Emọs 6:1-14

  • Ndị tụkwasịrị onwe ha obi ga-ata ahụhụ (1-14)

    • Àkwà ndị e ji ọdụ́ rụọ na efere ndị e ji aṅụ mmanya (4, 6)

6  “Ndị tụkwasịrị onwe ha obi na Zayọn ga-ata ahụhụ,Ha na ndị chere na o nweghị ihe ga-eme ha n’ugwu Sameria.+ Ha bụ ndị a na-anụ aha ha ná mba ndị a kacha mara,Ndị ụlọ Izrel na-agakwuru.   Gaanụ Kalne ka unu hụ ihe na-eme. Sikwanụ ebe ahụ gaa Hemat+ bụ́ Obodo Ukwu. Gbadaanụ Gat nke dị na Filistia. Ọ̀ bụ ha ka alaeze ndị a* mma? Ka ala ha ọ̀ ka ala unu?   Ùnu na-ewepụ ụbọchị ọdachi n’obi unu?+ Ùnu na-eme ka tigbuo zọgbuo na-achị unu?+   Unu na-edina n’àkwà* ndị e ji ọdụ́ rụọ,+ na-agbatịkwa onwe unu n’àkwà* unu.+ Unu na-esi n’ìgwè atụrụ were ụmụ ebule rie, na-erikwa ụmụ ehi* gbara agba.+   Unu na-abụ abụ na-abaghị uru mgbe unu na-anụ ụda ụbọ akwara,+Na-arụkwa ngwá egwú otú Devid rụrụ.+   Unu ji efere na-aṅụ mmanya.+ Unu na-etekwa onwe unu mmanụ kacha mma. Ma ọdachi dakwasịrị Josef+ emetụghị unu n’ahụ́.*   N’ihi ya, unu ga-abụ ndị mbụ a ga-adọrọ n’agha.+ Unu ga-akwụsịkwa oriri oké mkpọtụ unu na-eri na-agbatị onwe unu n’àkwà.*   ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ejirila onwe ya* ṅụọ iyi.’+ Ihe a ka Jehova bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha kwuru,‘“Mpako Jekọb dị+ na-asọ m oyi,Akpọkwara m ụlọ elu ya niile asị.+ M ga-enyefekwa obodo ya na ihe juru na ya n’aka ndị iro ya.+  “‘“Ọ bụrụkwa na ụmụ nwoke iri afọdụ n’otu ụlọ, ha ga-anwụ. 10  Onye ikwu* ha ga-abịa bupụ ha ma kpọọ ha ọkụ otu otu. Ọ ga-esi n’ụlọ ahụ chịpụta ọkpụkpụ ha. Ọ ga-asịkwa onye ọ bụla nọ n’ime ime ụlọ ahụ, ‘Ò nwere onye ọzọ gị na ya nọ?’ Onye ahụ ga-asịkwa ya, ‘O nweghị.’ Ọ ga-asịzi, ‘Gba nkịtị, n’ihi na ugbu a abụghị oge e ji akpọ aha Jehova.’” 11  Jehova nye iwu,+A ga-akụ nnukwu ụlọ righirighi,Kụriekwa obere ụlọ.+ 12  Ịnyịnya ọ̀ na-agba ọsọ n’elu nnukwu nkume? Ka mmadụ ọ̀ ga-eji ehi kọọ ihe na ya? Unu emeela ka ikpe ziri ezi ghọọ ahịhịa na-egbu mmadụ,Meekwa ka mkpụrụ ezi omume ghọọ ahịhịa na-elu ilu.+ 13  Unu na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ihe na-abaghị uru,Unu na-asịkwa: “Ọ́ bụghị anyị mere onwe anyị ka anyị dị ike?”*+ 14  N’ihi ya, ndị Izrel, m ga-eme ka otu mba bịa lụso unu agha.+ Ha ga-emegbukwa unu malite na Libo-hemat*+ ruo na Ndagwurugwu* Araba.’ Ọ bụ ihe Jehova bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha kwuru.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọ ga-abụ alaeze Juda na Izrel.
Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Ma ọ bụ “ụmụ oké ehi.”
Na Hibru, “emeghị ka ha daa ọrịa.”
Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
Na Hibru, “Nwanne nna.”
Na Hibru, “Ọ́ bụghị ike anyị ka anyị ji nweta mpi?”
Ma ọ bụ “n’ebe e si abanye Hemat.”