ji mara ndị nna nna ha.+   N’ihi ya, m ga-eme ka ọkụ gbaa Juda. Ọ ga-erepịakwa ụlọ elu niile dị na Jeruselem.’+   Jehova kwuru, sị: ‘N’ihi isi ndị Izrel nupụrụ+ ugboro ugboro,* m gaghị ahapụ ime ha ihe m kpebiri ime ha,N’ihi na ha rere onye ezi omume iji nweta ọlaọcha,Reekwa ogbenye iji nweta akpụkpọ ụkwụ.+   Ha na-azọgide isi ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha n’ájá.+ Ha anaghị emeso ndị dị umeala n’obi otú ha kwesịrị isi emeso ha.+ Nna na nwa ya na-akwaso otu nwa agbọghọ iko,Na-emebi aha nsọ m.   Ha na-anara mmadụ uwe n’ibé ma ha binye onye ahụ ego,+ yirikwa ya gbatịa onwe ha n’akụkụ ebe ịchụàjà ọ bụla.+ Mmanya ha natara ndị ha riri iwu ka ha na-aṅụ n’ụlọ chi ha.’   ‘Ma, ọ bụ m kpochapụrụ ndị Amọraịt n’ihu ha,+Ndị toro ogologo ka osisi sida, ndị sikwara ike ka osisi ook. M bibiri mkpụrụ ha ndị dị n’elu ha nakwa mgbọrọgwụ ha ndị dị n’ime ala.+ 10  M si n’Ijipt kpọpụta unu.+ Emekwara m ka unu gaa ije afọ iri anọ n’ala ịkpa,+Ka unu wee weghara ala ndị Amọraịt. 11  M họpụtara ụfọdụ n’ime ụmụ unu ka ha bụrụ ndị amụma,+Họpụtakwa ụfọdụ n’ime ụmụ okorobịa unu ka ha bụrụ ndị Naziraịt.+ Ndị Izrel, ọ̀ bụ ụgha?’ Ọ bụ ihe Jehova kwuru. 12  ‘Ma unu nọ na-enye ndị Naziraịt mmanya ka ha ṅụọ.+ Unu nyekwara ndị amụma iwu, sị: “Unu ebula amụma.”+ 13  N’ihi ya, m ga-egwepịa unu n’ala unuOtú ụgbọala e bujuru ọka si egwepịa ihe dị n’okpuru ya. 14  Onye na-awụ ajọ ọsọ agaghị enwe ebe ọ ga-agbaga.+ Ike agaghị adị onye siri ike. O nweghịkwa onye agha ga-azọli onwe ya ndụ.* 15  Onye na-agba ụta agaghị eguzoli. Onye na-awụ ajọ ọsọ agaghị enwe ike ịgbalaga. Onye na-agba ịnyịnya agaghị azọli onwe ya ndụ.* 16  Onye agha nke kachadị akata obiGa-agbara ọtọ gbalaga n’ụbọchị ahụ.’+ Ọ bụ ihe Jehova kwuru.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “isi Moab nupụrụ ugboro atọ na ugboro anọ.”
Na Hibru, “onyeikpe.”
O nwere ike ịbụ, “ụmụ eze.”
Na Hibru, “isi Juda nupụrụ ugboro atọ na ugboro anọ.”
Na Hibru, “isi Izrel nupụrụ ugboro atọ na ugboro anọ.”
Ma ọ bụ “ga-azọpụtali mkpụrụ obi ya.”
Ma ọ bụ “azọpụtali mkpụrụ obi ya.”