Emọs 8:1-14

  • Ọhụụ Emọs hụrụ gbasara nkata mkpụrụ osisi mịrị n’oge ọkọchị (1-3)

  • Jehova mara ndị na-azọgbu ụmụ ogbenye ikpe (4-14)

    • A ga-enwe agụụ ịnụ okwu Chineke (11)

8  Ihe a ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova gosiri m: Otu nkata ihe dị na ya bụ mkpụrụ osisi mịrị n’oge ọkọchị.  O wee sị: “Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?” M wee sị: “Ọ bụ nkata ihe dị na ya bụ mkpụrụ osisi mịrị n’oge ọkọchị.” Jehova gwaziri m, sị: “Ọgwụgwụ Izrel bụ́ ndị m eruola. M gaghịzi agbaghara ha.+  Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘N’ụbọchị ahụ, abụ a na-abụ n’ụlọ nsọ ga-abụ ibe ákwá arịrị.+ A ga-atụsasị ozu ebe niile+ nke na mkpọtụ ọ bụla agaghị adị.’   Nụrụnụ ihe a, unu ndị na-azọgbu ụmụ ogbenye,Ndị na-ekpochapụkwa ndị dị umeala n’obi n’ụwa,+   Ndị na-asị, ‘Olee mgbe ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ ga-agafe+ ka anyị ree ọka?* Oleekwa mgbe Ụbọchị Izu Ike+ ga-agafe ka anyị bupụta ọka ree? Ka anyị wee mee ka efa* e ji atụ̀ ihe dịkwuo ntakịrị,Meekwa ka shekel* ole a na-ere ihe gbagoo,Jirikwa ihe wayo e ji atụ̀ ihe ghọgbuo ndị mmadụ.+   Ka anyị wee jiri ọlaọcha zụrụ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha,Jirikwa otu akpụkpọ ụkwụ zụrụ ụmụ ogbenye,+Ka anyị reekwa ọka na-abaghị uru ọ bụla.’   Jehova, Onye Jekọb ji anya isi,+ ejirila onwe ya ṅụọ iyi, sị,‘O nweghị mgbe m ga-echefu ihe niile ha mere.+   Ọ bụ nke a mere ala* ga-eji maa jijiji. Onye ọ bụla bi na ya ga-erukwa uju.+ Ọ́ gaghị eto ka Osimiri Naịl,Maliekwa elu ma talata ka Osimiri Naịl dị n’Ijipt?’+   Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘N’ụbọchị ahụ,M ga-eme ka anyanwụ daa n’etiti ehihie,Meekwa ka ọchịchịrị gbaa n’ala a n’ụbọchị ihu igwe gbachapụrụ agbachapụ.+ 10  M ga-eme ka ụbọchị unu ji eme ememme unu ghọọ ụbọchị iru uju,+Meekwa ka abụ unu niile ghọọ abụ iru uju. M ga-eme ka mmadụ niile kee ákwà iru uju n’úkwù, meekwa ka isi mmadụ niile kwọchaa. M ga-eme ka ọ dịrị ka mgbe a na-eruru nwa nwoke a mụrụ naanị ya uju. N’ikpeazụ, ọ ga-adị ka ụbọchị onye ọ bụla na-ata ahụhụ.’ 11  Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘Oge na-abịaMgbe m ga-eme ka e nwee agụụ n’ala a. Ọ bụghị agụụ nri ma ọ bụ agụụ mmiri,Kama ọ bụ nke ịnụ okwu Jehova.+ 12  Ha ga na-adagharị si n’oké osimiri ruo n’oké osimiri,Sikwa n’ebe ugwu ruo n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ha ga na-awagharị na-achọ okwu Jehova, ma ha agaghị achọta ya. 13  N’oge ahụ, ụmụ agbọghọ mara mma, ndị na-amaghị nwoke, ga-atụbọ,Ụmụ okorobịa ga-atụbọkwa, n’ihi na akpịrị na-akpọ ha nkụ. 14  Ha bụ ndị ji mmehie Sameria+ na-aṅụ iyi, ndị na-asị: “Dan, otú ahụ o doro anya na chi gị dị ndụ,”+Na-asịkwa, “Otú ahụ o doro anya na ụzọ Bia-shiba+ na-adịgide.” Ha ga-ada, ha agaghị ebili ọzọ.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Gụọ B14.
Gụọ B14.
Ma ọ bụ “ụwa.”