Ozi Ọma Jọn Dere 8:12-59
8 12 Jizọs gwara ha okwu ọzọ, sị: “Abụ m ìhè nke ụwa.+ Onye ọ bụla na-eso m emekataghị jee ije n’ọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ìhè+ nke ndụ.”
13 N’ihi ya, ndị Farisii sịrị ya: “Ị na-agba àmà banyere onwe gị. Àmà gị abụghị eziokwu.”
14 Jizọs wee sị ha: “Ọ bụrụgodị na m na-agba àmà banyere onwe m, àmà m bụ eziokwu, n’ihi na ama m ebe m si bịa na ebe m na-aga.+ Ma unu amaghị ebe m si bịa na ebe m na-aga.
15 Unu na-ekpe ikpe otú mmadụ si ekpe.+ E nweghị onye ọ bụla m na-ekpe ikpe.
16 Ma ọ bụrụgodị na mụ ekpee ikpe, ikpe m bụ ikpe ziri ezi n’ihi na anọghị m naanị m, kama Nna m nke zitere m nọnyeere m.+
17 E dekwara n’Iwu unu,* sị: ‘Àmà mmadụ abụọ gbara bụ eziokwu.’+
18 Ọ bụ m na-agba àmà banyere onwe m. Nna m nke zitere m na-agbakwa àmà banyere m.”+
19 Ha wee jụọ ya, sị: “Olee ebe Nna gị nọ?” Jizọs zara, sị: “Unu amaghị m, unu amaghịkwa Nna m.+ Ọ bụrụ na unu ma m, unu gaara amakwa Nna m.”+
20 O kwuru ihe ndị a mgbe ọ na-ezi ihe n’ebe a na-edebe ego n’ụlọ nsọ.+ Ma e nweghị onye ọ bụla jidere ya maka na oge ya erubeghị.+
21 O wee gwa ha ọzọ, sị: “Ana m ala, unu ga-achọkwa m, ma unu ga-anwụ ná mmehie unu.+ Unu agaghị abịali n’ebe m na-aga.”+
22 Ndị Juu malitere ịsị: “Ọ̀ na-aga igbu onwe ya? N’ihi na ọ na-asị, ‘Unu agaghị abịali n’ebe m na-aga.’”
23 O wee sị ha: “Unu si n’ala, ma esi m n’elu.+ Unu si n’ụwa a, ma esighị m n’ụwa a.
24 Ọ bụ ya mere m ji gwa unu, sị: Unu ga-anwụ ná mmehie unu. N’ihi na ọ bụrụ na unu ekweghị na ọ bụ m bụ onye ahụ, unu ga-anwụ ná mmehie unu.”
25 N’ihi ya, ha jụwara ya, sị: “Ònye ka ị bụ?” Jizọs sịrị ha: “Gịnịdị mere m ji atụpụrụ unu ọnụ?
26 Enwere m ọtụtụ ihe m ga-ekwu banyere unu nakwa ikpe ndị m ga-ekpebi. N’eziokwu, Onye zitere m na-ekwu eziokwu. Ọ bụkwa ihe ndị m nụrụ n’ọnụ ya ka m na-ekwu n’ụwa.”+
27 Ha aghọtaghị na ọ na-agwa ha banyere Nna ya.
28 Jizọs wee sị: “Ọ bụ mgbe unu wegoro Nwa nke mmadụ n’elu*+ ka unu ga-amata na ọ bụ m bụ ya,+ nakwa na e nweghị ihe ọ bụla m na-eme bụ́ uche m.+ Kama m na-ekwu ihe ndị a otú Nna m kụziiri m.
29 Onye zitere m nọnyeere m. Ọ hapụghị m ka m nọrọ naanị m n’ihi na m na-eme ihe dị ya mma mgbe niile.”+
30 Ka ọ nọ na-ekwu ihe ndị a, ọtụtụ ndị nwere okwukwe na ya.
31 Jizọs wee gwa ndị Juu kweere na ya, sị: “Ọ bụrụ na unu ana-eme ihe m kwuru mgbe niile, unu bụ ndị na-eso ụzọ m n’eziokwu.
32 Unu ga-amara eziokwu,+ eziokwu ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”+
33 Ha gwara ya, sị: “Anyị bụ ụmụ Ebreham. Anyị abụtụbeghị ohu onye ọ bụla. Gịnị mere i ji asị, ‘Unu ga-enwere onwe unu’?”
34 Jizọs zara ha, sị: “N’eziokwu, ana m asị unu na onye ọ bụla na-eme mmehie na-agbara mmehie ohu.+
35 Ohu anaghị anọ n’ụlọ nna ya ukwu ruo mgbe ebighị ebi. Ma, nwa na-anọ ruo mgbe ebighị ebi.
36 N’ihi ya, ọ bụrụ na Ọkpara ahụ emee ka unu nwere onwe unu, unu ga-enwere onwe unu n’eziokwu.
37 Ama m na unu bụ ụmụ Ebreham. Ma unu na-achọ igbu m maka na unu anaghị anabata okwu m.
38 Ihe m na-ekwu bụ ihe m hụrụ mgbe mụ na Nna m nọ.+ Ma, unu na-eme ihe nna unu gwara unu.”
39 Ha wee gwa ya, sị: “Nna anyị bụ Ebreham.” Jizọs sịrị ha: “Ọ bụrụ na unu bụ ụmụ Ebreham,+ unu ga na-arụ ọrụ Ebreham rụrụ.
40 Ma ugbu a, unu na-achọ igbu m, bụ́ onye gwara unu eziokwu m nụrụ n’ọnụ Chineke.+ Ebreham emeghị otú a.
41 Unu na-arụ ọrụ nna unu.” Ha sịrị ya: “Anyị abụghị ndị a kwatara n’iko.* Anyị nwere otu Nna, ya bụ, Chineke.”
42 Jizọs wee sị ha: “Ọ bụrụ na Chineke bụ Nna unu, unu ga-ahụ m n’anya+ n’ihi na esi m n’ebe Chineke nọ bịa, anọkwa m ebe a. Ọ bụghị m zitere onwe m, kama ọ bụ ya zitere m.+
43 Gịnị mere na unu aghọtaghị ihe m na-ekwu? Ọ bụ n’ihi na unu enweghị ike ịnabata okwu m.
44 Unu si ná nna unu bụ́ Ekwensu, unu na-achọkwa ime ihe nna unu chọrọ.+ Onye ahụ bụ ogbu mmadụ mgbe ọ malitere,*+ o guzosighịkwa ike n’eziokwu n’ihi na eziokwu adịghị n’ime ya. Mgbe ọ na-agha ụgha, ọ na-ekwu ihe bụ́ uche ya, n’ihi na ọ bụ onye ụgha, bụrụkwa nna ụgha.+
45 Ma, unu anaghị ekwere ihe m na-ekwu maka na m na-agwa unu eziokwu.
46 Ònye n’ime unu ga-amali m ikpe na m bụ onye mmehie? Ọ bụrụ na m na-ekwu eziokwu, gịnị mere na unu ekwetaghị ihe m na-ekwu?
47 Onye si na Chineke na-ege ntị n’okwu Chineke.+ Unu anaghị ege ntị n’ihi na unu esighị na Chineke.”+
48 Ndị Juu wee sị ya: “Ọ̀ kwa anyị kwuru ekwu na ị bụ onye Sameria+ nakwa na mmụọ ọjọọ ji gị?”+
49 Jizọs zara, sị: “Mmụọ ọjọọ ejighị m, kama m na-asọpụrụ Nna m, unu anaghịkwa asọpụrụ m.
50 Ma anaghị m achọrọ onwe m otuto.+ E nwere Onye na-achọ ka e too m, ọ bụkwa ya bụ onyeikpe.
51 N’eziokwu, ana m asị unu na ọ bụrụ na onye ọ bụla na-eme ihe m kwuru, o mekataghị nwụọ.”+
52 Ndị Juu wee sị ya: “Ugbu a ka anyị matara na mmụọ ọjọọ ji gị. Ebreham nwụrụ, ndị amụma nwụkwara. Ma ị na-asị, ‘Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-eme ihe m kwuru, o mekataghị nwụọ.’
53 Ị̀ ka nna anyị Ebreham onye nwụrụnụ? Ndị amụma nwụkwara. Ònye ka ị na-asị na ị bụ?”
54 Jizọs zara, sị: “Ọ bụrụ na m na-eto onwe m, otuto m enweghị ihe ọ bụ. Ọ bụ Nna m na-eto m,+ bụ́ onye unu na-asị na ọ bụ Chineke unu.
55 Unu amabeghị ya,+ ma ama m ya.+ Ọ bụrụ na mụ asị na amaghị m ya, m ga-abụ onye ụgha dị ka unu. Ma ama m ya, ana m emekwa ihe o kwuru.
56 Obi tọrọ nna unu Ebreham ezigbo ụtọ mgbe ọ nọ na-atụ anya ịhụ ụbọchị m, ọ hụkwara ya ma ṅụrịa ọṅụ.”+
57 Ndị Juu wee sị ya: “Ị̀ na-ekwu na ị hụrụ Ebreham ebe ị na-erubeghị afọ iri ise?”
58 Jizọs sịrị ha: “N’eziokwu, ana m asị unu na tupu a mụọ Ebreham, anọ m ndụ.”+
59 N’ihi ya, ha buuru nkume ka ha tụọ ya, ma Jizọs zoro wee si n’ụlọ nsọ ahụ pụọ.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ya bụ, Iwu Mosis.
^ Ya bụ, kwụwa Jizọs n’osisi.
^ Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Ya bụ, mgbe ọ ghara ụgha gbasara Chineke.