Joshụa 16:1-10
16 Ala ụmụ Josef+ ketara mgbe e fere nza+ bidoro n’Osimiri Jọdan, nke dị nso na Jeriko, ruo na mmiri dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Jeriko, ruokwa n’ala ịkpa nke si na Jeriko gbagoo n’ala Betel bụ́ ugwu ugwu.+
2 O sikwa na Betel ahụ dị na Lọz gara ruo n’Atarọt, n’ókè ndị Akaịt.
3 O sikwa ebe ahụ gara ruo n’ebe ọdịda anyanwụ ruo n’ókè ndị Jaflet, ruokwa n’ókè Bet-horọn Ndịda+ na Giza.+ Ọ kwụsịrị n’oké osimiri.
4 Ụmụ Josef,+ bụ́ Manase na Ifrem, wee nweta ala ha.+
5 Ala ụmụ Ifrem ketara, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, bụ ala dị n’ebe ọwụwa anyanwụ, malite n’Atarọt-ada,+ ruo Bet-horọn Mgbago,+
6 ruokwa n’oké osimiri. O sikwa na Mikmitat+ dị n’ebe ugwu gara ruo n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo Teanat-shaịlo, ruokwa Janoa.
7 O sikwa na Janoa ruo Atarọt, Neara, Jeriko,+ nakwa Osimiri Jọdan.
8 O sikwa na Tapua+ gara ruo n’ebe ọdịda anyanwụ, ruokwa na Ndagwurugwu Kena ma kwụsị n’oké osimiri.+ Ala a ka ebo Ifrem ketara, n’ezinụlọ n’ezinụlọ.
9 E nwekwara obodo ndị e si n’ebe Manase ketara,+ ha na ógbè ha niile, nye ụmụ Ifrem.
10 Ma, ụmụ Ifrem achụpụghị ndị Kenan bi na Giza.+ Ha na ndị Kenan wee biri ruo taa.+ Ụmụ Ifrem manyekwara ha ka ha na-arụrụ ha ọrụ.+