Habakọk 3:1-19

  • Onye amụma kpere ekpere ka Jehova nyere ha aka (1-19)

    • Chineke ga-azọpụta ndị o tere mmanụ (13)

    • Ịṅụrị ọṅụ n’ihi Jehova n’agbanyeghị ihe isi ike (17, 18)

3  Ekpere Habakọk onye amụma kpere, nke o kpere ka abụ iru uju:   Jehova, anụla m akụkọ gbasara gị. Jehova, ihe i mere emenyela m ụjọ. Meekwa ya ọzọ n’oge anyị.* Mee ka a mara ya n’oge anyị.* N’oge ị ga-eme ka ọgba aghara dị, cheta mee ebere.+   Chineke si na Timan bịa. Onye Nsọ si n’Ugwu Peran bịa.+ (Sila)* Ebube ya kpuchiri eluigwe.+ Ndị na-eto ya juru ebe niile n’ụwa.   Ìhè ya gbukepụrụ dị ka anyanwụ.+ Ìhè si ebe abụọ na-apụta n’aka ya,Ebe ike ya zoro.   Ọrịa na-efe efe nọ na-aga n’ihu ya.+ Oké ahụ́ ọkụ sokwa ya n’azụ.   O guzo otu ebe mee ka ụwa maa jijiji.+ Anya o lere mere ka mba niile jiri ụjọ malie elu.+ E tidara ugwu ukwu niile dịwara kemgbe ụwa. Ugwu nta niile dịwara kemgbe oge ochie dakwara.+ Otú a ka o si eme kemgbe ụwa.   Ahụrụ m nsogbu dị n’ụlọikwuu Kushan. Ákwà ụlọikwuu Midian mara jijiji.+   Jehova, ọ̀ bụ osimiri ka ị na-ewesa iwe? Ọ̀ bụ iyi ka ị na-ewesa iwe? Ka ọ̀ bụ oké osimiri ka ị na-ewesa ezigbo iwe+Mgbe ị nọ na-agba ịnyịnya gị?+ Ụgbọ ịnyịnya gị mere ka ndị gị merie.*+   I wepụtala ụta gị, jikerekwa ịgbapụ ya. Mkpara* gị ejikerela ịrụ ọrụ ha otú ị ṅụrụ n’iyi. (Sila) I ji osimiri dị iche iche kewaa ụwa. 10  Ugwu dị iche iche hụrụ gị maa jijiji n’ihi ihe mgbu.+ Oké mmiri ozuzo gafere. Ogbu mmiri mere ka olu ya daa ụda.+ Ọ tụliri mmiri ya elu. 11  Anyanwụ na ọnwa guzooro otu ebe n’ụlọ ha dị elu.+ Akụ́ gị nke na-egbuke egbuke gbapụrụ.+ Ube gị gburu ka àmụ̀mà. 12  I ji ezigbo iwe zọrọ ije gafere n’ụwa. I ji iwe zọgbuo mba niile.* 13  Ị pụtara ka ị zọpụta ndị gị, ka ị zọpụta onye i tere mmanụ. Ị kụriri onyeisi ụlọ onye ajọ omume. Ị kụturu ụlọ ahụ si na ntọala ya ruo n’elu ya.* (Sila) 14  I ji ngwá ọgụ* ndị agha ya bibie haMgbe ha bịara ka oké ifufe ka ha laa m n’iyi. Ha si n’ebe ha zoro ṅụrụ ezigbo ọṅụ bịa ka ha bibie onye nọ n’ahụhụ. 15  I ji ịnyịnya gị gafee oké osimiri,Ya bụ, nnukwu mmiri na-asọ asọ. 16  Amara m jijiji* mgbe m nụrụ ihe ndị a. Egbugbere ọnụ m mara jijiji mgbe m nụrụ ụda ya. Ọkpụkpụ m wee rewe ure.+ Ụkwụ m abụọ nọ na-ama jijiji. Ma m ga-anọrọ nwayọọ chere ụbọchị ahụhụ,+N’ihi na ọ bụ ụbọchị a ga-emesi ndị iro anyị ike. 17  Ọ bụ eziokwu na osisi fig nwere ike ghara ịma ifuru,Osisi vaịn nwekwara ike ghara ịmị mkpụrụ,Ọ bụ eziokwu na osisi oliv nwere ike ghara ịmị mkpụrụ,Ala nwekwara ike ghara imepụta nri ọ bụla,Ọ bụ eziokwu na ìgwè ewu na atụrụ ndị nọ n’ogige ha nwere ike nwụchaa,E nwekwara ike a gaghị enwe ìgwè ehi n’ogige ha, 18  Ma mụnwa ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi Jehova. M ga-enwe aṅụrị n’ihi Chineke, onye nzọpụta m.+ 19  Jehova bụ́ Ọkaakaa Onyenwe anyị bụ ike m.+ Ọ ga-eme ka ụkwụ m na-awụ ọsọ ka ụkwụ mgbada,Meekwa ka m jee ije n’ebe ndị dị elu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “n’afọ ndị a.”
Na Hibru, “n’afọ ndị a.”
Ma ọ bụ “a zọpụta ndị gị.”
O nwere ike ịbụ, “Akụ́.”
Na Hibru, “zọchaa mba niile dị ka mkpụrụ.”
Na Hibru, “n’olu ya.”
Na Hibru, “mkpara.”
Na Hibru, “Afọ m mara jijiji.”