Ozi Ọma Jọn Dere 5:1-47

  • Jizọs gwọrọ otu nwoke na Betzeta (1-18)

  • Ikike Jizọs nwere si n’aka Nna ya (19-24)

  • Ndị nwụrụ anwụ ga-anụ olu Jizọs (25-30)

  • Àmà ndị a gbara banyere Jizọs (31-47)

5  Mgbe e mechara, oge ememme+ ndị Juu ruru, Jizọs wee gbagoo Jeruselem.  Na Jeruselem, n’Ọnụ Ụzọ Ámá Atụrụ,+ e nwere ọdọ mmiri a na-akpọ Betzeta n’asụsụ Hibru. Ọdọ mmiri a nwere ogidi ise na varanda ya.  Ọtụtụ ndị ọrịa dina n’ebe ahụ, ma ndị ìsì, ma ndị ngwọrọ, ma ndị aka ha ma ọ bụ ụkwụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ. 4 * ——  Ma otu nwoke nọ n’ebe ahụ. Ọ rịala ọrịa afọ iri atọ na asatọ.  Jizọs hụrụ nwoke a ka o dina n’ebe ahụ, marakwa na ọ rịala ọrịa ogologo oge. O wee sị ya: “Ị̀ chọrọ ka ahụ́ dị gị mma?”+  Nwoke ahụ na-arịa ọrịa zara ya, sị: “Nna anyị ukwu, enweghị m onye ga-ekuba m n’ọdọ mmiri a ma o mee ụṅara. Kama ọ na-abụ m gawa, onye ọzọ eburu m ụzọ banye.”  Jizọs sịrị ya: “Bilie. Buru ute* gị gawa ije.”+  Ahụ́ wee dị nwoke ahụ mma ozugbo, ya eburu ute* ya malite ịga ije. Ụbọchị ahụ bụ Ụbọchị Izu Ike. 10  Ndị Juu malitere ịgwa nwoke ahụ a gwọrọ ọrịa, sị: “Taa bụ Ụbọchị Izu Ike, i kwesịghị iburu ute.”*+ 11  Ma ọ gwara ha, sị: “Ọ bụ onye mere ka ahụ́ dị m mma sịrị m, ‘Buru ute* gị gawa ije.’” 12  Ha jụrụ ya, sị: “Ọ̀ bụ onye sịrị gị, ‘Buru ya gawa ije’?” 13  Ma nwoke ahụ a gwọrọ ọrịa amaghị onye ọ bụ n’ihi na Jizọs esila n’ebe ahụ pụọ banye n’ebe ìgwè mmadụ ndị nọ n’ebe ahụ nọ. 14  Mgbe e mechara, Jizọs hụrụ nwoke ahụ n’ụlọ nsọ wee sị ya: “Lee, ahụ́ adịla gị mma. Emehiekwala ọzọ, ka ihe ka njọ ghara ime gị.” 15  Nwoke ahụ gara kọọrọ ndị Juu na ọ bụ Jizọs mere ka ahụ́ dị ya mma. 16  N’ihi ya, ndị Juu megidewere Jizọs maka na ọ na-eme ihe ndị a n’Ụbọchị Izu Ike. 17  Ma ọ gwara ha, sị: “Nna m ka na-arụ ọrụ ruo ugbu a, mụnwa ka na-arụkwa ọrụ.”+ 18  Ọ bụ ya mere ndị Juu ji chọsiwe ike igbu ya, ọ bụghị naanị maka na ọ na-ada iwu Ụbọchị Izu Ike, kama ọ na-akpọkwa Chineke Nna ya,+ na-eme ka ya na Chineke hara.+ 19  N’ihi ya, Jizọs gwara ha, sị: “N’eziokwu, ana m asị unu na Ọkpara ahụ enweghị ike ime otu mkpụrụ ihe bụ́ uche ya, kama ọ bụ naanị ihe ọ hụrụ Nna ya na-eme ka ọ na-eme.+ N’ihi na ihe ọ bụla Nna ahụ na-eme, ọ bụ ya ka Ọkpara ya na-emekwa. 20  N’ihi na Nna m hụrụ Ọkpara ya n’anya,+ na-egosikwa ya ihe niile ọ na-eme. Ọ ga-egosikwa ya ọrụ ndị karịrị ọrụ ndị a, ka o wee ju unu anya.+ 21  N’ihi na otú ahụ Nna m na-akpọlite ndị nwụrụ anwụ ma na-eme ka ha dị ndụ,+ ka Ọkpara ya na-emekwa ka ndị ọ bụla ọ chọrọ dị ndụ.+ 22  N’ihi na Nna m anaghị ekpe onye ọ bụla ikpe, kama o nyefeela ikpe niile n’aka Ọkpara ya,+ 23  ka mmadụ niile wee na-asọpụrụ Ọkpara ya otú ha si asọpụrụ Nna ya. Onye ọ bụla na-anaghị asọpụrụ Ọkpara ahụ anaghị asọpụrụ Nna ya nke zitere ya.+ 24  N’eziokwu, ana m asị unu na onye ọ bụla na-anụ okwu m ma kwere n’Onye ahụ zitere m ga-enweta ndụ ebighị ebi,+ a gaghịkwa ekpe ya ikpe, kama o sila n’ọnwụ fere ná ndụ.+ 25  “N’eziokwu, ana m asị unu na oge na-abịa, ọ bụkwa ugbu a, mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-anụ olu Ọkpara Chineke, ndị ṅara ntị ga-adịkwa ndụ. 26  N’ihi na otú ahụ Nna m nwere ndụ n’ime onwe ya,*+ ka o mekwara ka Ọkpara ya nwee ndụ n’ime onwe ya.+ 27  O nyekwala ya ikike ikpe ikpe+ n’ihi na ọ bụ Nwa nke mmadụ.+ 28  Ka ihe a ghara iju unu anya, n’ihi na oge na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya+ 29  wee pụta. Ndị na-eme ezi ihe ga-enweta ndụ ebighị ebi,* ma a ga-ekpe ndị na-eme ihe ọjọọ ikpe.*+ 30  Enweghị m ike ime otu mkpụrụ ihe bụ́ uche m. Ọ bụ otú Nna m gwara m* ka m si ekpe ikpe. M na-ekpekwa ikpe ziri ezi+ n’ihi na ihe m na-achọ ime abụghị uche m, kama ọ bụ uche onye zitere m.+ 31  “Ọ bụrụ na naanị m agbaa àmà banyere onwe m, àmà m abụghị eziokwu.+ 32  E nwere onye ọzọ na-agba àmà banyere m, amakwa m na àmà ọ na-agba banyere m bụ eziokwu.+ 33  Unu zipụrụ ndị mmadụ ka ha gakwuru Jọn, ọ gbakwaara eziokwu àmà.+ 34  Ma, anaghị m anabata àmà si n’aka mmadụ, kama m na-ekwu ihe ndị a ka e wee zọpụta unu. 35  Onye ahụ bụ ọkụ* na-enwu enwu, nke na-enyekwa ìhè. Ọ masịkwara unu ịṅụrị ezigbo ọṅụ n’ihi ìhè ya, ma mmasị ahụ unu nwere adịteghị aka.+ 36  Ma, e nwere ihe na-agbara m àmà nke ka àmà Jọn gbara, n’ihi na ọ bụ ọrụ ndị Nna m kenyere m, ndị m na-arụ, na-agba àmà na ọ bụ Nna m zitere m.+ 37  Nna m bụ́ onye zitere m agbaakwala àmà banyere m.+ Unu anụbeghị olu ya mgbe ọ bụla ma ọ bụkwanụ hụ otú ọ dị.+ 38  Okwu ya adịghịkwa n’ime unu n’ihi na unu ekweghị n’onye ahụ o zitere. 39  “Unu na-enyocha Akwụkwọ Nsọ+ n’ihi na unu chere na ọ ga-eme ka unu nwee ndụ ebighị ebi. Ọ bụkwa ya* na-agba àmà banyere m.+ 40  Ma unu achọghị ịbịakwute m+ ka unu nwee ndụ. 41  Anaghị m anara otuto n’aka mmadụ, 42  kama ama m nke ọma na unu ahụghị Chineke n’anya. 43  Abịala m n’aha Nna m, ma unu anabataghị m. Ọ bụrụ na onye ọzọ abịa n’aha onwe ya, unu ga-anabata ya. 44  Olee otú unu ga-esi kwere ebe ọ bụ na unu na-anara otuto n’aka ibe unu, ma unu anaghị achọ otuto si n’aka onye ahụ naanị ya bụ Chineke?+ 45  Unu echela na m ga-ama unu ikpe* n’ihu Nna m. E nwere onye na-ama unu ikpe.* Ọ bụ Mosis,+ onye unu nwere olileanya n’ebe ọ nọ. 46  N’eziokwu, ọ bụrụ na unu kweere na Mosis, unu gaara ekwere na m n’ihi na o dere banyere m.+ 47  Ma, ọ bụrụ na unu ekwetaghị ihe o dere, olee otú unu ga-esi kwere ihe m na-ekwu?”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Gụọ A3.
Ma ọ bụ “àkwà.”
Ma ọ bụ “àkwà.”
Ma ọ bụ “àkwà.”
Ma ọ bụ “àkwà.”
Ma ọ bụ “nwere ikike inye ndụ,” “nwere onyinye nke ndụ n’ime onwe ya.”
Na Grik, “mbilite n’ọnwụ nke ndụ.”
Na Grik, “ndị na-eme ihe ọjọọ ga-enweta mbilite n’ọnwụ nke ikpe.”
Na Grik, “otú m si nụ.”
Ma ọ bụ “mpanaka; oriọna.”
Ya bụ, Akwụkwọ Nsọ.
Na Grik, “ga-ebo unu ebubo.”
Na Grik, “na-ebo unu ebubo.”