Ozi Ọma Jọn Dere 12:1-50
12 Mgbe ọ fọrọ ụbọchị isii ka e mee Ememme Ngabiga, Jizọs rutere Betani, bụ́ ebe Lazarọs+ ahụ ọ kpọlitere n’ọnwụ bi.
2 E wee meere ya oriri anyasị n’ebe ahụ. Mata nọ na-eje ozi.+ Ma Lazarọs so ná ndị ya na ha nọ na-eri ihe.
3 Meri wee were mmanụ na-esi ísì ọma dị otu paụnd* n’arọ tee Jizọs n’ụkwụ ma jiri ntutu isi ya hichaa ya ụkwụ. Mmanụ ahụ bụ ezigbo mmanụ nad,* ọ dịkwa oké ọnụ. Ísì mmanụ ahụ wee ju n’ụlọ ahụ.+
4 Ma Judas Iskarịọt,+ otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya, onye na-aga ịrara ya nye, sịrị:
5 “Gịnị mere na e reghị mmanụ a na-esi ísì ọma narị mkpụrụ ego dinarịọs* atọ (300) ma nye ya ndị ogbenye?”
6 Ma, ihe mere o ji kwuo ihe a abụghị na ihe banyere ndị ogbenye na-emetụ ya n’obi, kama ọ bụ maka na ọ bụ onye ohi. Ọ bụ ya na-eji igbe ego, ọ na-ewerekwa ego e tinyere na ya.
7 Jizọs sịrị: “Hapụnụ ya, ka o mee ihe a iji kwadebe ahụ́ m maka ụbọchị a ga-eli m.+
8 N’ihi na unu na ndị ogbenye nọ mgbe niile,+ ma mụ na unu agaghị anọ mgbe niile.”+
9 Ma, ọtụtụ ndị Juu matara na Jizọs nọ n’ebe ahụ. Ha wee bịa ọ bụghị naanị ka ha hụ ya, kama ka ha hụkwa Lazarọs, onye ọ kpọlitere n’ọnwụ.+
10 Ndị isi nchụàjà wee gbaa izu igbukwa Lazarọs,
11 n’ihi na ọ bụ maka ya ka ọtụtụ ndị Juu ji na-aga n’ebe ahụ ma na-enwe okwukwe na Jizọs.+
12 N’echi ya, ìgwè mmadụ ndị bịara ememme ahụ nụrụ na Jizọs na-abịa Jeruselem.
13 Ha wee chịrị igu nkwụ gawa izute ya. Ha malitekwara iti mkpu, sị: “Biko, zọpụta ya! Onye ahụ nke na-abịa n’aha Jehova*+ bụ onye a gọziri agọzi. Ọ bụ Eze Izrel!”+
14 Mgbe Jizọs hụrụ otu nwa jakị, ọ nọkwasịrị na ya,+ otú ahụ e dere, sị:
15 “Atụla egwu, Zayọn.* Lee, Eze gị na-abịa. Ọ nọkwasịrị na nwa jakị.”+
16 Ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ihe ndị a na mbụ. Ma mgbe e mere ka Jizọs dị ebube,+ ha chetara na e dere ihe ndị a banyere ya, chetakwa na ha meere ya ihe ndị a.+
17 Ìgwè mmadụ ndị hụrụ mgbe Jizọs si n’ili*+ kpọlite Lazarọs n’ọnwụ nọ na-akọrọ ndị ọzọ ihe merenụ.+
18 Ọ bụkwa ya mere ìgwè mmadụ ji gakwuru ya n’ihi ọrụ ebube a ha nụrụ na ọ rụrụ.*
19 Ndị Farisii wee gwa ibe ha, sị: “Unu ahụla na e nweghị ebe unu ji azụ aga. Lee, ụwa niile esorola ya.”+
20 E nwere ụfọdụ ndị Grik so ná ndị bịara ife Chineke n’ememme ahụ.
21 Ha bịakwutere Filip+ onye Betsaịda, nke dị na Galili, malite ịrịọ ya, sị: “Nna anyị ukwu, anyị chọrọ ịhụ Jizọs.”
22 Filip bịara kọọrọ Andru, Andru na Filip abịa kọọrọ Jizọs.
23 Ma Jizọs sịrị ha: “Oge eruola ka e mee ka Nwa nke mmadụ dị ebube.+
24 N’eziokwu, ana m asị unu na ọ bụrụ na otu mkpụrụ ọka wit adaghị n’ala ree,* ọ ka bụ otu mkpụrụ ọka. Ma ọ bụrụ na o ree,*+ ọ na-amị ọtụtụ mkpụrụ.
25 Onye ọ bụla hụrụ ndụ* ya n’anya na-ebibi ya. Ma onye ọ bụla kpọrọ ndụ* ya asị+ n’ụwa a ga-echebe ya ka o wee nweta ndụ ebighị ebi.+
26 Ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-ejere m ozi, ya sowe m. Ebe m nọ ka onye ozi m ga-anọkwa.+ Ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-ejere m ozi, Nna m ga-eme ka o nwee ùgwù.
27 E nwere ihe na-echegbu m* ugbu a.+ Gịnịkwa ka m ga-ekwu? Nna, zọpụta m n’awa a.+ Ma, ọ bụ n’ihi awa a mere m ji bịa.
28 Nna, mee ka aha gị dị ebube.” Otu olu+ wee si n’eluigwe kwuo, sị: “Emeela m ka ọ dị ebube, m ga-emekwa ka ọ dị ebube ọzọ.”+
29 Ìgwè mmadụ ndị guzo n’ebe ahụ nụrụ ya wee malite ikwu na ọ bụ égbè eluigwe gbara. Ndị ọzọ sịrị: “Mmụọ ozi agwala ya okwu.”
30 Jizọs sịrị: “Olu a kwuru okwu abụghị n’ihi m, kama ọ bụ n’ihi unu.
31 A na-ekpe ụwa a ikpe ugbu a. Ugbu a, a ga-achụpụ+ onye na-achị ụwa a.+
32 Ma ọ bụrụ na e si n’ụwa wegoo m n’elu,*+ m ga-adọta ụdị mmadụ niile n’ebe m nọ.”
33 N’eziokwu, ọ nọ na-ekwu ihe a iji gosi ụdị ọnwụ ọ ga-anwụ n’oge na-adịghị anya.+
34 Ìgwè mmadụ ahụ wee sị ya: “Iwu* kwuru na Kraịst ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.+ Oleekwanụ otú i si na-asị na a ga-ewego Nwa nke mmadụ n’elu?*+ Ònye ka Nwa nke mmadụ a bụ?”
35 Jizọs wee sị ha: “Ìhè ahụ ga-anọtụkwu n’etiti unu. Na-ejegharịnụ n’ìhè ahụ mgbe unu ka nwere ya, ka ọchịchịrị ghara ikpuchi unu. Onye na-ejegharị n’ọchịchịrị anaghị ama ebe ọ na-aga.+
36 Nweenụ okwukwe n’ìhè ahụ mgbe unu ka nwere ya, ka unu wee bụrụ ụmụ nke ìhè.”+
Jizọs kwuru ihe ndị a, gazie zoo ka ha ghara ịhụ ya.
37 N’agbanyeghị na ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube* n’ihu ha, ha enweghị okwukwe na ya,
38 ka e wee mezuo ihe Aịzaya onye amụma kwuru, sị: “Jehova,* ònye nwere okwukwe n’ihe a nụrụ n’ọnụ anyị?*+ Ònyekwa ka Jehova* mere ka ọ mara ike* ya?”+
39 Ihe mere na ha enweghị ike ikwere bụ na Aịzaya kwukwara, sị:
40 “O meela ka anya ha kpuo ìsì, meekwa ka obi ha kpọọ nkụ, ka ha ghara iji anya ha hụ ụzọ, gharakwa iji obi ha ghọta ihe ma gbanwee,* mụ agwọọ ha.”+
41 Aịzaya kwuru ihe ndị a n’ihi na ọ hụrụ ebube Kraịst wee kwuo banyere ya.+
42 Ma, ọtụtụ n’ime ndị isi ndị Juu nwedịrị okwukwe na ya.+ Ma ha anaghị ekwupụta ya n’ihi ndị Farisii, ka a ghara ịchụpụ ha n’ụlọ nzukọ ha,+
43 n’ihi na ha chọrọ otuto si n’aka mmadụ karịadị otuto si n’aka Chineke.+
44 Ma, Jizọs kwuru n’olu dara ụda, sị: “Onye ọ bụla nwere okwukwe na m nwere okwukwe, ọ bụghị naanị na m, kamakwa n’onye zitere m.+
45 Onye ọ bụla na-ahụ m na-ahụkwa Onye zitere m.+
46 Abịara m n’ụwa dị ka ìhè,+ ka onye ọ bụla nke nwere okwukwe na m ghara ịnọgide n’ọchịchịrị.+
47 Ma, ọ bụrụ na onye ọ bụla anụ okwu m, ma ọ naghị eme ya eme, anaghị m ekpe ya ikpe, n’ihi na abịara m ịzọpụta ụwa, ọ bụghị ikpe ụwa ikpe.+
48 Onye ọ bụla na-eleda m anya ma ghara ịnabata ihe m na-ekwu nwere onye ga-ekpe ya ikpe. Ọ bụ okwu m kwuru ga-ekpe ya ikpe n’ụbọchị ikpeazụ.
49 N’ihi na e nweghị ihe m kwuru bụ́ uche m, kama Nna m, onye zitere m, gwara m* ihe m ga-ekwu na ihe m ga-akụzi.+
50 Amakwa m na iwu ya na-enye ndụ ebighị ebi.+ N’ihi ya, ihe ọ bụla m na-ekwu, m na-ekwu ya otú Nna m gwara m ya.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Na Grik, “ada bụ́ Zayọn.”
^ Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”
^ Na Grik, “ihe àmà a ha nụrụ na o mere.”
^ Na Grik, “nwụọ.”
^ Na Grik, “nwụọ.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
^ Ya bụ, kwụwa Jizọs n’osisi.
^ Ọ ga-abụ na Iwu a bụ Akwụkwọ Nsọ Hibru niile.
^ Ya bụ, kwụwa Jizọs n’osisi.
^ Na Grik, “o mere ọtụtụ ihe àmà.”
^ Na Grik, “aka.”
^ Ma ọ bụ “n’ihe anyị kwuru?”
^ Na Grik, “tụgharịa.”
^ Na Grik, “nyere m iwu.”