Ozi Ọma Jọn Dere 4:1-54

  • Jizọs na nwaanyị Sameria (1-38)

    • Fee Chineke “n’ime mmụọ na n’eziokwu” (23, 24)

  • Ọtụtụ ndị Sameria kweere na Jizọs (39-42)

  • Jizọs gwọrọ nwa otu nwoke na-ejere eze ozi (43-54)

4  Mgbe Onyenwe anyị matara na ndị Farisii anụla na ọ* na-enweta ndị na-eso ụzọ ma na-eme ha baptizim+ karịa Jọn,  (ọ bụ eziokwu na Jizọs ejighị aka ya mee onye ọ bụla baptizim, kama ọ bụ ndị na-eso ụzọ ya mere ha baptizim)  ọ hapụrụ Judia gawa Galili ọzọ.  Ma, ọ bụ Sameria ka ọ ga-esi gafere.  O wee rute n’otu obodo Sameria a na-akpọ Saịka, nke dị nso n’ala Jekọb nyere Josef nwa ya.+  N’eziokwu, olulu mmiri Jekọb dị n’ebe ahụ.+ Ma ebe ọ bụ na ike gwụrụ Jizọs n’ihi ije ọ gara, ọ nọdụrụ ala n’akụkụ olulu mmiri ahụ. Ọ bụ n’ihe dị ka awa nke isii.*  Otu nwaanyị Sameria bịara isere mmiri. Jizọs wee sị ya: “Nye m mmiri ka m ṅụọ.”  (N’ihi na ndị na-eso ụzọ ya gawara n’obodo ịzụta nri.)  Nwaanyị Sameria ahụ sịrị ya: “Gịnị mere i ji na-arịọ m ka m nye gị mmiri ka ị ṅụọ ebe ị bụ onye Juu, mụnwa abụrụ nwaanyị Sameria?” (N’ihi na ndị Juu na ndị Sameria anaghị emekọ ihe.)+ 10  Jizọs zara ya, sị: “A sị na ị ma onyinye Chineke na-enye n’efu+ na onye na-asị gị, ‘Nye m mmiri ka m ṅụọ,’ ị gaara arịọ ya mmiri, ọ gakwaara enye gị mmiri na-enye ndụ.”+ 11  O wee sị ya: “Nna anyị ukwu, i nwedịghị ihe e ji esere mmiri, olulu mmiri a mikwara emi. Oleezi ebe i si enweta mmiri a na-enye ndụ? 12  Ị kaghị nna nna anyị Jekọb, onye nyere anyị olulu mmiri a, onye ya na ụmụ ya na anụ ụlọ ya ṅụkwara mmiri si na ya, ka ị̀ ka ya?” 13  Jizọs zara ya, sị: “Onye ọ bụla ṅụrụ mmiri a, mmiri ga-agụ ya ọzọ. 14  Onye ọ bụla ṅụrụ mmiri m ga-enye ya, mmiri agakwaghị agụ ya ọzọ,+ kama mmiri m ga-enye ya ga-aghọ n’ime ya isi iyi nke na-asọpụta mmiri na-enye ndụ ebighị ebi.”+ 15  Nwaanyị ahụ wee sị ya: “Nna anyị ukwu, nye m mmiri a, ka mmiri ghara ịgụ m ọzọ, ka m gharakwa ịna-abịa ebe a esere mmiri.” 16  Ọ sịrị nwaanyị ahụ: “Gaa kpọọ di gị, gị na ya soro bịa ebe a.” 17  Nwaanyị ahụ sịrị ya: “Enweghị m di.” Jizọs wee sị ya: “I kwuru eziokwu na i nweghị di. 18  N’ihi na ị lụọla di ise. Nwoke gị na ya bi ugbu a abụghị di gị. Ihe i kwuru bụ eziokwu.” 19  Nwaanyị ahụ sịrị ya: “Nna anyị ukwu, ọ ga-abụrịrị na ị bụ onye amụma.+ 20  Nna nna anyị hà fere Chineke n’ugwu a. Ma, unu na-ekwu na ọ bụ na Jeruselem ka ndị mmadụ ga-anọrịrị fee Chineke.”+ 21  Jizọs wee sị ya: “Nwaanyị, kwere ihe m na-ekwu. Oge na-abịa mgbe unu na-agaghị anọ n’ugwu a ma ọ bụ na Jeruselem fee Nna m ofufe. 22  Unu na-efe ihe unu na-amaghị.+ Anyị na-efe ihe anyị ma n’ihi na nzọpụta bidoro n’ebe ndị Juu nọ.+ 23  Ma oge na-abịa, ọ bụkwa ugbu a, mgbe ndị na-efe Nna m otú ọ chọrọ ga-efe ya n’ime mmụọ na n’eziokwu, n’ihi na n’eziokwu, Nna m na-achọ ụdị ndị ahụ ka ha fee ya ofufe.+ 24  Chineke bụ Mmụọ.+ Ndị na-efe ya ofufe ga-efe ya n’ime mmụọ na n’eziokwu.”+ 25  Nwaanyị ahụ wee sị ya: “Ama m na Mezaya, onye a na-akpọ Kraịst, na-abịa. Mgbe ọ bụla ọ bịara, ọ ga-akọwara anyị ihe niile.” 26  Jizọs sịrị ya: “Ọ bụ mụnwa na-agwa gị okwu bụ ya.”+ 27  N’oge ahụ, ndị na-eso ụzọ ya lọghachiri. O wee ju ha anya na ya na nwaanyị na-ekwurịta okwu. Ma e nweghị onye jụrụ ya: “Olee ihe ị chọrọ?” ma ọ bụ “Gịnị mere gị na nwaanyị a ji ekwurịta okwu?” 28  Nwaanyị ahụ hapụrụ ite mmiri ya banye n’obodo ma gwa ndị mmadụ, sị: 29  “Bịanụ hụ nwoke gwara m ihe niile m mere. Ọ̀ ga-abụ ya bụ Kraịst?” 30  Ha wee si n’obodo pụta, bịakwutewe Jizọs. 31  Ka ihe a na-eme, ndị na-eso ụzọ ya nọ na-arịọ ya, sị: “Onye Ozizi,*+ rienụ ihe.” 32  Ma ọ sịrị ha: “M nwere nri m ga-eri nke unu na-amaghị.” 33  Ndị na-eso ụzọ ya wee sị ibe ha: “Ò nwere onye wetaara ya ihe ọ bụla ka o rie?” 34  Jizọs sịrị ha: “Ihe oriri m bụ ka m mee uche onye zitere m,+ ka m rụchaakwa ọrụ ya.+ 35  Ọ̀ bụ na unu asịghị na a ka nwere ọnwa anọ tupu oge iwe ihe ubi eruo? Ana m asị unu: Welienụ anya unu lee ubi, na ihe a kụrụ na ha achaala maka owuwe ihe ubi.+ 36  Onye na-ewe ihe ubi enwetawala ụgwọ ọrụ ma na-ekpokọta mkpụrụ maka ndụ ebighị ebi, ka onye na-agha mkpụrụ na onye na-ewe ihe ubi wee ṅụrịkọọ ọṅụ.+ 37  N’ihe a, okwu ahụ a na-ekwu bụ eziokwu, ya bụ, Otu onye na-agha mkpụrụ, onye ọzọ na-ewe ihe ubi. 38  Ezipụrụ m unu ka unu wee ihe ubi unu na-arụghị ọrụ ya. Ndị ọzọ arụọla ọrụ, ma unu abatala riwe uru ọrụ ha rụrụ.” 39  Ọtụtụ n’ime ndị Sameria ndị si n’obodo ahụ pụta nwere okwukwe na Jizọs n’ihi àmà nwaanyị ahụ gbara, sị: “Ọ gwara m ihe niile m mere.”+ 40  Mgbe ndị Sameria ahụ bịakwutere Jizọs, ha rịọrọ ya ka ọ nọrọ n’obodo ha. O wee nọọ ebe ahụ ụbọchị abụọ. 41  N’ihi ya, ọtụtụ ndị ọzọ kweere n’ihi ihe ọ kụziiri ha. 42  Ha wee gwa nwaanyị ahụ, sị: “Ọ bụghịzi naanị ihe i kwuru mere anyị ji kwere, n’ihi na anyị ejirila ntị anyị nụ, anyị amarakwala na nwoke a bụ onye nzọpụta nke ụwa n’eziokwu.”+ 43  Mgbe ụbọchị abụọ ahụ gachara, ọ hapụrụ ebe ahụ gawa Galili. 44  Ma, Jizọs kwuru na a naghị asọpụrụ onye amụma n’obodo ya.+ 45  Mgbe ọ bịarutere na Galili, ndị Galili nabatara ya n’ihi na ha hụrụ ihe niile o mere na Jeruselem n’oge ememme+ maka na ha gakwara ememme ahụ.+ 46  O wee bịaghachi na Kena nke dị na Galili, bụ́ ebe o mere ka mmiri ghọọ mmanya.+ Na Kapaniọm, e nwere otu onye na-ejere eze ozi nke nwa ya nwoke na-arịa ọrịa. 47  Mgbe nwoke a nụrụ na Jizọs ahapụla Judia bata na Galili, ọ gakwuuru ya wee rịọ ya ka ọ bịa gwọọ nwa ya nwoke maka na ọ nọ n’ọnụ ọnwụ. 48  Ma Jizọs sịrị ya: “Ọ bụrụ na unu ahụghị ọrụ ebube* na ihe ịtụnanya, unu emekataghị kweta.”+ 49  Onye ahụ na-ejere eze ozi sịrị ya: “Onyenwe anyị, bịa tupu obere nwa m anwụọ.” 50  Jizọs sịrị ya: “Lawa, nwa gị agbakeela.”+ Nwoke ahụ kwetara ihe Jizọs gwara ya wee lawa. 51  Ma ka ọ nọ n’ụzọ na-ala, ndị ohu ya zutere ya ka ha gwa ya na nwa ya nwoke agbakeela. 52  O wee jụọ ha awa ahụ́ dịrị ya mma. Ha sịrị ya: “Ahụ́ ọkụ ahụ kwụsịrị ụnyaahụ, n’awa nke asaa.”* 53  Nna nwa ahụ mataziri na ọ gbakere n’awa ahụ Jizọs sịrị ya: “Nwa gị agbakeela.”+ Ya na ezinụlọ ya niile wee kwere. 54  Ihe a bụ ọrụ ebube nke abụọ+ Jizọs rụrụ mgbe o si Judia bata na Galili.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “Jizọs.”
Ya bụ, ihe dị ka n’elekere iri na abụọ nke ehihie.
Ma ọ bụ “Rabaị.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Grik, “ihe àmà.”
Ya bụ, ihe dị ka n’elekere mbụ nke ehihie.