Emọs 4:1-13

  • Ahụhụ a ga-ata ụmụ nwaanyị ndị dị ka ehi Beshan (1-3)

  • Jehova kwara ndị Izrel emo maka na ha na-efe arụsị (4, 5)

  • Ndị Izrel ekweghị alọghachikwute Jehova (6-13)

    • “Jikere ka gị na Chineke gị hụ” (12)

    • ‘Chineke na-agwa ụmụ mmadụ ihe dị ya n’obi’ (13)

4  “Ụmụ nwaanyị ndị bi n’ugwu Sameria,+ nụrụnụ ihe m na-ekwu. Unu dị ka ehi Beshan. Unu na-erigbu ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha,+ na-echikwa ndị ogbenye ọnụ n’ala. Unu na-asịkwa ndị di unu,* ‘Nyenụ anyị mmanya ka anyị ṅụọ.’   Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, onye dị nsọ, aṅụọla iyi,* sị,‘“Oge na-abịa mgbe a ga-eji nko onye na-egbu anụ kolie unu elu,Jirikwa nko azụ̀ kolie ndị fọdụrụ n’ime unu elu.   Onye ọ bụla n’ime unu ga-esi n’ebe a kwaturu akwatu ná mgbidi, nke dị ya n’ihu, pụọ. A ga-achụgakwa unu Hamọn.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.’   ‘Bịanụ na Betel mebie iwu.*+ Bịakwanụ na Gilgal mebie iwu ọtụtụ ugboro.+ Wetanụ àjà unu+ n’ụtụtụ. Wetakwanụ otu ụzọ n’ụzọ iri unu+ n’ụbọchị nke atọ.   Jirinụ achịcha koro eko chụọ àjà iji kelee Chineke.+ Kọsaanụ onyinye si unu n’obi unu na-enye,N’ihi na ọ bụ ihe na-adị unu mma, unu ndị Izrel.’ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.   ‘M mere ka unu gbara ọnụ* n’obodo unu niile,Meekwa ka nri kọọ n’ụlọ niile unu bi.+ Ma unu alọghachikwuteghị m.’+ Ọ bụ ihe Jehova kwuru.   ‘M mekwara ka mmiri ghara izoro unu mgbe ọ fọrọ ọnwa atọ ka e wee ihe ubi.+ M mekwara ka mmiri zoo n’otu obodo, ma emeghị m ka o zoo n’obodo ọzọ. Mmiri zoro n’otu ibé ala,Ma ibé ala mmiri na-ezoghị na ya kpọrọ nkụ.   Ndị si n’obodo abụọ ma ọ bụ atọ nọ na-adagharị na-aga n’otu obodo ka ha ṅụọ mmiri.+ Ha aṅụjughịkwa afọ. Ma unu alọghachikwuteghị m.’+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.   ‘Emere m ka ihe unu kụrụ kpọnwụọ, maakwa ebu.+ Unu mere ka ubi vaịn unu na ubi unu ndị ọzọ dị ọtụtụ,Ma igurube ripịara osisi fig unu na osisi oliv unu.+ Ma unu alọghachikwuteghị m.’+ Ọ bụ ihe Jehova kwuru. 10  ‘Eziteere m unu ọrịa na-efe efe, ụdị nke rịara Ijipt.+ Eji m mma agha gbuo ụmụ okorobịa unu,+ kpụrụkwa ịnyịnya unu.+ Emekwara m ka ísì ọjọọ nke na-esi n’ebe unu mara ụlọikwuu siba unu n’imi.+ Ma unu alọghachikwuteghị m.’ Ọ bụ ihe Jehova kwuru. 11  ‘M bibiri ala unu,Otú mụnwa, bụ́ Chineke, bibiri Sọdọm na Gọmọra.+ Unu wee dị ka nkụ a lọpụtara n’ọkụ. Ma unu alọghachikwuteghị m.’+ Ọ bụ ihe Jehova kwuru. 12  N’ihi ya, Izrel, m ga-ata gị ahụhụ ọzọ. Izrel, ebe ọ bụ na m ga-eme gị ihe a,Jikere ka gị na Chineke gị hụ. 13  N’ihi na ọ bụ ya bụ Onye kere ugwu niile+ na Onye kere ifufe.+ Ọ na-agwa ụmụ mmadụ ihe dị ya n’obi. Ọ na-eme ka chi bọrọ abọ ghọọ ọchịchịrị.+ Ọ na-aga ije n’ebe ndị dị elu n’ụwa.+ Jehova, bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha, bụ aha ya.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ndị nna ukwu unu.”
Na Hibru, “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova aṅụọla iyi n’ịdị nsọ ya.”
Ma ọ bụ “nupụ isi.”
Ma ọ bụ “unu ghara inwe ihe unu ga-eri.”