Akwụkwọ Ozi E Degaara Faịlimọn 1:1-25

  • Ekele (1-3)

  • Faịlimọn nwere okwukwe, hụkwa ndị ọzọ n’anya (4-7)

  • Ihe Pọl rịọrọ Faịlimọn ka o meere ya gbasara Onesịmọs (8-22)

  • Ekele ikpeazụ (23-25)

 Abụ m Pọl, onye a tụrụ mkpọrọ+ n’ihi Kraịst Jizọs. Mụ na Timoti,+ bụ́ nwanna anyị, na-edetara Faịlimọn, onye anyị hụrụ n’anya na onye ọrụ ibe anyị, akwụkwọ ozi,  ya na Afia, nwanna anyị nwaanyị, na Akịpọs,+ onye agha ibe anyị, nakwa ọgbakọ dị n’ụlọ+ Faịlimọn:  Ka Chineke Nna anyị nakwa Onyenwe anyị Jizọs Kraịst meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu.  Ana m ekele Chineke m mgbe niile m chetara gị n’ekpere m,+  n’ihi na m na-anụ gbasara okwukwe i nwere nakwa otú i si hụ Onyenwe anyị Jizọs na ndị nsọ niile n’anya.  Ekpere m bụ ka okwukwe gị na ndị ọzọ nwere mee ka ị ghọta ihe ọma niile anyị si n’aka Kraịst nweta.  N’ihi na m ṅụrịrị ezigbo ọṅụ mgbe m nụrụ otú i si hụ ndị ọzọ n’anya. O mekwara ka obi sie m nnọọ ike. Nwanna m, i meekwala ka obi sie ndị nsọ ike.  N’ihi ya, ọ bụ eziokwu na m nwere ike inye gị iwu n’aha Kraịst n’ezoghị ọnụ ka i mee ihe kwesịrị ekwesị,  ma, ọ ka mma ka m rịọ gị ka i mee ya n’ihi na ị hụrụ ndị ọzọ n’anya, ebe ị ma na mụnwa, bụ́ Pọl, emeela agadi, nakwa na a tụrụ m mkpọrọ ugbu a n’ihi Kraịst Jizọs. 10  Ana m arịọ gị ka i meere m otu ihe ọma gbasara Onesịmọs,+ onye m ji mere nwa+ ugbu a a tụrụ m mkpọrọ.* 11  Ọ baraghị gị uru n’oge gara aga, ma ọ baara mụ na gị uru ugbu a. 12  M na-ezilatara gị ya. Ọ bụ onye m hụrụ nnọọ n’anya. 13  M chọrọ ka mụ na ya nọrọ ebe a ka ọ na-ejere m ozi ị gaara ejere m ebe a a tụrụ m mkpọrọ n’ihi ozi ọma m na-ezisa.+ 14  Ma, agaghị m eme ihe ọ bụla gbasara ya ma ọ bụrụ na i kweghị, ka ọ ghara ịbụ na m manyere gị ka i meere m ihe ọma, kama, ka ọ bụrụ na i ji obi gị niile mee ya.+ 15  O nwere ike ịbụ ya mere o ji hapụtụ gị,* ka i nwee ike kpọrọghachi ya ruo mgbe ebighị ebi. 16  Ọ gaghịzi abụ naanị ohu gị,+ kama ọ ga-abụ onye karịrị ohu. Ọ ga-abụzi nwanna gị. M hụrụ ya nnọọ n’anya.+ Ma gịnwa ga-aka ahụ ya n’anya ebe ọ bụ ohu gị, bụrụkwa ohu Onyenwe anyị. 17  N’ihi ya, ọ bụrụ na m ka bụ enyi gị, nabata ya otú ị ga-esi anabata m. 18  Ọ bụrụkwa na o mere gị ihe ọjọọ ọ bụla ma ọ bụ jiri gị ụgwọ, ya dịrị m n’isi. 19  Ọ bụ mụnwa, bụ́ Pọl, ji aka m na-ede na m ga-akwụ gị ụgwọ o ji gị. Ma, gịnwa jidị m ụgwọ karịrị nke o ji gị. 20  Nwanna m, meere m ihe ọma a n’ihi Onyenwe anyị. Mee ka obi sikwuo m ike n’ihi na m na-eso ụzọ Kraịst. 21  Obi siri m ike na ị ga-eme ihe m gwara gị, ọ bụ ya mere m ji edetara gị akwụkwọ ozi a. Amakwa m na ị ga-emedị karịa ihe m gwara gị. 22  Doziekwara m ụlọ m ga-anọ ma m bịa, n’ihi na ekpere unu nwere ike ime ka a hapụ m, mụ enweekwa ike ịbịa hụ unu.+ 23  Epafras,+ onye e ji mụ na ya eji n’ihi Kraịst Jizọs, na-ekele gị. 24  Mak, Arịstakọs,+ Dimas,+ na Luk,+ bụ́ ndị ọrụ ibe m, na-ekelekwa gị. 25  Ka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst meere unu amara n’ihi àgwà ọma unu na-akpa.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “m nọ n’agbụ.”
Na Grik, “hapụ gị ruo otu awa.”