Hagaị 1:1-15

  • Chineke bara mba maka na a hapụrụ ịrụghachi ụlọ nsọ ya (1-11)

    • ‘Ugbu a ọ̀ bụ oge ibi n’ụlọ e ji osisi mara mma rụọ?’ (4)

    • “Chebaranụ ihe unu na-eme echiche” (5)

    • Ha na-akụ mkpụrụ buru ibu ma na-eweta ihe dị obere n’ubi (6)

  • Ndị mmadụ gere ntị n’olu Jehova (12-15)

1  N’afọ nke abụọ n’ọchịchị Eze Darayọs, n’ọnwa nke isii, n’abalị mbụ n’ọnwa ahụ, Jehova si n’ọnụ Hagaị*+ onye amụma gwa gọvanọ Juda bụ́ Zerubabel+ nwa Shieltiel na nnukwu onye nchụàjà bụ́ Joshụa nwa Jehozadak, sị:  “Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, ‘Ndị a na-asị: “Oge a ga-arụ* ụlọ* Jehova erubeghị.”’”+  Jehova wee si n’ọnụ Hagaị+ onye amụma kwuo ọzọ, sị:  “Ugbu a ọ̀ bụ oge unu ga-ebi n’ụlọ unu e ji osisi mara mma rụọ, ma ụlọ a abụrụ ụlọ dakpọsịrị adakpọsị?+  Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, ‘Chebaranụ ihe unu na-eme echiche.  Unu akụọla mkpụrụ buru ibu, ma ihe unu na-eweta n’ubi dị obere.+ Unu na-eri ihe, ma unu anaghị eriju afọ. Unu na-aṅụ mmanya, ma unu anaghị aṅụju afọ. Unu na-eyi uwe, ma e nweghị onye n’ime unu ahụ́ na-ekporo ọkụ. Onye e goro ọrụ na-arụta ego na-etinye n’akpa puru epu.’”  “Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, ‘Chebaranụ ihe unu na-eme echiche.’  “‘Gaanụ n’ugwu bute osisi.+ Rụọkwanụ ụlọ a+ ka o mee m obi ụtọ, ka e wee nye m otuto.’+ Ọ bụ ihe Jehova kwuru.”  “Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, ‘Unu na-atụ anya inweta ọtụtụ ihe n’ubi, ma ihe unu na-enweta na-adị obere. Mgbe unu webatara ya n’ụlọ, m fụrụ ya ọnụ, fụsasịa ya.+ Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ụlọ m dakpọsịrị adakpọsị, ma onye ọ bụla n’ime unu na-agbakeri ala na-elekọta ụlọ nke ya.+ 10  N’ihi ya, eluigwe mere ka igirigi ya ghara ịdara unu, ala amịghịkwa mkpụrụ ya. 11  M nọkwa na-eme ka ala na ugwu kpọọ nkụ, nke mere ka ọka,* mmanya ọhụrụ, mmanụ, na ihe ala na-epupụta kọọ ụkọ. Unu na anụ ụlọ na-ata ahụhụ, unu na-arụgbukwa onwe unu n’ọrụ n’efu.’” 12  Zerubabel+ nwa Shieltiel+ na nnukwu onye nchụàjà bụ́ Joshụa nwa Jehozadak,+ na ndị Izrel ndị ọzọ, gere ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke ha, geekwa ntị n’ihe Hagaị onye amụma na-ekwu, n’ihi na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke ha zitere ya. Ha wee malite ịtụ egwu Jehova. 13  Hagaị onye ozi Jehova wee gwa ha okwu Jehova dunyere ya ka ọ gwa ha, sị: “Jehova kwuru, sị, ‘M nọnyeere unu.’”+ 14  Jehova wee metụ gọvanọ Juda+ bụ́ Zerubabel nwa Shieltiel aka n’obi,*+ ya na nnukwu onye nchụàjà bụ́ Joshụa+ nwa Jehozadak nakwa ndị Izrel ndị ọzọ. Ha wee bịa ma bido ịrụ ọrụ n’ụlọ Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke ha.+ 15  Ha bidoro ya n’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa nke isii n’afọ nke abụọ n’ọchịchị Eze Darayọs.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Hagaị pụtara “Onye A Mụrụ n’Oge Ememme.”
Ma ọ bụ “ga-arụghachi.”
Ma ọ bụ “ụlọ nsọ.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Na Hibru, “kpalie mmụọ gọvanọ Juda bụ́ Zerubabel nwa Shieltiel.”