Emọs 9:1-15

  • O nweghị onye ga-agbanahụli ikpe Chineke (1-10)

  • Jehova ga-ebuli ụlọ ndò Devid elu (11-15)

9  Ahụrụ m Jehova+ ka ọ nọ n’elu ebe ịchụàjà, sị: “Tie ihe n’isi ogidi ji ụlọ, ụlọ ahụ ga-amakwa jijiji. Kụpụ isi ogidi ahụ, m ga-ejikwa mma agha gbuo onye fọdụrụ n’ime ha. O nweghị onye n’ime ha ga-agbapụ. O nweghịkwa onye chọrọ ịgbapụ ga-agbalaga.+   Ọ bụrụ na ha egwuo ala banye n’ime ili,*Aka m ga-esi ebe ahụ kpụrụ ha. Ọ bụrụkwa na ha agaa eluigwe,M ga-esi ebe ahụ chụda ha.   Ọ bụrụ na ha ezoo n’elu ugwu Kamel,M ga-achọ ha nke ọma n’ebe ahụ, jidekwa ha.+ Ọ bụrụkwa na ha ezoo n’ala ala oké osimiri ka m ghara ịhụ ha,M ga-agwa agwọ ka ọ taa ha n’ebe ahụ.   Ọ bụrụ na ndị iro ha adọrọ ha n’agha,M ga-agwa mma agha ka o gbuo ha, ọ ga-egbukwa ha ebe ahụ.+ M ga-eme ka anya m dị n’ebe ha nọ iji mee ha ihe ọjọọ, ọ bụghị imere ha ihe ọma.+   Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kpara ala* a aka,O wee gbazee.+ Ndị niile bi na ya ga-erukwa uju.+ Ọ ga-etokwa ka Osimiri Naịl,Talatakwa ka Osimiri Naịl dị n’Ijipt.+   ‘Jehova bụ aha+Onye na-arụ ụzọ e si aga n’eluigwe,Na-arụkwa ihe o ji ekpuchi ụwa,Onye na-eme ka oké osimiri gbakọta,Ka ọ wụsa ya n’elu ala.’+   ‘Ndị Izrel, ọ̀ bụ na unu adịghị ka ụmụ Kush n’anya m?’ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. ‘Ọ̀ bụ na esighị m n’Ijipt kpọpụta Izrel,+Si na Krit kpọpụta ndị Filistia,+ sikwa na Kia kpọpụta Siria?’+   ‘Anya Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova na-ele alaeze na-eme mmehie. Ọ ga-ekpochapụkwa ya n’elu ala.+ Ma, ọ gaghị ekpochapụ ndị si n’ezinụlọ Jekọb kpamkpam.’+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.   ‘N’ihi na m na-enye iwu Ka a chụsasịa ndị Izrel ná mba niile,+Si otú ahụ yọgharịa ha otú mmadụ si ayọgharị myọ,Ma, otu obere okwute agaghị ada n’ala. 10  A ga-eji mma agha gbuo ndị m niile na-eme mmehie,Ndị na-asị: “Ọdachi agaghị abịaru anyị nso ma ọ bụ rute anyị.”’ 11  ‘N’oge ahụ, m ga-ebulite ụlọ ndò* Devid+ dara ada,Rụziekwa ebe* ndị a kwadara akwada. M ga-arụzi ebe ndị e bibiri ebibi na ya. M ga-arụghachi ha ka ha dịrị otú ha dị ọtụtụ afọ gara aga,+ 12  Ka ndị m weghara ihe fọdụrụ n’Ịdọm,+Wegharakwa mba niile na-aza aha m.’ Ọ bụ Jehova, onye na-eme ihe a, kwuru ya. 13  Jehova kwukwara, sị, ‘Oge na-abịaMgbe ọ ga-abụ, tupu e wechaa ihe niile dị n’ubi, oge e ji akọ ihe ga-eru. Tupu a zọchaa mkpụrụ vaịn niile, oge e ji agha mkpụrụ ga-eru.+ Mmanya dị ụtọ ga-esi n’ugwu ukwu na-atapụta.+ Ugwu nta niile ga na-agbapụtakwa mmanya.*+ 14  M ga-akpọlata ndị m Izrel a dọọrọ n’agha.+ Ha ga-arụzikwa obodo ndị tọgbọ chakoo ma biri n’ime ha.+ Ha ga-akọ ubi vaịn ma ṅụọ mmanya si na ha,+Kọọkwa ubi ma rie mkpụrụ si na ha.’+ 15  ‘M ga-akụ ha n’ala ha dị ka mkpụrụ. A gaghị efopụkwa ha ọzọN’ala ha nke m nyere ha.’+ Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu kwuru ihe a.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “ụwa.”
Ma ọ bụ “ụlọikwuu.”
Ma ọ bụ “ebe ha.”
Na Hibru, “ga-agbazekwa.”